Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi
Ihe ịrịba ama: Ozi Alaeze Anyị ga-enwe usoro ihe omume Nzukọ Ije Ozi maka izu ọ bụla n’oge mgbakọ. Ọgbakọ di iche iche pụrụ ime mgbanwe dị ka o si dị mkpa iji nye ohere maka ịga Mgbakọ Distrikti “Soro Chineke Na-eje Ije.” N’ebe o kwesịrị ekwesị, jirinụ minit 15 ná Nzukọ Ije Ozi ikpeazụ unu ga-enwe tupu unu agawa mgbakọ tụleghachi ndụmọdụ ndị dị mkpa, ndị sitere n’ihe ntinye nke ọnwa a, bụ́ ndị metụtara ọgbakọ unu. N’ọnwa February, a ga-eme ndokwa iji otu Nzukọ Ije Ozi dum tụleghachi isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ. Iji kwadebe maka ntụle ahụ, anyị nile pụrụ idetu ihe ndị dị mkpa ná mgbakọ ahụ, tinyere isi ihe ụfọdụ kpọmkwem ndị anyị ga-achọ iji mee ihe ná ndụ anyị nakwa n’ozi ubi. Mgbe ahụ anyị pụrụ ịgba ndị ọzọ ume site n’ịkọwa otú anyị siworo jiri aro ndị ahụ mee ihe.
Izu Na-amalite September 13
Abụ nke 43
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Ọ bụrụ na aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 kwekọrọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala ọgbakọ unu, jiri ha mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke September 15 na Teta! nke October 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke October 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ iche ihe n’ihu ndị ọzọ mee ihe. Mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla, mee n’ụzọ dị mkpirikpi ka ihe ndị dị mma banyere ihe ngosi ahụ pụta ìhè.
15 min: “Mee Ka Anya Gị Na-elegide Otu Ebe.”a Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Dị ka oge kwere gị, mee ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha pụta ìhè.
18 min: “Ka Anyị Bulie Aha Ya Elu n’Otu.”b Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ya, na-eji ajụjụ ndị e depụtara eme ihe. Gụọ paragraf nke 4. Kwuo mgbakọ e kenyere ọgbakọ unu ịga. E depụtara oge usoro ihe omume ga-amalite n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke May 2004. A pụrụ ime ka isi ihe ndị ọzọ dị n’ihe ntinye ahụ pụta ìhè dị ka mkpa si dị. Mechie site n’ịjụ otu ajụjụ ma ọ bụ abụọ sitere n’isiokwu bụ́ “Nri Ime Mmụọ nke Bịara n’Oge Kwesịrị Ekwesị,” bụ́ nke a ga-atụle ná Nzukọ Ije Ozi nke izu na-esonụ.
Abụ nke 91 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 20
Abụ nke 88
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee isi ihe ndị dị n’akwụkwọ ozi ahụ sitere n’alaka ụlọ ọrụ, bụ́ nke dị na peeji mbụ ná mbipụta a nke Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ịgụ Ọnụ Ọgụgụ 16:1-35 ma kirizie vidio bụ́ Respect Jehovah’s Authority iji kwadebe maka Nzukọ Ije Ozi n’izu nke October 4.
15 min: Okwu Jehova Dị Ndụ. Okwu. Iji nyere anyị aka irite uru zuru ezu n’usoro ọgụgụ Bible kwa izu bụ́ nke e dokwara maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, usoro isiokwu bụ́ “Okwu Jehova Dị Ndụ” amalitela ịpụta ná mbipụta ụfọdụ nke Ụlọ Nche. N’iji Ụlọ Nche nke September 15, 2004, peeji nke 24-27, mee ihe, mee ka isi ihe ndị dị n’isiokwu ndị a pụta ìhè. Mgbe e mesịrị ntụle dị mkpirikpi, nkebi bụ́ “A Zaa Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ” na-enye nkọwa banyere ụfọdụ n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị tara akpụ. Ihe ndị e kwuru n’okpuru “Ihe Mmụta Ndị Dịịrị Anyị” na-adọrọ uche gaa n’uru ihe ndị a gụtara n’ihe ọgụgụ ahụ bara. Tụlee ihe atụ ole na ole kpọmkwem iji gosi otú usoro isiokwu a ga-esi enyere anyị aka ịghọta Okwu Chineke karị. Gbaa mmadụ nile ume iji ndokwa a mee ihe n’ụzọ zuru ezu ka anyị na-amalite ịgụ akwụkwọ Deuterọnọmi n’izu abụọ na-abịanụ.
20 min: “Nri Ime Mmụọ nke Bịara n’Oge Kwesịrị Ekwesị.”c Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Mgbe ị na-atụle paragraf nke 2, mee ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-ege ntị kwuo n’ụzọ dị nkenke banyere mgbakọ distrikti ha gara nke ha na-adịghị echefu echefu. Gụọ paragraf nke 3 na nke 4. Mechie site n’ịjụ ajụjụ abụọ ma ọ bụ atọ sitere n’isiokwu bụ́ “Bụrụ Onye Dị Nsọ n’Omume Gị Nile,” bụ́ nke a ga-atụle ná Nzukọ Ije Ozi nke izu na-esonụ.
Abụ nke 80 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 27
Abụ nke 221
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọnwa September. Mee ihe ngosi nke ụzọ a pụrụ isi nyefee Ụlọ Nche nke October 1 na Teta! nke October 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke October 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe.
20 min: “Bụrụ Onye Dị Nsọ n’Omume Gị Nile.”d Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Gụọ paragraf nke 4, nke 6, na nke 7. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha siworo chọpụta na ime omume ọma ná mgbakọ na-ewetara Jehova otuto. Mechie site n’ịjụ ajụjụ abụọ ma ọ bụ atọ sitere n’isiokwu bụ́ “Ejiji Dị Ọcha nke Kwesịrị Otuto,” bụ́ nke a ga-atụle ná Nzukọ Ije Ozi nke izu na-esonụ.
15 min: “Jiri Bible Na-eme Ihe nke Ọma.”e Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Mee ka okwu mmeghe gị dabere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 145, paragraf nke 2-3. Gụnye ihe ngosi abụọ dị mkpirikpi, otu ga-abụ ozi ụlọ n’ụlọ ebe nke ọzọ ga-abụ nletaghachi, bụ́ ndị ga-egosi otú a pụrụ isi tinye aro ndị a tụrụ n’ọrụ.
Abụ nke 38 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 4
Abụ nke 5
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
20 min: “Ejiji Dị Ọcha nke Kwesịrị Otuto.”f Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Ruo ókè oge kwere mee, gụọ ma kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.
20 min: “Anyị Aghaghị Ịkwanyere Ịbụisi Jehova Ùgwù.” Gụọ Jud 11, mee ka okwu mmeghe ghara ịgafe minit abụọ. Banyezie n’ihe ọmụmụ ahụ na-eji ajụjụ nile e depụtara n’isiokwu ahụ eme ihe. Mee ka ọ pụta ìhè na iji nọgide na-enwe ihu ọma Jehova, anyị aghaghị izere àgwà nnupụisi Kora ma ṅomie ihe nlereanya nke ụmụ ya ndị ikom, bụ́ ndị na-ekweghị ka ihe ọ bụla gbochie ha iguzosi ike n’ihe nye Jehova. N’ọnọdụ ya, tụlee isiokwu bụ́ “Jiri Iguzosi Ike n’Ihe Na-edo Onwe Gị n’Okpuru Ịbụisi Chineke.” Okwu okenye ga-ekwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke August 1, 2002, peeji nke 9-14.
Abụ nke 99 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
f Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.