Anyị Aghaghị Ịkwanyere Ịbụisi Jehova Ùgwù
Gịnị na-agbata gị n’uche ma ị nụ aha ndị oge ochie ahụ bụ́ Kora, Detan, na Abaịram? Ọ bụ nnupụisi! Megide gịnị? Megide ịbụisi Chineke. E dekọrọ ihe ndị metụtara omume ahụ kpataara ha ọdachi n’Ọnụ Ọgụgụ Isi nke 16, a tụlekwara ya n’ụzọ dị mkpirikpi n’isiokwu bụ́ “Jiri Iguzosi Ike n’Ihe Na-edo Onwe Gị n’Okpuru Ịbụisi Chineke,” nke dị n’Ụlọ Nche August 1, 2002. Ọ ga-abara gị uru ịgụ isiokwu a ma kirie ebe e gosiri ya n’ụzọ na-akpali iche echiche na vidio bụ́ Respect Jehovah’s Authority. Ị ga-ahụ esemokwu bilitere n’etiti ụmụ Kora ndị kwesịrị ntụkwasị obi na nna ha na-enupụ isi, bụ́ onye ya na Eze eluigwe na ala kwatara. (Ọnụ 26:9-11) Ihe nkiri a mere eme kwesịrị ịkpali anyị nile iguzosi ike n’ihe nye Jehova n’ụzọ zuru ezu ọbụna karị.
Ka ị na-ekiri vidio ahụ, gbalịa ịchọpụta ihe àmà ndị na-egosi na Kora na ndị nnupụisi ibe ya dara ule nke iguzosi ike n’ihe n’ụzọ isii dị oké mkpa: (1) Olee otú ha si gosi na ha enweghị nkwanye ùgwù maka ịbụisi Chineke? (2) Olee otú ha si kwe ka mpako, oké ọchịchọ, na ekworo metụta ha? (3) Olee otú ha si lekwasị anya n’ezughị okè nke ndị ahụ Jehova họpụtara? (4) Àgwà ime mkpesa dị aṅaa ka ha zụlitere? (5) N’ihi gịnị ka ha na-ejighịzi nwee afọ ojuju n’ihe ùgwù ije ozi ha? (6) Olee otú ha si kwe ka iguzosi ike n’ihe ha nye ndị enyi na ndị òtù ezinụlọ ha karịa nke ha nwere n’ebe Chineke nọ?
Tụlee otú ihe ndị a mụtara n’ihe nkiri Bible a si emetụta otú anyị si ele ịbụisi Chineke anya taa: (1) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume ná mkpebi ndị okenye ọgbakọ mere, n’ihi gịnịkwa? (2) Olee otú anyị pụrụ isi wepụ ọchịchọ na-ekwesịghị ekwesị n’obi anyị? (3) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume banyere ezughị okè nke ndị a họpụtara idu ndú? (4) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmụọ mkpesa amalite ịbata anyị n’obi? (5) Olee otú anyị kwesịrị isi were ihe ùgwù ọ bụla e nyere anyị? (6) Olee ndị anyị na-ekwesịghị ikwe ka iguzosi ike n’ihe anyị nye ha karịa nke anyị nwere n’ebe Chineke nọ, oleekwa mgbe nke a pụrụ ịghọrọ anyị ule tara akpụ?
Gịnị ma i kirighachi vidio ahụ ma a tụlesịa ihe ọmụma a n’ọgbakọ? Kwe ka ọ kụnye n’uche gị ọbụna karị, ihe ndị mere anyị na-aghaghị iji na-akwanyere ịbụisi Jehova ùgwù mgbe nile!—Ọma 18:25; 37:28.