Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2005
Ntụziaka
N’afọ 2005, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
EBE IHE OMUME SI: Bible Nsọ nke Union Version, Ụlọ Nche [w-IB], Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke [be-IB], Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ [fy-IB], na Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu (Mbipụta nke 1998) [td-IB].
E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata malite ụlọ akwụkwọ ahụ N’OGE, mgbe ahụ gaa n’ihu n’usoro a:
NKÀ OKWU: Minit 5. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ, onye ndụmọdụ na-enyere ya aka, ma ọ bụ okenye ọzọ ruru eru ga-atụle otu nkà okwu nke dabeere n’akwụkwọ ọgụgụ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. (N’ọgbakọ ndị e nwere ndị okenye ole na ole, a pụrụ iji ohu na-eje ozi ruru eru mee ihe.) Ọ gwụla ma è kwuru ka a ghara ime otú ahụ, e kwesịrị ịtụlekwa igbe ndị dị na peeji ebe ihe omume e kenyere sitere mgbe a na-ekwu okwu ahụ. E kwesịrị ịmafere akụkụ ndị ahụ e dere “Ihe Omume.” Ndị a, n’ụzọ bụ́ isi, bụ maka mmadụ iji ha eme ihe n’onwe ya nakwa maka ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha.
IHE OMUME NKE 1: Minit 10. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru kwesịrị ime nke a, ọ ga-adaberekwa n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. A ga-ekwu ya dị ka okwu izi ihe nke ga-ewe minit iri n’enweghị ntụleghachi ajụjụ na azịza. Nzube ya ekwesịghị ịbụ nanị ikwuzu ihe dị n’akwụkwọ ahụ kamakwa ilekwasị anya n’uru ihe ọmụma ahụ a na-atụle bara, na-eme ka ihe ga-akasị baara ọgbakọ uru pụta ìhè. E kwesịrị iji isiokwu e nyere mee ihe. A na-atụ anya na ụmụnna e kenyere okwu a ga-elezi anya ka ha ghara ịgafe oge e nyere. A pụrụ inye ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha dị ka o si dị mkpa.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BIBLE: Minit 10. Na minit isii mbụ, okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru kwesịrị igosi otú ihe ọmụma ahụ si metụta mkpa e nwere n’ọgbakọ. Ọ pụrụ ikwu okwu n’akụkụ ọ bụla sitere n’ebe e kenyere maka ọgụgụ Bible n’izu ahụ. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị nchịkọta nke ihe dị n’ebe e kenyere ka a gụọ. Nzube ya bụ́ isi bụ inyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere ihe ọmụma ahụ ji baa uru na otú o si baa uru. Ọkà okwu ahụ kwesịrị ilezi anya ịghara ịgafe minit isii e nyere maka akụkụ mbụ nke okwu ahụ. O kwesịrị ijide n’aka na o wepụtara minit anọ ndị na-ege ntị ga-eji ekere òkè. E kwesịrị ịgwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu dị mkpirikpi (sekọnd 30 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) banyere ihe masịrị ha n’ọgụgụ Bible ahụ na abamuru ya. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwazi ndị mmụta e kenyere na klas ndị ọzọ ka ha gawa n’ebe ndị ahụ.
IHE OMUME NKE 2: Minit 4. Nke a bụ ihe ọgụgụ nke nwanna nwoke ga-agụ. Ihe ọgụgụ ahụ ga-abụkarị site na Bible. Otu ugboro n’ọnwa, ihe omume a ga-esite n’Ụlọ Nche. Onye mmụta ahụ kwesịrị ịgụ ihe e kenyere ya n’ekwughị okwu mmeghe ma ọ bụ nke mmechi. Site n’izu ruo n’izu, otú ihe a ga-agụ ga-aha ga-adịtụ iche, ma o kwesịrị iwe minit anọ ma ọ bụ ihe na-erughị ya. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ kwesịrị ile ihe omume ahụ anya tupu ọ na-ekenye ya mmadụ, na-ekenye ihe omume ahụ dị ka afọ ndụ na ikike nke ndị mmụta si dị. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’inyere ndị mmụta aka iji nghọta, mmesi okwu ike kwesịrị ekwesị, mgbanwe ụda olu, na nkwụsịtụ kwesịrị ekwesị na-agụ ihe n’ụzọ na-aga were were, nakwa dị ka ha si ekwu okwu.
IHE OMUME NKE 3: Minit 5. Ọ bụ nwanna nwanyị ka a ga-ekenye nke a. Ndị mmụta e nyere ihe omume a ga-eji aka ha họrọ ọnọdụ okwu ma ọ bụkwanụ e kenye ha otu site n’ihe ndepụta dị na peeji nke 82 n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. Onye mmụta ahụ kwesịrị iji isiokwu e kenyere ya mee ihe ma mee ka o kwekọọ n’otu akụkụ nke ozi ubi bụ́ nke a pụkwara iji mee ihe n’ókèala ọgbakọ. Mgbe a na-ekwughị ebe ihe omume sitere, ọ ga-adị mkpa ka onye mmụta nweta ihe ọmụma maka ihe omume a site n’ime nnyocha n’akwụkwọ dị iche iche òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche bipụtara. E kwesịrị ikenye ndị mmụta ọhụrụ ihe omume ndị e gosiri ebe ha sitere. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’ụzọ onye mmụta si akọwapụta isiokwu ahụ na ụzọ o si na-enyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ na ịghọta isi ihe ndị dị n’okwu ya. Ndị mmụta e kenyere ihe omume a kwesịrị ịma otú e si agụ ihe. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye onye mmụta otu onye inyeaka.
IHE OMUME NKE 4: Minit 5. Onye mmụta kwesịrị ịkọwapụta isiokwu e kenyere ya. Mgbe a na-ekwughị ebe ihe omume sitere, ọ ga-adị mkpa ka onye mmụta nweta ihe ọmụma maka ihe omume a site n’ime nnyocha n’akwụkwọ dị iche iche òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche bipụtara. Mgbe ọ bụ nwanna nwoke ka e kenyere ya, a pụrụ ime ihe omume a dị ka okwu, na-eburu ndị na-ege ntị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’uche. Mgbe e kenyere nwanna nwanyị ihe omume a, e kwesịrị ime ya mgbe nile dị ka a kọwapụtara maka Ihe Omume nke 3. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ pụrụ ikenye nwanna nwoke Ihe Omume nke 4 mgbe ọ bụla ọ hụrụ na ọ dị mkpa ime otú ahụ. Biko rịba ama na ọ bụ nanị nwanna nwoke ka e kwesịrị ikenye isiokwu nwere akara * n’akụkụ ya ikwu ya dị ka okwu.
IDEBE OGE: Ọ dịghị okwu kwesịrị ịgafe oge e nyere maka ya, okwu onye ndụmọdụ ekwesịghịkwa ịgafe oge. E kwesịrị iji akọ kwụsị Ihe Omume nke 2 ruo nke 4 mgbe oge zuru. Ọ bụrụ na ụmụnna na-ekwu okwu mmeghe metụtara nkà okwu, Ihe Omume nke 1, ma ọ bụ nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible agafee oge, e kwesịrị inye ha ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha. Mmadụ nile kwesịrị iji nlezianya hụ na ha agafeghị oge ha. Usoro ihe omume ahụ dum ga-ewe minit 45, n’agụnyeghị abụ na ekpere.
NDỤMỌDỤ: 1 minit. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eji ihe na-agafeghị otu minit kwuo okwu na-ewuli elu n’akụkụ kwesịrị ịja mma n’okwu ahụ mgbe onye mmụta nke ọ bụla mesịrị ihe omume ya. Ebumnobi ya agaghị abụ nanị ịsị ya “i meela” kama ịdọrọ uche gaa kpọmkwem n’ihe ndị mere ka ihe omume ya dị irè. Dị ka mkpa nke onye mmụta ọ bụla si dị, a pụrụ inyekwu ya ndụmọdụ na-ewuli elu nke na-agaghị abụ n’ihu ọha mgbe a gbasasịrị nzukọ ma ọ bụ n’oge ọzọ.
ONYE NDỤMỌDỤ INYEAKA: Òtù ndị okenye pụrụ ịhọrọ onye okenye ruru eru, ma ọ bụrụ na e nwere, tụkwasị n’onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ka ọ na-arụ ọrụ dị ka onye ndụmọdụ inyeaka. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị okenye n’ọgbakọ, mgbe ahụ, a pụrụ ikenye ndị okenye dịgasị iche iche bụ́ ndị ruru eru, ọrụ a n’afọ nke ọ bụla. Ọrụ onye ndụmọdụ inyeaka ga-abụ inye ụmụnna mere Ihe Omume nke 1 na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha, ma ọ́ dị mkpa. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-enye ndụmọdụ mgbe ọ bụla ndị okenye ibe ya ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi kwusịrị nke ọ bụla n’ime okwu ndị ahụ. Ndokwa a ga-anọgide na-adị irè n’afọ 2005, e nwekwara ike ịhazigharị ya mgbe e mesịrị.
FỌM NDỤMỌDỤ OKWU: Ọ dị n’akwụkwọ ọgụgụ.
NTỤLEGHACHI: Minit 30. N’ọnwa abụọ ọ bụla, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi. Tupu e mewe ya, a ga-ebu ụzọ tụlee otu nkà okwu na isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible dị ka a kọwapụtara n’elu. Ntụleghachi ahụ ga-adabere n’ihe a tụlere n’ụlọ akwụkwọ n’ime ọnwa abụọ bu ya ụzọ, gụnyere izu ahụ a nọ na ya. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere mgbakọ sekit ma ọ bụ na onye nlekọta na-eleta unu n’izu a ga-eme ntụleghachi, mgbe ahụ, gbasoonụ ntụziaka e nyere banyere ịhazi usoro ihe omume, bụ́ nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke December 2003, peeji nke 6.
USORO IHE OMUME
Jan. 3 Ọgụgụ Bible: Joshua 16-20 Abụ nke 6
Nkà Okwu: Ndị Ọzọ Pụrụ Ịghọta Ya (be-IB p. 226 para. 1–p. 227 para. 1)
Nke 1: Tụọ Egwu Ezi Chineke Ahụ (be-IB p. 272 para. 1–p. 273 para. 1)
Nke 2: Joshua 16:1-17:4
Nke 3: Echiche Chineke Banyere Mmekọahụ (fy-IB p. 92-95 para. 8-13)
Nke 4: Ịba Ọgaranya Ma Ọ Bụ Ịda Ogbenye Ọ̀ Bụ Ihe Na-egosi na Mmadụ Na-atụ Egwu Chineke Taa?
Jan. 10 Ọgụgụ Bible: Joshua 21-24 Abụ nke 100
Nkà Okwu: Ịkọwa Okwu Ndị A Na-amachaghị (be-IB p. 227 para. 2–p. 228 para. 1)
Nke 1: Ime Ka A Mara Aha Chineke (be-IB p. 273 para. 2-7)
Nke 2: Joshua 23:1-13
Nke 3: Nyere Ụmụ Gị Aka Ịhọrọ Ezi Ndị Enyi (fy-IB p. 95-97 para. 14-18)
Nke 4: Ò Kwesịrị Ekwesị Ife Jizọs Ofufe?
Jan. 17 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 1-4 Abụ nke 97
Nkà Okwu: Inye Nkọwa Dị Mkpa (be-IB p. 228 para. 2-3)
Nke 1: Onye Nwe Aha Ahụ (be-IB p. 274 para. 1-4)
Nke 2: Ndị Ikpe 2:1-10
Nke 3: Ịhọrọ Ntụrụndụ Dị Mma Maka Ezinụlọ (fy-IB p. 98-102 para. 19-27)
Nke 4: Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chebe Onwe Gị Pụọ na Vidio Egwú Ndị Dị Ize Ndụ?
Jan. 24 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 5-7 Abụ nke 47
Nkà Okwu: Otú O Si Agụnye Obi (be-IB p. 228 para. 4-6)
Nke 1: Aha Chineke—“Ụlọ Elu Dị Ike” (be-IB p. 274 para. 5–p. 275 isiokwu nta)
Nke 2: Ndị Ikpe 6:25-35
Nke 3: Olee Otú Bible Kwesịrị Isi Na-emetụta Nnwere Onwe Anyị Ime Nhọrọ?
Nke 4: aNghọta Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ Maka Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna (fy-IB p. 103-105 para. 1-8)
Jan. 31 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 8-10 Abụ nke 174
Nkà Okwu: Ndị Na-ege Gị Ntị Mụtara Ihe na Ya (be-IB p. 230 para. 1-6)
Nke 1: Ịgba Àmà Banyere Jizọs (be-IB p. 275 isiokwu nta, para. 1-4)
Nke 2: w03-IB 1/15 p. 19-20 para. 16-18
Nke 3: Ihe Ịma Aka nke Ịkpata Ihe E Ji Ebi Obi Dị Ka Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ya Na-azụ Ụmụ (fy-IB p. 105-107 para. 9-12)
Nke 4: Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya Pụtara Ihe Karịrị Ịkpakọba Ihe Onwunwe
Feb. 7 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 11-14 Abụ nke 209
Nkà Okwu: Ime Ka Okwu Bụrụ nke A Mụtara Ihe na Ya Site n’Ime Nnyocha (be-IB p. 231 para. 1-3)
Nke 1: Ime Ka Òkè Jizọs Na-ekere Dị Ka Onye Mgbapụta Pụta Ìhè (be-IB p. 276 para. 1-2)
Nke 2: Ndị Ikpe 12:1-15
Nke 3: Ihe Mere Ndịàmà Jehova Ji Dị n’Otu
Nke 4: bỊnọgide Na-adọ Aka ná Ntị n’Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna (fy-IB p. 108-110 para. 13-17)
Feb. 14 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 15-18 Abụ nke 105
Nkà Okwu: Ịkọwa Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 231 para. 4-5)
Nke 1: Ime Ka Òkè Jizọs Na-ekere Dị Ka Nnukwu Onye Nchụàjà na Onyeisi nke Ọgbakọ Pụta ìhè (be-IB p. 277 para. 1-2)
Nke 2: Ndị Ikpe 15:9-20
Nke 3: Imeri n’Ọgụ A Na-alụ Megide Owu Ọmụma (fy-IB p. 110-113 para. 18-22)
Nke 4: Ihe Mere A Ga-eji Jụ Mgbaasị n’Ụdị Ya Nile
Feb. 21 Ọgụgụ Bible: Ndị Ikpe 19-21 Abụ nke 53
Nkà Okwu: Ịkọwa Ihe Okwu Dị Iche Iche Pụtara (be-IB p. 232 para. 1)
Nke 1: Ime Ka Òkè Jizọs Na-ekere Dị Ka Eze Na-achị Achị Pụta Ìhè (be-IB p. 277 para. 3-4)
Nke 2: w03-IB 2/1 p. 17-18 para. 18-21
Nke 3: Otú E Si Enye Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nkwado (fy-IB p. 113-115 para. 23-27)
Nke 4: Gịnị Bụ Ụfọdụ n’Ime “Ihe Ndị Miri Emi nke Chineke”? (1 Kọr. 2:10)
Feb. 28 Ọgụgụ Bible: Rut 1-4 Abụ nke 120
Nkà Okwu: Ịtụgharị Uche n’Akụkụ Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 232 para. 2-4)
Ntụleghachi
Mar. 7 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 1-4 Abụ nke 221
Nkà Okwu: Ịhọrọ Ihe Ọmụma nke Ga-abara Ndị Na-ege Gị Ntị Uru (be-IB p. 233 para. 1-5)
Nke 1: Iji Kraịst Mere Ntọala (be-IB p. 278 para. 1-4)
Nke 2: 1 Samuel 2:1-11
Nke 3: Uru Ndị A Na-erite n’Iji Àgwà Nsọpụrụ Chineke Anagide Ọrịa (fy-IB p. 116-119 para. 1-9)
Nke 4: Ihe Mere Ezigbo Ndị Kraịst Adịghị Agụ Akwụkwọ Ndị E Ji Agụ Kpakpando
Mar. 14 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 5-9 Abụ nke 151
Nkà Okwu: Iji Ebe Ihe Omume E Kenyere Sitere Mee Ihe (be-IB p. 234 para. 1–p. 235 para. 3)
Nke 1: Ozi Ọma nke A nke Alaeze (be-IB p. 279 para. 1-4)
Nke 2: 1 Samuel 5:1-12
Nke 3: Uru nke Mmụọ Ọgwụgwọ Bara (fy-IB p. 120-121 para. 10-13)
Nke 4: Otú Anyị Pụrụ Isi Mee Ka Ọbụbụenyi Anyị na Jehova Sikwuo Ike
Mar. 21 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 10-13 Abụ nke 166
Nkà Okwu: Iji Ajụjụ Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè (be-IB p. 236 para. 1-5)
Nke 1: Ịkọwa Ihe Alaeze ahụ Bụ (be-IB p. 280 para. 1-5)
Nke 2: 1 Samuel 10:1-12
Nke 3: Olee Otú Ndị Kraịst Kwesịrị Isi Na-emeso Ndị Ha Hụrụ n’Anya Bụ́ Ndị Ha na Ha Na-anọghị n’Otu Okpukpe?
Nke 4: cHazie Ihe n’Usoro Ịdị Mkpa Ma Nyere Ụmụ Gị Aka Ịnagide Ọrịa E Nwere n’Ime Ezinụlọ (fy-IB p. 122-123 para. 14-18)
Mar. 28 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 14-15 Abụ nke 172
Nkà Okwu: Ịjụ Ajụjụ Iji Webata Echiche Ndị Dị Mkpa (be-IB p. 237 para. 1-2)
Nke 1: Ịkọwa Otú Alaeze ahụ Si Emetụta Anyị (be-IB p. 281 para. 1-4)
Nke 2: w03-IB 3/15 p. 19-20 para. 17-21
Nke 3: Ihe Mere Ndị Kraịst Ji Atụ Ụtụ Isi Ha
Nke 4: dỤzọ Isi Lee Iji Ọgwụ Agwọ Ọrịa Anya (fy-IB p. 124-127 para. 19-23)
Apr. 4 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 16-18 Abụ nke 27
Nkà Okwu: Ịjụ Ajụjụ Iji Tụgharịa Uche n’Otu Isiokwu (be-IB p. 237 para. 3–p. 238 para. 1)
Nke 1: Ihe Mere Agụmakwụkwọ Ji Dị Mkpa Nye Ndị Kraịst (w03-IB 3/15 p. 10 para. 1–p. 11 para. 5)
Nke 2: 1 Samuel 17:41-51
Nke 3: Olee Otú Nwunye Kwere Ekwe Pụrụ Isi Na-ahụ na Udo Dị n’Ezinụlọ Kewara Ekewa? (fy-IB p. 128-132 para. 1-9)
Nke 4: Ịtụgharị Uche n’Ihe Ndị Ga-esi n’Ihe Pụta Pụrụ Inyere Anyị Aka Ịhụ Ezi Ihe n’Anya na Ịkpọ Ihe Ọjọọ Asị
Apr. 11 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 19-22 Abụ nke 73
Nkà Okwu: Ịjụ Ajụjụ Iji Dọpụta Ihe Dị n’Obi (be-IB p. 238 para. 2-4)
Nke 1: Otú Ndị Ntorobịa Pụrụ Isi Nwee Ọganihu Ime Mmụọ (w03-IB 4/1 p. 8-10)
Nke 2: 1 Samuel 20:24-34
Nke 3: Ihe Mere Ezi Obi Umeala Ji Bụrụ Àgwà Na-adọrọ Mmasị
Nke 4: eOlee Otú Di Kwere Ekwe Pụrụ Isi Nọgide Na-ahụ na E Nwere Udo n’Ezinụlọ Kewara Ekewa? (fy-IB p. 132-133 para. 10-11)
Apr. 18 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 23-25 Abụ nke 61
Nkà Okwu: Ịjụ Ajụjụ Iji Mesikwuo Ihe Ike (be-IB p. 238 para. 5-p. 239 para. 1)
Nke 1: Tụkwasị Jehova Obi Gị Nile (w03-IB 11/1 p. 4-7)
Nke 2: w03-IB 5/1 p. 17 para. 11-14
Nke 3: Ịzụlite Ụmụaka n’Ụzọ Akwụkwọ Nsọ Kwadoro n’Ezinụlọ Kewara Ekewa (fy-IB p. 133-134 para. 12-15)
Nke 4: Ihe Mere E Ji Nwee Ọgbụgba Ndụ Ebreham
Apr. 25 Ọgụgụ Bible: 1 Samuel 26-31 Abụ nke 217
Nkà Okwu: Ịjụ Ajụjụ Iji Kpughee Echiche Na-ezighị Ezi (be-IB p. 239 para. 2-4)
Ntụleghachi
May 2 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 1-3 Abụ nke 91
Nkà Okwu: Okwu Ndị E Ji Ezi Ihe Bụ́ Ndị Na-ekwu na Ihe Yiri Ihe na Ndị Na-ekwu na Otu Ihe Bụ Ihe Ọzọ (be-IB p. 240 para. 1–p. 241 para. 2)
Nke 1: Agụmakwụkwọ Abụghị Nanị Maka Inweta Ọrụ (w03-IB 3/15 p. 11 para. 6–p. 14 para. 5)
Nke 2: 2 Samuel 2:1-11
Nke 3: Ịnọgide Na-eso Ndị Mụrụ Gị Bụ́ Ndị Okpukpe Ha Dị Iche na nke Gị Na-adị n’Udo (fy-IB p. 134-136 para. 16-19)
Nke 4: Ọtụtụ Uru Ndị A Na-erite n’Ihi Ime Ihe n’Eziokwu
May 9 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 4-8 Abụ nke 183
Nkà Okwu: Iji Ihe Atụ Eme Ihe (be-IB p. 241 para. 3-p. 242 para. 1)
Nke 1: Jehova Na-enwe Ezi Mmasị n’Ebe Ndị Na-eto Eto Nọ (w03-IB 4/15 p. 29 para. 4–p. 31 para. 3)
Nke 2: 2 Samuel 5:1-12
Nke 3: Gịnị Ka Ọgbụgba Ndụ Iwu ahụ Rụzuru?
Nke 4: fIhe Ịma Aka nke Ịbụ Nne Ma Ọ Bụ Nna Nkuchi (fy-IB p. 136-139 para. 20-25)
May 16 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 9-12 Abụ nke 66
Nkà Okwu: Ihe Atụ Ndị Sitere n’Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 242 para. 2-3)
Nke 1: Jehova Ọ̀ Na-ahụ Ihe Ị Na-eme? (w03-IB 5/1 p. 28-31)
Nke 2: 2 Samuel 9:1-13
Nke 3: Ekwela Ka Nchụso Ihe Onwunwe Kewaa Ezinụlọ Gị (fy-IB p. 140-141 para. 26-28)
Nke 4: N’ụzọ Ndị Dị Aṅaa Ka Okwu Chineke Si Dịrị Ndụ? (Hib. 4:12)
May 23 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 13-15 Abụ nke 103
Nkà Okwu: À Ga-aghọta Ya? (be-IB p. 242 para. 4–p. 243 para. 1)
Nke 1: Ihe Ndekọ Njem Noa—Ò Nwere Ihe Ọ Pụtara Nye Anyị? (w03-IB 5/15 p. 4-7)
Nke 2: 2 Samuel 13:10-22
Nke 3: Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Ghọta Jọn 11:25, 26?
Nke 4: gMmetụta Na-ebibi Ihe nke Aṅụrụma Na-enwe (fy-IB p. 142-143 para. 1-4)
May 30 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 16-18 Abụ nke 132
Nkà Okwu: Ihe Atụ Ndị Sitere n’Ọnọdụ Ndị A Maara nke Ọma (be-IB p. 244 para. 1-2)
Nke 1: Na-eche Echiche nke Ọma Ma Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya (w03-IB 7/15 p. 21-23)
Nke 2: w03-IB 5/15 p. 16-17 para. 8-11
Nke 3: Inyere Onye Òtù Ezinụlọ nke Bụ́ Onye Aṅụrụma Aka (fy-IB p. 143-146 para. 5-13)
Nke 4: Ihe Mere Ịdị Umeala n’Obi Na-ejighị Bụrụ Adịghị Ike
June 6 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 19-21 Abụ nke 224
Nkà Okwu: Ihe Atụ Ndị Kwesịrị Ekwesị Maka Ndị Na-ege Gị Ntị (be-IB p. 244 para. 3–p. 245 para. 4)
Nke 1: Ịghọta Nzube nke Ịdọ Aka ná Ntị (w03-IB 10/1 p. 20 para. 1–p. 21 para. 5)
Nke 2: 2 Samuel 19:1-10
Nke 3: Olee Otú Onye Kraịst Pụrụ Isi Banye n’Izu Ike Chineke?
Nke 4: hIme Ihe Ike n’Ebe Obibi na Ụzọ Ndị A Ga-esi Zere Ya (fy-IB p. 147-149 para. 14-22)
June 13 Ọgụgụ Bible: 2 Samuel 22-24 Abụ nke 74
Nkà Okwu: Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè (be-IB p. 247 para. 1-2)
Nke 1: Bụrụ Onye A Pụrụ Izi Ihe Ma Kwaa Ire Gị Nga (w03-IB 9/15 p. 21 para. 1–p. 22 para. 4)
Nke 2: 2 Samuel 24:10-17
Nke 3: Nkewa Ọ̀ Bụ Ihe Ngwọta Ya? (fy-IB p. 150-152 para. 23-26)
Nke 4: Ụzọ Ndị Dị Aṅaa Ka Onye Kraịst Na-aghaghị Isi Nọpụ Iche n’Ụwa?
June 20 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 1-2 Abụ nke 2
Nkà Okwu: Otú Jizọs Si Jiri Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Mee Ihe (be-IB p. 247 para. 3)
Nke 1: Ịmata Isi Ihe Na-akpata Inwe Afọ Ojuju (w03-IB 6/1 p. 8-11)
Nke 2: w03-IB 6/1 p. 12-13 para. 1-4
Nke 3: Olee Ihe Dị Ịrịba Ama Karịsịa Banyere Iwu Iri Ahụ?
Nke 4: iỤzọ Akwụkwọ Nsọ Kwadoro Isi Na-edozi Nsogbu Di na Nwunye (fy-IB p. 153-156 para. 1-9)
June 27 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 3-6 Abụ nke 167
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Jiri Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Mee Ihe (be-IB p. 248 para. 1-3)
Ntụleghachi
July 4 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 7-8 Abụ nke 194
Nkà Okwu: Iji Map, Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ndị E Biri Ebi, na Vidio Eme Ihe (be-IB p. 248 para. 4–p. 249 para. 2)
Nke 1: Jiri Ndị Kwere Ekwe Ibe Gị Meworo Agadi Kpọrọ Ihe (w03-IB 9/1 p. 30-31)
Nke 2: 1 Ndị Eze 8:1-13
Nke 3: Olee Otú Jizọs Si Merie Ụwa?
Nke 4: jỊkwụ Ụgwọ Alụmdi na Nwunye (fy-IB p. 156-158 para. 10-13)
July 11 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 9-11 Abụ nke 191
Nkà Okwu: Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Eme Ihe Maka Ìgwè Ndị Buru Ibu Karị (be-IB p. 249 para. 3–p. 250 para. 1)
Nke 1: Ihe Akaebe nke Na-egosi na Jizọs Kraịst Biri n’Ụwa (w03-IB 6/15 p. 4-7)
Nke 2: 1 Ndị Eze 9:1-9
Nke 3: Ihe Ndabere Bible Maka Ịgba Alụkwaghịm (fy-IB p. 158-159 para. 14-16)
Nke 4: Mmadụ Pụrụ Inwere Onwe Ya Pụọ n’Ịbụ Onye Ọgwụ Ọjọọ Riri Ahụ́ Site n’Ịgbaso Ụkpụrụ Bible
July 18 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 12-14 Abụ nke 162
Nkà Okwu: Ihe Mere Ụzọ E Si Atụgharị Uche Ji Dị Mkpa (be-IB p. 251 para. 1-3)
Nke 1: Site n’Iche Ya n’Echiche Gaa n’Ime Ya Eme Gaa n’Ihe Ndị Ga-esi na Ya Pụta (w03-IB 1/15 p. 30 para. 1-3)
Nke 2: 1 Ndị Eze 12:1-11
Nke 3: Otú Okwukwe Pụrụ Isi Nyere Anyị Aka Imeri Ọnwụnwa
Nke 4: kIhe Akwụkwọ Nsọ Na-ekwu Banyere Nkewa (fy-IB p. 160-162 para. 17-22)
July 25 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 15-17 Abụ nke 158
Nkà Okwu: Ebe A Ga-amalite (be-IB p. 251 para. 4–p. 252 para. 3)
Nke 1: Otú E Si ‘Aghọta Ihe Uche Jehova Bụ’ (w03-IB 12/1 p. 21 para. 2–p. 23 para. 2)
Nke 2: w03-IB 7/15 p. 19 para. 15-17
Nke 3: Imekọ Agadi Ọnụ (fy-IB p. 163-165 para. 1-9)
Nke 4: Olee Otú Mmụọ Nsọ Si Akasi Ndị Kraịst Obi?
Aug. 1 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 18-20 Abụ nke 207
Nkà Okwu: Mgbe A Ga-ekwenye n’Ihe (be-IB p. 252 para. 4–p. 253 para. 2)
Nke 1: Ndị Ntorobịa, Na-ejenụ Ije n’Ụzọ Kwesịrị Jehova (w03-IB 10/15 p. 23 para. 1–p. 24 para. 1)
Nke 2: 1 Ndị Eze 18:1-15
Nke 3: Ndị Kraịst Nile Pụrụ Ịmịkwu Mkpụrụ
Nke 4: lImesiwanye Ihe Nkekọ Alụmdi na Nwunye Ike (fy-IB p. 166-167 para. 10-13)
Aug. 8 Ọgụgụ Bible: 1 Ndị Eze 21-22 Abụ nke 92
Nkà Okwu: Ịjụ Ajụjụ na Ikwu Ihe Ndị Kpatara Ihe (be-IB p. 253 para. 3–p. 254 para. 2)
Nke 1: Ihe Ngwọta Na-adịgide Adịgide nke Ịda Ogbenye (w03-IB 8/1 p. 4-7)
Nke 2: 1 Ndị Eze 21:15-26
Nke 3: Nwee Ọṅụ n’Ụmụ Ụmụ Gị Ma Mee Nhazigharị Ka Ị Na-aka Nká (fy-IB p. 168-170 para. 14-19)
Nke 4: N’ihi Gịnị Ka Anyị Na-aghaghị Iji Nwee Obi Ike, Oleekwa Otú Anyị Pụrụ Isi Zụlite Ya?
Aug. 15 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 1-4 Abụ nke 16
Nkà Okwu: Ihe Ndị Ziri Ezi E Ji Kwado Okwu Bụ́ Ndị Dabesiiri Ike n’Okwu Chineke (be-IB p. 255 para. 1–p. 256 para. 3)
Nke 1: Unu Natara n’Efu, Na-enyenụ n’Efu (w03-IB 8/1 p. 20-22)
Nke 2: 2 Ndị Eze 3:1-12
Nke 3: N’ihi Gịnị Ka Ndị Biri Ndụ Tupu Iju Mmiri ahụ Ji Dịtee Nnọọ Ndụ Aka?
Nke 4: aỊnagide Ọnwụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye Gị (fy-IB p. 170-172 para. 20-25)
Aug. 22 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 5-8 Abụ nke 193
Nkà Okwu: Kwadoo Okwu Site n’Inye Ihe Àmà Ndị Ọzọ Na-akwado Ya (be-IB p. 256 para. 4-6)
Nke 1: Ịmụta Nkà nke Iji Akọ Eme Ihe (w03-IB 8/1 p. 29-31)
Nke 2: w03-IB 8/1 p. 19 para. 18-22
Nke 3: Ụzọ Ndị Kraịst nke Ịsọpụrụ Ndị Nne na Nna Meworo Agadi (fy-IB p. 173-175 para. 1-5)
Nke 4: Olee Àgwà Ọma Jona Ndị Anyị Kwesịrị Iṅomi?
Aug. 29 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 9-11 Abụ nke 129
Nkà Okwu: Inye Ihe Àmà Zuru Ezu (be-IB p. 257 para. 1-4)
Ntụleghachi
Sept. 5 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 12-15 Abụ nke 175
Nkà Okwu: Mgbalị Iji Ruo n’Obi (be-IB p. 258 para. 1-p. 259 para. 1)
Nke 1: Ị̀ Na-achọsi Jehova Ike? (w03-IB 8/15 p. 25-28)
Nke 2: 2 Ndị Eze 12:1-12
Nke 3: N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chụsoo Ịdị Nwayọọ?
Nke 4: bNa-egosi Ịhụnanya na Ọmịiko (fy-IB p. 175-178 para. 6-14)
Sept. 12 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 16-18 Abụ nke 203
Nkà Okwu: Ịjụpụta Ihe Dị Mmadụ n’Obi (be-IB p. 259 para. 2-4)
Nke 1: Gịnị Ka Ndị Mmadụ Chetara Banyere Jizọs? (w03-IB 8/15 p. 6 para. 6–p. 8 para. 6)
Nke 2: 2 Ndị Eze 16:10-20
Nke 3: Na-elegara Jehova Anya Mgbe Nile Maka Ume (fy-IB p. 179-182 para. 15-21)
Nke 4: Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Jide n’Aka Ihe Onyenwe Anyị Na-anara nke Ọma?
Sept. 19 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 19-22 Abụ nke 89
Nkà Okwu: Ịkpali Mmetụta Ndị Bara Uru (be-IB p. 259 para. 5–p. 260 para. 1)
Nke 1: “Nọgide Na-ejide Ụkpụrụ nke Okwu Na-enye Ezi Ndụ” (w03-IB 1/1 p. 29 para. 3–p. 30 para. 4)
Nke 2: 2 Ndị Eze 19:20-28
Nke 3: Zụlite Nsọpụrụ Chineke na Imeru Ihe n’Ókè (fy-IB p. 183-184 para. 1-5)
Nke 4: Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịmụta n’Aka Ụmụnna Anyị Bụ́ Ndị Kraịst Nọ na Smụana?
Sept. 26 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 23-25 Abụ nke 84
Nkà Okwu: Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịzụlite Egwu Chineke (be-IB p. 260 para. 2-3)
Nke 1: Nkasi Obi Maka Ndị Na-ahụju Anya (w03-IB 1/1 p. 4-7)
Nke 2: w03-IB 8/15 p. 20 para. 6-10
Nke 3: Anyị Na-enwe Nchekwube Banyere Ọdịnihu
Nke 4: cỤzọ Kwesịrị Ekwesị Isi Lee Ịbụisi Anya (fy-IB p. 185-186 para. 6-9)
Oct. 3 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 1-4 Abụ nke 51
Nkà Okwu: Àgwà Anyị Dị Mkpa Nye Chineke (be-IB p. 260 para. 4–p. 261 para. 1)
Nke 1: Ihe Ọjọọ Ò Meriwo? (w03-IB 1/15 p. 4-7)
Nke 2: 1 Ihe E Mere 4:24-43
Nke 3: Òkè Dị Mkpa Ịhụnanya Na-ekere n’Ime Ezinụlọ (fy-IB p. 186-187 para. 10-12)
Nke 4: Jehova Hụrụ Anyị n’Anya n’Otu n’Otu
Oct. 10 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 5-7 Abụ nke 195
Nkà Okwu: Inyere Ndị Ọzọ Aka Ime Nnyocha (be-IB p. 261 para. 2-4)
Nke 1: Ụzọ Isi Zụlite Echiche Kwesịrị Ekwesị Banyere Ọrụ (w03-IB 2/1 p. 4-7)
Nke 2: 1 Ihe E Mere 5:18-26
Nke 3: Ihe Anyị Maara Banyere “Ụbọchị Jehova”
Nke 4: dIme Uche Chineke Dị Ka Ezinụlọ (fy-IB p. 188-189 para. 13-15)
Oct. 17 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 8-11 Abụ nke 201
Nkà Okwu: Ịkwalite Nrubeisi Sitere n’Obi (be-IB p. 262 para. 1-4)
Nke 1: “Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa” (w03-IB 3/15 p. 4-7)
Nke 2: 1 Ihe E Mere 10:1-14
Nke 3: Ezinụlọ na Ọdịnihu Gị (fy-IB p. 190-191 para. 16-18)
Nke 4: Olee Ndị Anyị Kwesịrị Iji Akọ Na-emeso Ihe?
Oct. 24 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 12-15 Abụ nke 80
Nkà Okwu: Ịkwado Jehova n’Iru n’Obi Ndị Mmadụ (be-IB p. 262 para. 5)
Nke 1: Ebee Ka Ị Pụrụ Ịchọta Ezi Ụkpụrụ Ime Mmụọ? (w03-IB 4/15 p. 5-7)
Nke 2: w03-IB 11/1 p. 10-11 para. 10-13
Nke 3: Ihe Ije Ije n’Aha Jehova Pụtara n’Ezie
Nke 4: td-IB 1A Onye Kpatara Nsogbu Ụwa
Oct. 31 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 16-20 Abụ nke 129
Nkà Okwu: Idebe Oge (be-IB p. 263 para. 1–p. 264 para. 4)
Ntụleghachi
Nov. 7 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 21-25 Abụ nke 215
Nkà Okwu: Ndụmọdụ Dị Irè (be-IB p. 265 para. 1-3)
Nke 1: Nọgidesie Ike, Ma Nwee Mmeri n’Ọsọ nke Ndụ Ahụ (w03-IB 5/15 p. 21-24)
Nke 2: 1 Ihe E Mere 22:1-10
Nke 3: td-IB 1B Ihe Mere E Ji Kwe Ka Ajọ Omume Dịrị
Nke 4: eOtú A Pụrụ Isi Mee Ka Alụmdi na Nwunye Sikwuo Ike
Nov. 14 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 26-29 Abụ nke 35
Nkà Okwu: Ịdabere n’Ịhụnanya Na-enye Ndụmọdụ (be-IB p. 266 para. 1-4)
Nke 1: Inye Ihe nke Na-amasị Chineke (w03-IB 6/1 p. 4-7)
Nke 2: 1 Ihe E Mere 29:1-9
Nke 3: Ihe Mere E Ji Akpagbu Ndị Ohu Jehova
Nke 4: td-IB 1CH Oge Ọgwụgwụ E Mere Ka Ọ Dị Ogologo Bụ Ndokwa Ebere
Nov. 21 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 1-5 Abụ nke 46
Nkà Okwu: Ndụmọdụ nke Gbadoro Ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 267 para. 1-2)
Nke 1: Ụzọ Isi Zụlite Ezi Ịhụnanya (w03-IB 7/1 p. 4-7)
Nke 2: 2 Ihe E Mere 2:1-10
Nke 3: Ghọta Nzube nke Ịdọ Aka ná Ntị
Nke 4: td-IB 1D Ihe Ngwọta Maka Nsogbu Ụwa Agaghị Esite n’Aka Mmadụ
Nov. 28 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 6-9 Abụ nke 106
Nkà Okwu: Inwe “Nkwuwa Okwu” (be-IB p. 267 para. 3-4)
Nke 1: Ihe Mere na Anyị Apụghị Ịnọ n’Adabereghị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ (w03-IB 7/15 p. 4-7)
Nke 2: w03-IB 12/1 p. 15-16 para. 3-6
Nke 3: Otú Anyị Si Egosi na Ihe Jehova Na-atọ Anyị Ụtọ
Nke 4: td-IB 2A Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Ihe A Kpọrọ Mmadụ
Dec. 5 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 10-14 Abụ nke 116
Nkà Okwu: Ihe Mere Ịgba Ume Ji Dị Mkpa (be-IB p. 268 para. 1-3)
Nke 1: Otu Ezi Okpukpe Ndị Kraịst—Ihe Dị Adị (w03-IB 9/1 p. 4-7)
Nke 2: 2 Ihe E Mere 12:1-12
Nke 3: Ihe Mere Obiọma Chineke nke Na-erughịrị Mmadụ Ji Dị Anyị Mkpa
Nke 4: td-IB 2B Ọrụ Ya Ga-amalite Mgbe Ndị Iro Kraịst Ka Nọ n’Ọrụ
Dec. 12 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 15-19 Abụ nke 182
Nkà Okwu: Ichetaghachiri Ha Ihe Jehova Meworo (be-IB p. 268 para. 4–p. 269 para. 2)
Nke 1: Ntinye Aka Chineke—Gịnị Ka Anyị Pụrụ Ịtụ Anya Ya? (w03-IB 10/1 p. 4-7)
Nke 2: 2 Ihe E Mere 19:1-11
Nke 3: td-IB 2CH Ọ Dịghị ‘n’Obi,’ A Dịghị Eguzobe Ya Site ná Mgbalị nke Mmadụ
Nke 4: Ihe Anyị Pụrụ Ịmụta n’Aka Ezinụlọ Jizọs
Dec. 19 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 20-24 Abụ nke 186
Nkà Okwu: Igosi Otú Jehova Siworo Nyere Ndị Ya Aka (be-IB p. 269 para. 3-5)
Nke 1: Olee Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Amamihe Dị na Ha? (w03-IB 10/15 p. 4-7)
Nke 2: w03-IB 12/15 p. 16-17 para. 13-15
Nke 3: Uru Ndị A Na-erite Site n’Ịmata Isi Ihe Na-akpata Inwe Afọ Ojuju
Nke 4: td-IB 3A Njikọ Alụmdi na Nwunye Aghaghị Ịbụ Ihe A Na-asọpụrụ
Dec. 26 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 25-28 Abụ nke 137
Nkà Okwu: Igosi Obi Ụtọ n’Ihe Chineke Na-eme Ugbu A (be-IB p. 270 para. 1–p. 271 para. 1)
Ntụleghachi
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Kenye ya nwanna nwoke.
b Kenye ya nwanna nwoke.
c Kenye ya nwanna nwoke.
d Kenye ya nwanna nwoke.
e Kenye ya nwanna nwoke.
f Kenye ya nwanna nwoke.
g Kenye ya nwanna nwoke.
h Kenye ya nwanna nwoke.
i Kenye ya nwanna nwoke.
j Kenye ya nwanna nwoke.
k Kenye ya nwanna nwoke.
l Kenye ya nwanna nwoke.
a Kenye ya nwanna nwoke.
b Kenye ya nwanna nwoke.
c Kenye ya nwanna nwoke.
d Kenye ya nwanna nwoke.
e Kenye ya nwanna nwoke.