Na-abịaru Nnọọ Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nso
1 Olee ndị anyị kwesịrị ịhụ n’anya? Nke mbụ, anyị hụrụ Jehova n’anya. (Mak 12:30) Anyị kwesịrị ịhụ ya n’anya ma fee nanị ya ofufe n’ihi ihe nile o mewooro anyị ná ngosipụta nke ịhụnanya ya na-enweghị atụ. (Rom 5:8) Dị ka Onye Mgbapụta anyị, Nnukwu Onye Nchụàjà anyị, na Eze anyị, anyị hụrụ Jizọs Kraịst n’anya nke ukwuu. (1 Pita 1:8) Di na nwunye kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya. (Efe. 5:25, 33) E kwesịrị ịhụ ụmụaka n’anya ma zụlite ha n’ụzọ Jehova. (Taị. 2:4) Mmadụ nile nọ n’ọgbakọ kwesịkwara inwe ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ.—1 Pita 1:22.
2 Ekwensu na-agbalị ịdọpụ uche anyị n’ebe ndị anyị kwesịrị igosi ịhụnanya nọ. Iji mezuo nzube ya, ọ na-eji ọtụtụ ụzọ aghụghọ na akọ eme ihe. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdọpụ uche anyị site n’ime ka anyị tinye aka ná mkpakọrịta dị iche iche nke ụwa bụ́ ndị ga-eme ka anyị ghara inwe ohere ịga nzukọ ma ọ bụ ikere òkè n’ozi. Ma ọ bụ, ọ pụrụ ime ka anyị na-etinye oge dị ukwuu n’ikiri telivishọn, vidio, n’ịgụ ma ọ bụ n’iziga ozi E-mail, ma ọ bụ n’ịchọ ihe n’Intanet. Gịnị ka e kwesịrị ime mgbe Onye Kraịst na-enweta nrụgide site n’ụwa ma ọ bụ mgbe ọ na-enweta ọnwụnwa?
3 Ọ dị mkpa ka anyị bịaruo nnọọ Jehova nso, ma guzogide Ekwensu. (Jems 4:7, 8) Ka anyị na-agụkwu ma na-amụtakwu banyere ndụ na ozi Jizọs, ekele anyị nwere maka ihe nlereanya ọ hapụụrụ anyị na-akwali anyị ịgbaso nzọụkwụ ya n’ụzọ chiri anya karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (1 Pita 2:21; Jọn 4:34) A bịa n’ezinụlọ, anyị kwesịrị ịnọ na nche megide inwe echiche nke ụwa a bụ́ mmadụ ime ihe masịrị ya. Ndị òtù ezinụlọ kwesịrị ịgbalị na-ewepụta oge iji nọkọọ na iji na-emekọ ihe ọnụ.—Deut. 6:7.
4 N’ọgbakọ, a na-akụziri mmadụ nile ịhụrịta ibe ha n’anya na ime ya n’ụzọ zuru ezu karị, bụ́ nke pụtara ịbịaru nnọọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nso. (Gal. 6:9, 10; 1 Tesa. 4:9, 10) Anyị na-eme nke a site n’ikerechi òkè anya ná nzukọ nakwa n’ozi, nakwa n’ileta ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị n’ebe obibi ha n’ụzọ na-agba ume. Ọ bụrụ na anyị ana-eme nke a, anyị ga-enwe ike ịnagide ọnwụnwa ma ọ bụ mkpa pụrụ iche ma ha bilite.
5 N’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa anyị pụrụ iche ihu ma ọ bụ ọnọdụ ndị anyị nọ na ha, ọ bụrụhaala na anyị nọ Jehova nso, ọ dịghị mgbe ọ ga-ahapụ ma ọ bụ gbahapụ anyị. (Hib. 13:5) Jizọs Kraịst kwere nkwa na ya ga-anọnyere anyị ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe a. (Mat. 28:20) A na-eme ka nkekọ alụmdi na nwunye sikwuo ike site n’iwulite ezinụlọ dị n’otu, bụ́ nke pụrụ iguzogide nrụgide ndị a na-enweta n’ụwa.
6 Ka anyị kpebisie ike ịbịaru nnọọ ndị anyị hụrụ n’anya nso. Na-akpali inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ n’ime ọgbakọ ma na-azụlite ịhụnanya siri ike maka ibe anyị ka ọgwụgwụ nke usoro ihe ochie a na-eru nso.—Hib. 10:23, 24; 1 Pita 4:8.