Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite October 11
Abụ nke 53
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa October. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ọ dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi chee Ụlọ Nche nke October 15 na Teta! nke November 8 n’ihu mmadụ. Mgbe a na-enyefe Teta! nke November 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. Gbaa ndị nkwusa ume ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ mgbe ha na-enyefe magazin ndị ahụ. A pụrụ iji ụzọ iche ihe n’ihu ndị ọzọ dị irè mee ihe.
20 min: Gịnị Ka Anyị Rụzuru n’Afọ Gara Aga? Okwu okenye ga-ekwu dabere n’akụkọ ozi ọgbakọ maka afọ ije ozi 2004. Lekwasị anya n’akụkụ ndị dị mma n’akụkọ ahụ, jaakwa ọgbakọ mma maka ihe ndị dị mma a rụzuru. Mee ka ọrụ ndị ọsụ ụzọ rụsiri ike pụta ìhè. Kwuo otu ebe ma ọ bụ ebe abụọ ọgbakọ pụrụ ilebara anya n’afọ na-abịanụ.
15 min: Na-enwe Obi Ụtọ n’Inyere Ndị Ọzọ Aka. (Jọn 4:34) Ajụjụ ọnụ. Ọ bụ ihe na-enye ọṅụ ịhụ ka ihu mmadụ gbukepụrụ mgbe ọ mụtara eziokwu ndị sitere n’Okwu Chineke. (w94-IB 3/1 p. 29 para. 5-6) Gbaa ndị nkwusa ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ abụọ ma ọ bụ atọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị dị irè n’iji Bible eme ihe n’ozi nakwa n’ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible. Olee otú ha na-esi ewulite mmasị ha hụrụ? Olee ọṅụ ha na-enweta site n’ime otú ahụ? Mee ka ha kọọ ma ọ bụ mee ihe ngosi banyere ahụmahụ ndị ha nwere n’ozi.
Abụ nke 69 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 18
Abụ nke 127
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
18 min: Ndị Ji Anya Ha Na-ahụ Ọrụ Ọma Anyị. (1 Pita 2:12) Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke November 1, 2002, peeji nke 12-14, paragraf nke 14-20. Kpọọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo mmetụta ndị nọ n’ógbè unu nweworo site n’ịhụ ọrụ ọma anyị.
22 min: “Wetara Onye Kere Gị Otuto Site n’Isetịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ.”a Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe.
Abụ nke 165 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 25
Abụ nke 56
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa October. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe (ma ọ bụrụ na ọ dabara n’ókèala unu), mee ihe ngosi nke ụzọ isi chee Ụlọ Nche nke November 1 na Teta! nke November 8 n’ihu mmadụ. Mgbe a na-enyefe Teta! nke November 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche a pụrụ isi mee ihe banyere okwu na-egbochi nkwurịta okwu bụ́ “Enweghị m mmasị ná Ndịàmà Jehova.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Nọgide ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 9-10.
15 min: Mkpa ọgbakọ
18 min: Nye Ihe Àmà Iji Kwadoo Okwu Chineke. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke dabeere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 256-257. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe àmà ndị sitere n’ebe ndị ọzọ na-abụghị Bible nyere ndị mmadụ aka ịghọta na ezi uche dị n’Akwụkwọ Nsọ? Kpọọ ndị na-ege ntị ka ha zaa ajụjụ ndị na-esonụ: Ihe atụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịrụtụ aka n’eluigwe na ala dị ka ihe ndị na-egosi na e nwere Onye Okike? (cl-IB p. 47-56) Olee otú anyị pụrụ isi jiri okwu ndị ọkà mmụta ma ọ bụ ndị ọkachamara mee ihe iji nyere ndị ọzọ aka ịhụ na Bible bụ n’ezie Okwu Chineke? (Broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, peeji nke 14-21) Ihe atụ dị aṅaa ka anyị pụrụ iji nyere ndị ọzọ aka ịhụ ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịrị? (kl-IB p. 75-76) Ahụmahụ ma ọ bụ ihe atụ ndị dị aṅaa ka i jiworo mee ihe n’inyere ndị ọzọ aka ịghọta amamihe dị n’ịgbaso ndụmọdụ Bible?
Abụ nke 62 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 1
Abụ nke 15
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Na November, anyị ga-enyefe Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Tụleghachi ná mkpirikpi, aro ndị a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị nke May 2004, peeji nke 7, banyere inyefe akwụkwọ ahụ, ma mee ihe ngosi nke otu n’ime ụzọ iche ihe n’ihu ndị ahụ. Ọ bụrụ na ụzọ ọzọ dị iche ga-adị irè karị n’ókèala unu, a pụrụ ịtụle ya ma mee ihe ngosi ya. Ọ bụrụ na oge adị, kpọọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha siworo nwee ike iji akwụkwọ a mee ihe n’ozi.
15 min: “Ọrụ Chineke Na-akwado.”b Gbakwụnye ihe e kwuru n’akwụkwọ Proclaimers, peeji nke 547-548.
20 min: “Na-abịaru Nnọọ Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nso.”c Ruo n’ókè oge nyere ohere ya, kpọọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.
Abụ nke 115 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.