Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/05 p. 7
  • Ịmụ Broshuọ Nọrọ na Nche!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmụ Broshuọ Nọrọ na Nche!
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Nta
  • Izu nke May 23
  • Izu nke May 30
  • Izu nke June 6
  • Izu nke June 13
  • Izu nke June 20
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 5/05 p. 7

Ịmụ Broshuọ Nọrọ na Nche!

N’ọgbakọ dị iche iche n’ụwa nile, a ga-amụ broshuọ Nọrọ na Nche! n’izu May 23 ruo June 20, 2005, n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Biko jiri ajụjụ ndị na-esonụ mee ihe mgbe ị na-akwadebe ọmụmụ ihe ahụ na mgbe ị na-eduzi ya. Mgbe a na-amụ ya, a ga-agụpụta ebe e mere ndokwa ịmụ n’izu ahụ, gụọkwa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha ruo ókè oge kwere mee.

Izu nke May 23

◼ Peeji nke 3-4: Olee nke kasị emetụta ndụ gị n’ime ọnọdụ ndị e depụtara ebe a? Olee ihe na-egosi gị na ọnọdụ ndị a abụghị nnọọ ihe na-adịghị emekebe nke mere n’ógbè unu?

◼ Peeji nke 5: Gịnị na-eme ka i kwenyesie ike na Chineke na-eche banyere anyị n’ezie? Gịnị pụrụ igosi ókè anyị na-echeru banyere Chineke na ihe ndị ọ na-emere anyị?

◼ Peeji nke 6-8: Gịnị ka Matiu 24:1-8, 14 na-ekwu banyere ihe ọnọdụ ụwa nọ na ya ugbu a pụtara? Dị ka e gosiri na 2 Timoti 3:1-5, olee oge anyị na-ebi na ya ugbu a? Gịnị ka ugbu a bụ ụbọchị ikpeazụ ya? Gịnị na-eme ka i kwenyesie ike na Bible bụ Okwu Chineke n’ezie? Gịnị bụ Alaeze ahụ nke anyị na-ekwusa banyere ya?

◼ Peeji nke 9-10: N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iji nlezianya na-atụle mkpebi ndị anyị na-eme kwa ụbọchị na ihe ndị anyị na-ebute ụzọ ná ndụ anyị? (Rom 2:6; Gal. 6:7) Ka ị na-atụle ajụjụ ndị dị na peeji nke 10, olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị na-echeta bụ́ ndị kwesịrị imetụta ihe ị na-eme?

Izu nke May 30

◼ Peeji nke 11: Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka anyị onwe anyị n’otu n’otu tụlee ajụjụ ndị a jụrụ na peeji a? (1 Kọr. 10:12; Efe. 6:10-18) Gịnị ka ihe anyị zara n’ajụjụ ndị a na-ekpughe banyere otú anyị si jiri ndụmọdụ Jizọs nyere na Matiu 24:44 kpọrọ ihe?

◼ Peeji nke 12-14: Gịnị ka “oge awa nke ikpe” e kwuru okwu ya ná Mkpughe 14:6, 7 pụtara? Gịnị ka ‘ịtụ egwu Chineke na inye ya otuto’ pụtara? Gịnị bụ Babilọn Ukwu ahụ, gịnịkwa ga-eme ya? Olee ihe ọ dị mkpa ka anyị mee ugbu a banyere Babilọn Ukwu ahụ? Oleekwa ihe ọzọ ga-eme n’oge awa nke ikpe ahụ e buru amụma ya? Olee mmetụta amaghị “ụbọchị ma ọ bụ awa” Chineke ga-emezu ihe o kpere n’ikpe, bụ́ nke e buru n’amụma, kwesịrị inwe n’ebe anyị nọ? (Mat. 25:13)

◼ Peeji nke 15: Gịnị bụ ihe iseokwu banyere ọbụbụeze, oleekwa otú o si metụta anyị n’otu n’otu?

◼ Peeji nke 16-19: Gịnị bụ “eluigwe ọhụrụ” na “ụwa ọhụrụ”? (2 Pita 3:13) Ònye na-ekwe nkwa ihe ndị a? Olee mgbanwe ndị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ ga-eweta? Anyị nile n’otu n’otu, ànyị ga-erite uru na ha?

Izu nke June 6

◼ Peeji nke 20-21: Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa banyere mgbapụ ka Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya nke narị afọ mbụ? (Luk 21:20, 21) Olee mgbe ha nwere ohere gbapụ? Gịnị mere o ji dị mkpa na ha ga-agbapụ n’egbughị oge? (Mat. 24:16-18, 21) Gịnị mere ọtụtụ mmadụ ji eleghara ịdọ aka ná ntị anya? Olee otú ọtụtụ puku mmadụ nọ na China na Philippines si rite uru n’ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị a pụrụ ịdabere na ya? N’ihi gịnị ka o ji dị ngwa ugbu a ọbụna karị ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Bible na-enye banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a? N’ihi otú ọnọdụ a sị dị ngwa, olee ibu ọrụ anyị nwere? (Ilu 24:11, 12)

◼ Peeji nke 22-23: N’afọ 1974 n’Australia nakwa na n’afọ 1985 na Colombia, gịnị mere ọtụtụ ndị ji leghara ịdọ aka ná ntị banyere mkpamkpa na-achọ ịkpa anya, gịnịkwa ka nke ahụ kpataara ha? Olee ihe i chere ị gaara eme ma ọ bụrụ na ị nụrụ ịdọ aka ná ntị ndị a, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? Gịnị pụrụ igosi ma ànyị gaara aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ e nyere n’ụbọchị Noa? N’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji chọọ ibi na Sọdọm nakwa n’obodo ndị gbara ya gburugburu? Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịtụgharị uche n’ihe mere na Sọdọm?

Izu nke June 13

◼ Peeji nke 24-27: Jiri “Ajụjụ Maka Ihe Ọmụmụ” bụ́ nke dị na peeji nke 27 mee ihe.

Izu nke June 20

◼ Peeji nke 28-31: Jiri “Ajụjụ Maka Ihe Ọmụmụ” bụ́ nke dị na peeji nke 31 mee ihe.

Anyị ịtụle broshuọ a ga-enyere anyị aka ‘ịnọ na nche’ ma gosi na anyị bụ ndị dị njikere. Ka ozi ọma anyị na-ekwusara ọhaneze na-egosipụta mgbe nile na e kwesịghị igbu oge ime ihe ahụ mmụọ ozi kwuru, nke bụ́: “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe sitere n’aka ya abịawo.”—Mat. 24:42, 44; Mkpu. 14:7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya