Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/05 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite September 12
  • Izu Na-amalite September 19
  • Izu Na-amalite September 26
  • Izu Na-amalite October 3
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 9/05 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Ihe ịrịba ama: Ozi Alaeze Anyị ga-enwe usoro ihe omume Nzukọ Ije Ozi maka izu ọ bụla n’oge mgbakọ distrikti. Ọgbakọ dị iche iche pụrụ ime mgbanwe dị ka o si dị mkpa iji nye ohere maka ịga Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi.” N’ebe o kwesịrị ekwesị, jirinụ minit 15 ná Nzukọ Ije Ozi ikpeazụ unu ga-enwe tupu unu agawa mgbakọ tụleghachi ndụmọdụ na ihe ncheta ndị sitere n’ihe ntinye nke ọnwa a, bụ́ ndị metụtara ọgbakọ unu. Otu ọnwa ma ọ bụ abụọ unu lọtasịrị mgbakọ a, wepụtanụ minit 15 ruo 20 ná Nzukọ Ije Ozi (ikekwe na-eji oge e nyere maka ịtụle mkpa ọgbakọ) iji tụleghachi isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ bụ́ ndị ndị nkwusa chọpụtaworo na ọ na-enyere ha aka n’ozi ubi. Akụkụ a pụrụ iche ná Nzukọ Ije Ozi ga-enye anyị ohere ịkọwa otú anyị si na-eji ihe ndị anyị mụtara ná mgbakọ distrikti na-eme ihe nakwa otú o siworo na-enyere anyị aka ịrụpụtakwu ihe n’ozi anyị.

Izu Na-amalite September 12

Abụ nke 29

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa September. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke September 15 na Teta! nke October 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke October 8, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. Otu onye okenye ga-eme otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, onye na-eto eto emee nke ọzọ. Mgbe e mesịrị nke ọ bụla n’ime ihe ngosi ndị ahụ, mee ka ihe ụfọdụ dị mma e gosiri na ya pụta ìhè.

15 min: “Jiri Oge Gị Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya.”a Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha si edokwa oge kwa ụbọchị iji na-agụ Bible. Gbaa ezinụlọ na ndị mmadụ n’otu n’otu ume iji ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke May 2005 na-ahazi oge maka ihe ime mmụọ.

20 min: “A Ga-azọpụta Ụdị Mmadụ Nile.”b Kwuo ụzọ ndị a pụrụ isi tinye ihe ndị e kwuru n’isiokwu ahụ n’ọrụ n’ókèala unu.

Abụ nke 110 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 19

Abụ nke 168

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee isi ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ si n’alaka ụlọ ọrụ, bụ́ nke dị na peeji mbụ nke Ozi Alaeze Anyị a.

20 min: Iji Magazin Eme Ka A Nụrụ Ozi Ọma Ahụ. N’ọnwa October, anyị ga-enyefe Ụlọ Nche na Teta! N’okwu mmalite gị, tụlee aro ndị na-esonụ a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị nke February 2005, peeji nke 8, paragraf nke 3-6: (1) Na-enyefekọta magazin ọnụ. (2) Na-ewepụta otu ụbọchị kwa izu iji sonye n’ọrụ ikesa magazin. (3) Na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke magazin ole ị ga-enyefe n’ọnwa. (4) Na-eji ohere ọ bụla kwesịrị ekwesị na-enyefe magazin. (5) Na-enyefe magazin ochie ndị i nwere. Kwuo otú a pụrụ isi tinye aro ndị a n’ọrụ n’ókèala ọgbakọ unu. E mesịa nke ahụ, jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 nke Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa a (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke October 1 na Teta! nke October 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke October 8, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụkwara iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. Tụkwasị na nke ahụ, dọrọ uche gaa n’isiokwu ndị ọzọ dị n’ime magazin ndị ahụ bụ́ ndị pụrụ ịdọrọ mmasị ndị bi n’ókèala unu. Meekwa ihe ngosi nke ụzọ a pụrụ isi jiri otu n’ime isiokwu ndị ahụ nyefee magazin. Mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla, mee ka ihe ụfọdụ dị mma e gosiri na ya pụta ìhè.

15 min: “Nọgidenụ Na-ewulirịta Ibe Unu Elu.”c Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha siworo rite uru site ná nchegbu ndị ọzọ ji ịhụnanya na-enwe n’ebe ha nọ.

Abụ nke 199 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 26

Abụ nke 122

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa September.

30 min: “Keleenụ Jehova n’Etiti Mkpọkọta Bara Ụba.”d Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ya. Kwuo mgbakọ e kenyere ọgbakọ unu ịga. Mụọnụ paragraf ndị ahụ nwere nọmba otú ahụ e si amụ Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Họpụta otu onye ka ọ na-agụpụta paragraf ndị ahụ. Tụlee igbe bụ́ “Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Mgbakọ Distrikti.”

Abụ nke 8 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 3

Abụ nke 54

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

18 min: “Nyere Ndị Ọzọ Aka ‘Isi n’Obi Ha Na-erube Isi.’”e Ruo ókè oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

22 min: “Ugbu A Bụ Oge Ime Nkwusa!”f Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye ọsụ ụzọ oge nile ma ọ bụ abụọ kwuo mgbanwe ndị ha meworo iji na-asụ ụzọ na ngọzi ndị ha nwetaworo n’ihi ya.

Abụ nke 197 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

f Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya