Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/05 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite November 14
  • Izu Na-amalite November 21
  • Izu Na-amalite November 28
  • Izu Na-amalite December 5
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 11/05 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite November 14

Abụ nke 220

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa November. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke November 15 na Teta! nke December 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke December 8, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche a pụrụ isi zaghachi mgbe onye nwe ụlọ sịrị, “Enweghị m mmasị n’okpukpe.”—Lee Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, p. 9.

15 min: Onyinye Ndị Na-eme Chineke Obi Ụtọ. Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke November 1, 2005, peeji nke 26-30.

20 min: “Na-akọsa Ebube Jehova.”a Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị dị mkpirikpi banyere otú omume ọma pụrụ isi meghere anyị ụzọ maka ịgba àmà.

Abụ nke 24 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 21

Abụ nke 40

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

20 min: Ime Ka Jehova Bụrụ Chineke Gị. Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke April 1, 2005, peeji nke 25-28. Kwuo ụzọ anyị pụrụ isi tinye ihe ndị a pụrụ ịmụta n’ihe nlereanya Ebreham, Devid, na Ịlaịja, n’ọrụ.

15 min: “Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịdị Na-eleru Anya.”b Gụnye ihe ngosi nke ebe onye nkwusa nọ na-achọpụta ihe na-egosi na onye nwe ụlọ nwere mmasị ma kwuruzie okwu ya gaa n’ihe ahụ ọ chọpụtara.

Abụ nke 67 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 28

Abụ nke 7

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa November. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke December 1 na Teta! nke December 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke December 8, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. Mee ka e kwuo banyere ndokwa maka onyinye afọ ofufo.

15 min: “Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Nye Aka?” Okwu. Nye ihe atụ nke mgbalị ndị ohu Jehova meworo iji gbatara ndị kwere ekwe ibe ha nọ n’oké mkpa ọsọ enyemaka. (Lee Teta! nke August 8, 2003, p. 22-27; nke December 8, 2002, p. 19-24; na nke October 22, 2001 (Bekee), p. 23-27. A pụkwara iji ihe atụ ndị sitere n’ebe ndị ọzọ n’akwụkwọ anyị mee ihe.) Nke ahụ gasịa, tụlee isi ihe ndị sitere n’isiokwu ahụ dị na peeji nke 7 n’Ozi Alaeze Anyị a. Mee ka ọ pụta ìhè na ọ bụrụ na ọ dị onye chọrọ inye onyinye maka ọrụ ebere nakwa iji gbatara ndị ọzọ ọsọ enyemaka, ọ kasị mma ka o nye onyinye ahụ dị ka onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ.

18 min: Ikwusa Ozi Ọma ahụ n’Ọnwa December. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Jiri minit ise mbụ ị malitere okwu gị tụlee n’ụzọ dị nkenke, isi ihe ndị na-esonụ bụ́ ndị si n’isiokwu bụ́ “Ụzọ A Ga-esi Na-eji Ụzọ Ndị A Tụrụ Aro Ha Isi Na-ezi Ozi Ọma Eme Ihe,” bụ́ nke dị na peeji nke 8 n’Ozi Alaeze Anyị nke January 2005: (1) Okwu anyị ga na-aka adị irè ma ọ bụrụ na anyị ejiri okwu nke aka anyị mee ihe. (2) Anyị aghaghị ichezi echiche nke ọma ma mee ka ụzọ anyị si ezi ozi ọma kwekọọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala anyị. (3) Ọ dị mkpa ka anyị buru n’uche ụzọ e si zụlite ndị nọ n’ókèala anyị na ụzọ ha si eche echiche. (4) Anyị kwesịrị ịgụ isiokwu anyị bu n’obi iji mee ihe n’ozi nke ọma ma chọpụta isi ihe ndị dị n’ime ha bụ́ ndị pụrụ ịkpali mmasị. (5) Ọ bụghị iwu na anyị ga-ejirịrị nanị ụzọ ndị ahụ a tụrụ aro ha isi na-ezi ozi ọma eme ihe. Ị tụlesịa ha, kwuo otú a pụrụ isi tinye ha n’ọrụ mgbe a na-enyefe akwụkwọ a ga-eji jee ozi n’ọnwa December. Ị pụrụ iji aro ndị a tụrụ n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2005 ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu mee ihe. Jiri otu aro ma ọ bụ abụọ mee ihe ngosi.

Abụ nke 123 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 5

Abụ nke 38

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu.”c Mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere n’akụkụ nke 1 na nke 2 nke ihe ntinye. A pụkwara ịtụle Ozi Alaeze Anyị nke August 2004, peeji nke 1. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịkwadebe nke ọma mgbe ọ bụla ị na-eduzi ọmụmụ Bible? Olee otú e si eme ya? Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ otú ha siworo tinye aro ndị ahụ a tụrụ n’ọrụ. Mechie site n’ikwu okwu banyere igbe ahụ dị n’elu peeji nke mbụ nke ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị a.

20 min: “Ihe Ozi Anyị Na-arụzu.”d Mgbe ị na-atụle paragraf nke 5, gụnye ihe ndị e kwuru n’Ụlọ Nche nke February 15, 2004, peeji nke 32.

Abụ nke 26 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya