Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/06 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite n’April 10
  • Izu Na-amalite n’April 17
  • Izu Na-amalite n’April 24
  • Izu Na-amalite na May 1
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 4/06 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite n’April 10

Abụ nke 49

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa April. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke April 15 na Teta! nke April-June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, mee ka onye nkwusa nyefeekwa akwụkwọ Bible Na-akụzi n’aka onye nwe ụlọ nke gosiri mmasị pụrụ iche n’ozi Bible.

Minit 15: “Otú E Si Anọgide Na-anụ Ọkụ n’Obi.”a Gụnye ihe e kwuru n’Ụlọ Nche nke June 15, 2002, peeji nke 14, paragraf nke 13.

Minit 20: “Ì Nwere Ike Ịhazigharị Oge Gị?”b Gosi otú a pụrụ isi tinye ihe a na-ekwu n’ọrụ n’ọgbakọ unu. Kwuo ndokwa ọgbakọ mere maka ịgba àmà n’oge uhuruchi.

Abụ nke 13 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite n’April 17

Abụ nke 104

Minit 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Mee ka a mara ndokwa ọgbakọ mere maka okwu ihu ọha pụrụ iche. Gbaa mmadụ nile ume ịnọgide na-eji ihe dị na peeji ikpeazụ nke Ụlọ Nche nke April 1 na-akpọ ndị bịara ihe omume ahụ e ji echeta ọnwụ Jizọs, ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible, na ndị ọzọ nwere mmasị, òkù ịbịa gee okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche. N’ụzọ dị nkenke, kọọ ahụmahụ abụọ ma ọ bụ atọ e nwetara n’iji Ụlọ Nche a kpọọ ndị mmadụ òkù ịbịa gee okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche.

Minit 12: Mkpa ọgbakọ.

Minit 18: “Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Mee Ihe Na-ewute Mmụọ Nsọ Chineke, Ebe Ọ Na-abụghị Onye?” Okwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke May 15, 2004, peeji nke 29-30.

Abụ nke 138 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite n’April 24

Abụ nke 66

Minit 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. N’ọnwa May, anyị ga-anọgide na-enyefe Ụlọ Nche na Teta! Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke May 1 na Teta! nke April-June. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. E mesịa ihe ngosi ndị ahụ, dọrọ uche gaa n’isiokwu ndị ọzọ dị na magazin ndị ahụ, bụ́ ndị pụrụ ịdọrọ mmasị ndị bi n’ókèala unu.

Minit 30: “Mgbakọ Distrikti ‘Nnapụta Dị Nso!’ nke Ndịàmà Jehova nke 2006.”c Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ya. Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 1, gụọ akwụkwọ ozi nke April 1, 2006, bụ́ nke e ji kenye ọgbakọ unu mgbakọ distrikti unu ga-aga. Gbaa mmadụ nile ume ịmalite ozugbo o kwere mee kwadowe maka mgbakọ distrikti.

Abụ nke 48 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na May 1

Abụ nke 211

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa April. Tụlee igbe dị na peeji nke 6, nke isiokwu ya bụ “Ị̀ Na-ajụ Ma È Nwere Ndị Ọzọ Ga-enwe Mmasị Ka A Mụwara Ha Ihe?” nke dị na peeji nke 7.

Minit 15: “Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịdị Na-ele Onye Ị Na-agwa Okwu Anya n’Ihu.”d Mee ihe ngosi nke ebe onye nkwusa legidere mmadụ anya n’ihu n’ebe ọhaneze na-anọkarị, malite ịgwa ya okwu, ma ziekwa ya ozi ọma.

Minit 20: Na-atụgharị Uche n’Ọrụ Jehova. (Ọma 77:12) Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere na 2006 Yearbook. Tụlee isi ihe ndị na-agba ume dị n’akwụkwọ ozi ahụ si n’aka Òtù Na-achị Isi, bụ́ nke e zitekọrọ ya na Ozi Alaeze Anyị a. Tụlee ihe e dere n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Bible Translation.” (Nsụgharị Bible) (p. 10-11) Kọọ ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ merenụ n’afọ gara aga nakwa ahụmahụ ndị a kọrọ na ha mere n’afọ gara aga. (p. 6-64) Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ndị masịrị ha bụ́ ndị ha gụtara na 2006 Yearbook. Gbaa mmadụ nile ume iji ya nyere ndị ha na-eduziri ọmụmụ Bible aka inwe ekele maka nzukọ Jehova.

Abụ nke 82 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya