Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/06 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na December 11
  • Izu Na-amalite na December 18
  • Izu Na-amalite na December 25
  • Izu Na-amalite na January 1
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 12/06 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na December 11

Abụ nke 174

Minit 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa December. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche.” Kwuo ụbọchị ọgbakọ unu ga-aga mgbakọ pụrụ iche ma ọ bụrụ na e meela ka unu mara banyere ya. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche December 15 na Teta! October–December. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi otú a ga-esi azaghachi mgbe onye nwe ụlọ kwuru, sị, “Enweghị m mmasị.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, p. 8.

Minit 15: Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2007. Okwu ga-enwe ajụjụ ọnụ nke onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Tụlee isi ihe ndị dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke October 2006 bụ́ ndị ọ dị mkpa ka ọgbakọ unu tinye n’ọrụ. Mee ka ọgbakọ mara na onye nlekọta ụlọ akwụkwọ adịghị ekwu nkà okwu onye mmụta na-arụ ọrụ na ya tupu ya akpọpụta onye mmụta. Ebe ọ bụ na anyị ga-agụchapụ Akwụkwọ Nsọ Hibru site n’Aịsaịa isi 24 ruo n’isi ikpeazụ nke Malakaị n’ọgụgụ Bible dịịrị izu n’afọ 2007, afọ a ga-enye ụmụnna ndị e kenyere isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible nakwa ụmụnna ndị ga-aza ajụjụ banyere ihe ha mụtara na ya ohere iji akwụkwọ anyị ndị kọwara akwụkwọ amụma Bible ndị a mee ihe. Gbaa ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ajụjụ ọnụ. Si n’etiti ndị na-esonụ họrọ ndị ị ga-agba ajụjụ ọnụ: onye mmụta ọhụrụ, onye mmụta na-eto eto nke na-enwe ezigbo ọganihu, na onye mmụta bụ́ aka ochie. Gwa ha ka ha kwuo mmetụta ụlọ akwụkwọ a nwerela n’ozi ọma ha na-eje nakwa ná mmekọrịta ha na Chineke. Gbaa mmadụ nile ume iji ịdị uchu na-eme ihe omume e kenyere ha, iji ya na-ekere òkè n’ịza ajụjụ banyere ihe ha gụtara n’ọgụgụ Bible dịịrị izu, na iji ya na-etinye aro ndị a na-atụ kwa izu n’ọrụ, bụ́ ndị na-esi n’akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.

Minit 15: “Ahapụla Ịhụnanya ahụ I Nwere na Mbụ.”a Dị ka oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

Abụ nke 193 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na December 18

Abụ nke 150

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo ndokwa pụrụ iche e mere maka ịga ozi ubi na December 25 nakwa na January 1.

Minit 15: “Gaghachi na Nke Ndị Nile Gositụrụ Mmasị.”b Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha sirila nwee ike inweta nọmba fon ma ọ bụ adres nke ndị nwere mmasị ha ziri ozi ọma n’oge ha na-anọghị n’ozi ma ọ bụ n’oge ha na-agba àmà n’okporo ámá. Gwakwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla bụ́ ịgba ha nwetara mgbe ha gara nletaghachi na nke ndị dị otú ahụ. Ị pụrụ ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’ime ndị ị ga-agba ajụjụ ọnụ agwa tupu oge eruo.

Minit 20: “Anyị Pụrụ Ịnagide Ọnwụnwa Ọ Bụla!” Okwu nke ga-adabere n’isiokwu dị na peeji nke 30-31 nke Ụlọ Nche June 15, 2005. Mee ka okwu a bụrụ nnọọ ihe agbamume nye mmadụ nile, ebe ọ bụ na anyị nile na-enweta ụdị ọnwụnwa dị iche iche ná ndụ.

Abụ nke 182 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na December 25

Abụ nke 210

Minit 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit,” ma kwuo ụbọchị ọgbakọ unu ga-aga mgbakọ sekit ma ọ bụrụ na unu amarala ya. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche January 1 na Teta! January–March. Ná ngwụsị ihe ngosi nke ọ bụla, jụọ onye nwe ụlọ ajụjụ ga-akpali ya iche echiche nke ị pụrụ iji akwụkwọ Bible Na-akụzi zaa n’oge ọzọ ị gara na nke ya.

Minit 15: Mkpa ọgbakọ.

Minit 15: Ịkọ Banyere Ọganihu nke Ozi Ahụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, malite n’isiokwu nta nke abụọ dị na peeji nke 83 ruo na peeji nke 91.

Abụ nke 72 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na January 1

Abụ nke 158

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa December.

Minit 35: “Olee Ihe M Kwesịrị Ikpebi Ma A Chọọ Iji Ọbara M Gwọọ M Ọrịa Nakwa Ma A Chọọ Iji Ihe E Si n’Ihe Ndị Bụ́ Isi Mejupụtara Ọbara Nweta, Gwọọ M Ọrịa?” Ntụle ajụjụ na azịza. Kwuo okwu mmeghe dị mkpirikpi nke ga-adabere na paragraf nke mbụ. Gaa n’ihu site n’ịjụ ajụjụ atọ ndị ahụ e depụtara ná mkpụrụ akwụkwọ okpotokpo ma kwurịtanụ ihe bụ́ azịza ha. Gị na ndị na-ege ntị tụlee “Ihe Ị Ga-eji Mee Ihe,” nke 1 na nke 2. Mee ka ihe Onye Kraịst na-agaghị anabata pụta ìhè, meekwa ka a mara ndị nke o kwesịrị ikpebiri onwe ya ma ọ̀ ga-anabata ma ọ bụ na ọ gaghị anabata. Hụ na i ji akwụkwọ Ntụziaka Maka Idejupụta Kaadị DPA (nke e degharịrị edegharị). Kọwaa otú e kwesịrị isi edejupụta kaadị DPA, ma gbaa onye na-edejupụtabeghị nke ya ume ka o dejupụta ya. Kwuo na ndị nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwesịrị inyere ndị nkwusa nọ n’ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ha aka idejupụta kaadị DPA ha. Ndị dejupụtarala ya mbụ ekwesịghị idejupụta ya ọzọ, ọ gwụla ma ọ bụ na nke ahụ ha dejupụtara adịghịzi mma.

Abụ nke 120 na ekpere mmechi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya