Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/07 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 1/07 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1991. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! February 1-18: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ merela ochie unu nwere n’ọgbakọ unu. February 19–March 18: A ga-eme Mkpọsa Pụrụ Iche maka ikesa Akụkọ Alaeze nke 37, nke isiokwu ya bụ, “A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!” March 19-31: Nyefee akwụkwọ Bible Na-akụzi ma gbalịsie ike iji ya duziwere ndị i nyefere ya ọmụmụ Bible. April na May: A ga-enyefe Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, nke gụnyere ndị bịara ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike inyefe ha akwụkwọ Bible Na-akụzi. Nzube anyị ji enyefe ha ya kwesịrị ịbụ iji ya duziwere ha ọmụmụ Bible.

◼ Malite na February, n’agafeghịkwa March 4, isiokwu okwu ihu ọha ọhụrụ nke ndị nlekọta sekit ga-ekwu ga-abụ “Ụwa Ọhụrụ Chineke—Ònye Ga-eru Eru Ịba na Ya?”

◼ A ga-atụle vidio bụ́ Young People Ask—What Will I Do With My Life? ná Nzukọ Ije Ozi n’ọnwa April. Ọ bụrụ e nwee onye chọrọ ya, ọ pụrụ isi n’aka ọgbakọ tụọ ọda ya ngwa ngwa o kwere mee.

◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa ndị kwesịrị ekwesị iji cheta ọnwụ Jizọs n’afọ a na Monday, April 2, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu pụrụ ịmalite mgbe anyanwụ na-adabeghị, mbugharị nke ihe nnọchianya ndị ahụ ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla meere onwe ya ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs. Otú ọ dị, nke a nwere ike ọ gaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ikekwe otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ebe ọzọ ha ga-eji mee ihe n’uhuruchi ahụ. N’ebe o kwere mee, anyị na-atụ aro ka a nọọ, ọ dịkarịa ala, minit 40 mgbe otu ọgbakọ mesịrị ihe omume nke ha tupu ọgbakọ ọzọ ga-eji otu ụlọ nzukọ ahụ mee ihe amalite nke ha. Nke a ga-eme ka mmadụ nile nwee ike irite uru zuru ezu n’ihe omume ahụ. E kwesịkwara ichebara ụgbọala na ebe a ga-adọba ha echiche, gụnyere ibusa na iburu ndị mmadụ. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-akasị mma n’ógbè ha.

◼ Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ na e nwere Pioneer Appointment Letter (Akwụkwọ Ozi E Ji Ahọpụta Ndị Ọsụ Ụzọ) (S-202) maka onye ọsụ ụzọ oge nile ọ bụla nọ n’ọgbakọ ha. Ọ bụrụ na unu enweghị ya, biko detaranụ alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ maka ya.

◼ Compact Disc Ndị Ọhụrụ E Nwere:

Appreciating Our Spiritual Heritage (Ihe Nkiri, ọ dị otu disc)—French

Families—Make Daily Bible Reading Your Way of Life! (Ihe Nkiri, ọ dị otu disc)—French

Marked for Survival (Ihe Nkiri, ọ dị otu disc)—French

My Book of Bible Stories (ọ dị disc 12)—French

The Greatest Man Who Ever Lived (ọ dị disc 12)—Bekee

The Greatest Man Who Ever Lived (ọ dị disc 12)—French

Warning Examples for Our Day (Ihe Nkiri, ọ dị otu disc)—French

Why Respect Theocratic Arrangements? (Ihe Nkiri, ọ dị otu disc)—French

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya