Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite n’August 13
Abụ nke 20
10 Nkeji: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa August. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke asatọ, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche August 15 na Teta! July-September. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro mbụ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi. Gwa onye nkwusa ga-eme otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ ka o jiri otu n’ime aro ndị ahụ dị na peeji nke atọ, paragraf nke atọ nke Ozi Alaeze Anyị a, jụọ otu ajụjụ ọ ga-aza ma ọ gaa nletaghachi.
20 Nkeji: Irite Uru Site n’Ido Onwe Anyị n’Okpuru Ọchịchị Chineke. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ, nke ga-adabere n’isi nke iri na ise nke akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.
15 Nkeji: “Ifekọ Jehova Ọnụ Dị Ka Ezinụlọ.”a Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ uru ha riterela n’ijekọ ozi ọma ọnụ dị ka ezinụlọ. A pụrụ ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’ime ha n’oge ka ha kwadebe ihe ha ga-ekwu.
Abụ nke 48 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’August 20
Abụ nke 100
5 Nkeji: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 Nkeji: “Gosi na I Nwere Obi Ekele Maka Ndokwa Jehova Mere Iji Nyere Gị Aka Ịmụta Otú E Si Agụ na Otú E Si Ede.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ, bụ́ nke onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu.
10 Nkeji: Malite Iduzi Ọmụmụ Bible n’Ụbọchị Mbụ Ị Gara na nke Mmadụ n’Ọnwa September. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. N’ọnwa September, anyị ga-enyefe akwụkwọ Bible Na-akụzi, anyị ga-agbalịkwa ka anyị na onye nwe ụlọ tụlee paragraf ole na ole n’ụbọchị mbụ anyị gara na nke ya. Tụlee aro ndị a tụrụ n’ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nke March 2006, meekwa otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke otú e nwere ike isi malite iduzi ọmụmụ Bible n’ụbọchị mbụ a gara na nke mmadụ.
15 Nkeji: “Otú Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Si Enyere Anyị Aka.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke ise, kwuo ihe ụfọdụ e kwuru n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke iri anọ na otu, paragraf nke abụọ.
Abụ nke 6 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’August 27
Abụ nke 98
10 Nkeji: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro a tụrụ na peeji nke asatọ, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche September 1 na Teta! July-September. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro nke abụọ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi.
10 Nkeji: ‘Meenụ Ndị Enyi Site n’Akụ̀ nke Ajọ Omume.’ Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke December 1, 1994, peeji nke iri na atọ ruo nke iri na asatọ.
25 Nkeji: “Ihe Mgbaru Ọsọ Magburu Onwe Ya Maka Afọ Ije Ozi Ọhụrụ.”c Gbaa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka na nso nso a ajụjụ ọnụ. Olee otú ha si hazigharịa ihe omume ha iji rụọ ya? Olee uru ndị ha ritere na ya? Ọ bụrụ na e nwere onye ndị ezinụlọ ya nyeere aka ma kwadoo ka ọ rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, onye ahụ nwere ike iso ná ndị ị ga-agba ajụjụ ọnụ. Mgbe a na-atụle paragraf nke itoolu, kwuo mgbe ọzọ onye nlekọta sekit ga-eleta ọgbakọ unu ma ọ bụrụ na e ziterela unu ozi.
Abụ nke 196 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na September 3
Abụ nke 50
10 Nkeji: Ịma ọkwa ọgbakọ na ịma ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa August.
15 Nkeji: “Anyị Ji Ihe Ùgwù Ndị Anyị Nwere Kpọrọ Ihe!”d Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’isiokwu a, dabere n’otú oge e nwere hà.
20 Nkeji: “Otú Anyị Ga-esi Malite Iduziri Ndị Anyị Nyefere Magazin Ọmụmụ Bible.”e Jiri otu n’ime aro ndị a tụrụ na paragraf nke abụọ mee ihe ngosi dị mkpirikpi. Chetara ndị na-ege ntị na mmadụ nwere ike ịgụrụ ọmụmụ Bible ma ọ bụrụ na onye ahụ eduzie ọmụmụ Bible ahụ ugboro abụọ n’agụnyeghị nke ahụ o ji gosi onye nwe ụlọ otú e si amụ Bible, nakwa ma ọ bụrụ na o yie ka ọmụmụ ihe ahụ ọ̀ ga-aga n’ihu.
Abụ nke 2 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
d Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
e Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.