Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Burunụ nke a n’uche: N’Ozi Alaeze Anyị, a ga-enwe usoro ihe omume maka Nzukọ Ije Ozi kwa izu n’oge mgbakọ distrikti. Ọgbakọ dị iche iche ga-eme mgbanwe dị ka o kwesịrị ka ha wee nwee ohere ịga Mgbakọ Distrikti “Na-eso Kraịst!” Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ná Nzukọ Ije Ozi ikpeazụ unu ga-enwe tupu unu agawa mgbakọ, jirinụ nkeji iri na ise tụleghachi ndụmọdụ na ihe ndị a ga-echeta banyere mgbakọ distrikti ndị metụtara ọgbakọ unu, bụ́ ndị pụtara n’ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa a. Otu ọnwa ma ọ bụ abụọ unu lọtasịrị mgbakọ unu, wepụtanụ ihe dị ka nkeji iri na ise ma ọ bụ nkeji iri abụọ ná Nzukọ Ije Ozi (ma eleghị anya oge e dokwara iji tụlee mkpa ọgbakọ) iji tụleghachi isi ihe e kwuru ná mgbakọ, bụ́ nke ndị nkwusa chọpụtara na ọ ga-enyere ha aka n’ozi ha. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ihe omume a. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha si na-etinye ihe ndị ha mụtara n’ọrụ ná mgbakọ a n’ozi ha ma ọ bụ atụmatụ ha mere iji tinye ya n’ọrụ n’ozi ha.
Izu Na-amalite na September 10
Abụ nke 225
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa September. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke asatọ, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche September 15 na Teta! July-September. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro mbụ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi. Ma ọ̀ bụ Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! ka a na-enyefe, a ga-enyefekọta ha abụọ ọnụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu magazin ka a ga-ekwu okwu maka ya.
Nkeji 15: Igbe Ajụjụ. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Ọ bụ okenye ga-eme ya. Dabere n’otú oge e nwere hà, gụọ ma tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e dere n’isiokwu a.
Nkeji 20: “Mbọ A Na-agbasi Ike n’Ụwa Dum Iji Kpọsaa Mgbakọ Distrikti ‘Na-eso Kraịst!’”a Mgbe unu na-atụle paragraf nke atọ, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ pụrụ iche e nwere n’ógbè unu mgbe a na-ekesa akwụkwọ e ji kpọọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa mgbakọ distrikti n’afọ gara aga ma ọ bụkwanụ kwuo ihe e kwuru na 2007 Yearbook, malite na peeji nke asaa ruo n’isiokwu nta nke dị na peeji nke iri.
Abụ nke 43 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na September 17
Abụ nke 60
Nkeji 5: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Nkeji 20: “Ṅomie Ihe Nlereanya Jizọs.”b Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ otú ha si rite uru n’ezi ihe nlereanya nke ndị ọzọ.
Nkeji 20: Òtù Ụmụnna Dị n’Otu. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-adabere n’isi nke iri na isii nke akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.
Abụ nke 74 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na September 24
Abụ nke 162
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo.
Nkeji 12: “Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Akwụkwọ Anyị Anya na Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-eji Ha Eme Ihe.”c
Nkeji 23: “Na-eso Kraịst Site n’Igosi Nkwanye Ùgwù.”d Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ya. Kwuo mgbe e kenyere ọgbakọ unu ịga mgbakọ na ebe unu ga-aga ya. Tụlee igbe bụ́ “Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Mgbakọ Distrikti.”
Abụ nke 44 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’October 1
Abụ nke 88
Nkeji 8: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa September.
Nkeji 12: Akwụkwọ Ozi nke Si n’Alaka Ụlọ Ọrụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-adabere n’akwụkwọ ozi nke dị n’ihu Ozi Alaeze Anyị a.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee n’Afọ Gara Aga? Onye nlekọta ije ozi ga-atụle otú ọgbakọ si mee n’afọ ije ozi gara aga. Ọ ga-elekwasị anya n’ihe ndị dị mma a rụzuru n’ozi anyị. Jaa ụmụnna mma otú o kwesịrị. Kwuo otu ebe ma ọ bụ abụọ e kwesịrị ilebara anya n’afọ ije ozi ọhụrụ a. Kwuo okwu banyere otú ndị ọsụ ụzọ si jee ozi. Jaa ha mma maka ọrụ ọma ha rụrụ. Kọọ ihe ọma ndị a rụpụtara ná mgbalị e mere inyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka.
Nkeji 15: “Gbalịa Ka I Ruo Eruo Ịrụkwu Ọrụ Ndị Ọzọ Metụtara Ozi Anyị.”e Gwa ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị na-agbalị iru eru ka ha kwuo otú ha si na-achọ ụzọ ha ga-esi ruo eruo ịrụkwu ọrụ ndị ọzọ metụtara ozi ha. E nwere ike ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’ime ha n’oge ka ha kwadebe ihe ha ga-ekwu.
Abụ nke 102 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
d Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
e Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.