Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/07 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-enweta ‘Nri n’Oge Kwesịrị Ekwesị’?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Akwụkwọ na Vidio Ndị Dị ná Nkebi nke 2
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Akwụkwọ na Vidio Ndị Dị ná Nkebi nke 1
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Iji Internet Na-eme Ihe—Nọrọ na Nche Maka Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya!
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 9/07 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ “Ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ọ̀ kwadoro ka Ndịàmà hiwe òtù dị iche iche nọọrọ onwe ha ndị na-ezukọ iji mee nnyocha ndị metụtara Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ iji jiri Akwụkwọ Nsọ rụrịta ụka?—Mat. 24:45, 47.

Ee e, ọ kwadoghị ya. N’agbanyeghị nke a, n’ebe dị iche iche n’ụwa, mmadụ ole na ole ndị nọ na nzukọ a ehiwela òtù dị iche iche ka ha na-eme nnyocha nke onwe ha n’isiokwu ndị metụtara Bible. Òtù ụfọdụ amụọla asụsụ Hibru na Grik ndị e ji dee Bible n’onwe ha iji nyochaa ma Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ò zikwara ezi. Ndị ọzọ enyochaala ihe ndị nkà mmụta sayensị kwuru bụ́ ndị metụtara Bible. Ha emegheela ebe a na-edebe ihe ọmụma na ebe a na-akparịta ụka n’Intanet iji na-agwa ibe ha echiche ha na iji na-arụrịta ụka. Ha enweekwala nnọkọ ma bipụta akwụkwọ dị iche iche iji kwuo ihe ndị ha chọpụtara nakwa iji kwadoo ihe ndị a na-akụziri anyị n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst nakwa n’akwụkwọ anyị.

N’ụwa dum, ndị Jehova na-enweta ntụziaka ime mmụọ dị ukwuu na agbamume n’ọmụmụ ihe ọgbakọ, mgbakọ ukwu na mgbakọ nta ndị anyị na-enwe, nakwa n’akwụkwọ ndị nzukọ Jehova na-ebipụta. Site ná nduzi Jehova ji mmụọ nsọ ya eduzi ndị ya nakwa n’Okwu ya bụ́ eziokwu nke ha na-adabere na ya, Ọ na-enye ndị ya ihe dị ha mkpa ka ha nile wee “dị n’otu n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ n’otu obi na n’otu ụzọ iche echiche” ma “gbasie ike n’okwukwe.” (1 Kọr. 1:10; Kọl. 2:6, 7) N’ezie, anyị nwere obi ekele maka nri ime mmụọ Jehova na-enye anyị n’oge ikpeazụ a. N’ihi ya, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” adịghị akwado akwụkwọ ọ bụla ma ọ bụ ebe ọ bụla a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke ọ na-abụghị ya hụrụ maka iwepụta ya. Ọ dịghịkwa akwado nzukọ ọ bụla nke ọ na-abụghị ya haziri.—Mat. 24:45-47.

E kwesịrị ịja ụmụnna anyị mma ma ọ bụrụ na ha e jiri ikike iche echiche ha na-akwado ozi ọma. Otú ọ dị, mgbalị nke mmadụ na-eme n’onwe ya ekwesịghị ime ka o yie ka ihe Jizọs Kraịst ji ọgbakọ ya na-arụzu n’ụwa dum taa adịchaghị mma. Na narị afọ mbụ, Pọl onyeozi dọrọ ụmụnna aka ná ntị ka ha zere okwu na-eri oge nke na-adịghị ebi ebi, dị ka ‘usoro ọmụmụ, bụ́ ndị na-emesị bụrụ ihe efu, ma bụrụ ndị na-eweta ajụjụ ndị a na-emere nnyocha kama ịbụ ndị na-ekesa ihe ọ bụla sitere na Chineke n’ihe metụtara okwukwe.’ (1 Tim. 1:3-7) Ndị Kraịst nile kwesịrị ịgbalị “zere oké ajụjụ nzuzu na usoro ọmụmụ na esemokwu na ịlụ ọgụ banyere Iwu ahụ, n’ihi na ha abaghị uru, bụrụkwa ihe efu.”—Taị. 3:9.

Anyị na-atụrụ ndị chọrọ ịmụkwu Bible ma ọ bụ imekwu nnyocha aro ka ha nyochaa Insight on the Scriptures, “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” na akwụkwọ ndị ọzọ, dị ka ndị ahụ tụlere amụma ndị dị n’akwụkwọ Bible bụ́ Daniel, Aịsaịa, na Mkpughe. Akwụkwọ ndị a emeela ka anyị nwee ọtụtụ ihe anyị ga-eji mụọ Bible na ndị anyị ga-atụgharị uche na ha, bụ́ ndị nwere ike ime ka anyị ‘jupụta n’ezi ihe ọmụma nke uche [Chineke] n’amamihe nile na nghọta ime mmụọ, ka anyị wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu, ka anyị na-anọgide na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla ma na-aba ụba n’ezi ihe ọmụma nke Chineke.”—Kọl. 1:9, 10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya