Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2008
Ntụziaka
N’afọ 2008, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
EBE IHE OMUME SI: Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ [bi12-IB], Ụlọ Nche [w-IB], Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke [be-IB], na Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu [td-IB]a
Ụlọ akwụkwọ ahụ kwesịrị ịmalite N’OGE. E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata malite ya. E kwesịkwara ịgbaso ụkpụrụ a e depụtara ebe a mgbe a na-eduzi ya. Mgbe e mesịrị ihe omume nke ọ bụla, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-akpọpụta onye ga-eme ihe omume nke na-esonụ.
NKÀ OKWU: Nkeji 5. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ, onye ndụmọdụ na-enyere ya aka, ma ọ bụ okenye ọzọ ruru eru ga-atụle otu nkà okwu nke ga-adabere n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. (N’ọgbakọ ndị e nwere ndị okenye ole na ole, e nwere ike ikenye ya ndị ohu na-eje ozi ruru eru.)
IHE OMUME NKE 1: Nkeji 10. Ọ bụ okenye ruru eru ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru kwesịrị ime ya. Ọ ga-adabere n’akwụkwọ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma ọ bụ n’Ụlọ Nche. Ọ ga-abụ okwu izi ihe nke ga-ewe nkeji iri. E kwesịghị ikwu okwu ahụ naanị iji kwuzuo ihe dị n’akwụkwọ ahụ, kama e kwesịrị ilekwasị anya n’uru ihe ahụ a na-atụle bara. E kwesịkwara ime ka akụkụ ya ga-aka abara ọgbakọ uru pụta ìhè. Ọ bụ isiokwu e depụtara ka e kwesịrị ikwu. A na-atụ anya na ụmụnna e kenyere ihe omume a ga-elezi anya ka ha ghara ịgafe oge e nyere ha. E nwere ike inye onye mere ya ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BAỊBỤL: Nkeji 10. Okenye ruru eru ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru kwesịrị iji nkeji ise bu ụzọ gosi otú ọgụgụ Baịbụl maka izu ahụ ga-esi baara ọgbakọ uru. Okwu ya nwere ike ịdabere n’akụkụ ọ bụla nke ebe a na-agụ n’ọgụgụ Baịbụl nke izu ahụ. Ihe ọ ga-eme abụghị ịchịkọta ihe niile e kwuru n’ebe e kenyere ka a gụọ. Nzube bụ́ isi e ji atụle ya bụ iji nyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere ọgụgụ Baịbụl nke izu ahụ ji baa uru na otú o si baa uru. Ọkà okwu kwesịrị ilezi anya ka ọ ghara ịgafe nkeji ise e nyere maka akụkụ mbụ nke ihe omume ahụ. O kwesịrị ịhụ na ọ hapụụrụ ndị na-ege ntị nkeji ise ha ga-eji tinye ọnụ. E kwesịrị ịgwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu dị mkpirikpi (sekọnd 30 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) banyere ihe masịrị ha n’ọgụgụ Baịbụl ahụ na uru ndị ọ baara ha. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwazi ndị mmụta e kenyere na klas ndị ọzọ ka ha gawa na klas ha.
IHE OMUME NKE 2: Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya. Nke a bụ ihe ọgụgụ nwanna nwoke ga-agụ. Onye mmụta ahụ kwesịrị ịgụ ebe e kenyere ya n’ekwughị okwu mmeghe ma ọ bụ nke mmechi. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’inyere ndị mmụta aka ịgụ ihe otú a ga-aghọta ya, ịgụ ihe were were, imesi okwu ike ebe e kwesịrị imesi ya ike, ịgbanwe ụda olu, ịkwụsịtụ n’ebe ndị e kwesịrị ịkwụsịtụ, na ịgụ ihe otú ha si ekwu okwu.
IHE OMUME NKE 3: Nkeji 5. Ọ bụ nwanna nwaanyị ka a ga-ekenye ya. A ga-ekenye nwanna nwaanyị e nyere ihe omume a ọnọdụ okwu ọ ga-eso ma o mewe ya, ma ọ bụkwanụ ya ejiri aka ya họrọ otu site ná ndị ahụ e depụtara na peeji nke iri asatọ na abụọ nke akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. Onye mmụta ahụ kwesịrị ịhụ na ihe omume ya dabara n’isiokwu e kenyere ya, meekwa ka ọ daba n’otu n’ime ọnọdụ ndị a na-ahụ n’ozi ubi n’ókèala unu. Mgbe ọ bụla a na-edeghị ebe ihe omume si, onye mmụta ga-eji aka ya nweta ihe ọ ga-ekwu site n’ime nchọnchọ n’akwụkwọ anyị. E kwesịrị ikenye ndị mmụta ọhụrụ ihe omume ndị e dere ebe ha si. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-elekwasị anya karịsịa n’otú onye mmụta si kọwaa isiokwu ahụ na otú o si nyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ na ịghọta isi ihe ndị dị n’okwu ya. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye onye mmụta otu onye inyeaka.
IHE OMUME NKE 4: Nkeji 5. Onye e kenyere ihe omume a kwesịrị ikwu okwu n’isiokwu e kenyere ya. Mgbe ọ bụla a na-ekwughị ebe ihe omume si, ọ ga-eji aka ya nweta ihe ọ ga-ekwu site n’ime nchọnchọ n’akwụkwọ anyị. Ọ bụrụ na e kenye ya nwanna nwoke, o kwesịrị iguzo n’ihu tebụl ikpo okwu kwuo ya. Ọ ga na-agwa ndị na-ege ntị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze okwu. Ọ bụrụ na e kenye ya nwanna nwaanyị, o kwesịrị ime ya mgbe niile dị ka e kwuru ka e si na-eme Ihe Omume nke atọ. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ nwere ike ikenye nwanna nwoke Ihe Omume nke anọ mgbe ọ bụla ọ hụrụ na ọ dị mkpa ka o mee otú ahụ. Biko mara na ọ bụ naanị nwanna nwoke ka e kwesịrị ikenye isiokwu ọ bụla nwere akara kpakpando (*) n’akụkụ ya. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi n’ọgbakọ unu, bụ́ ndị na-eme ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na ná Nzukọ Ije Ozi, ọ ga-aka mma ka e kenye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi isiokwu ndị e nwere akara kpakpando (*) n’akụkụ ha mgbe ọ bụla o kwere mee.
NDỤMỌDỤ: 1 nkeji. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ agaghị ekwu nkà okwu a chọrọ ka onye mmụta rụọ ọrụ na ya tupu onye mmụta ahụ emewe ihe omume ya. Mgbe e mesịrị ihe omume nke abụọ, nke atọ, na nke anọ, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-aja onye mmụta mma n’ebe o mere nke ọma. Ebumnobi ya abụghị naanị ịsị ya “i meela,” kama ọ ga-ekwukwa kpọmkwem ihe ndị mere ka ihe omume ya dị mma. Dị ka mkpa onye mmụta ọ bụla si dị, e nwere ike inyekwu ya ndụmọdụ na-ewuli elu nke na-agaghị abụ n’ihu ọha mgbe a gbasasịrị nzukọ ma ọ bụ n’oge ọzọ.
IDEBE OGE: Ọ dịghị okwu kwesịrị ịgafe oge e nyere maka ya, okwu onye ndụmọdụ ekwesịghịkwa ịgafe oge. E kwesịrị iji akọ kwụsị Ihe Omume nke abụọ ruo nke anọ mgbe oge ha zuru. Ọ bụrụ na ụmụnna na-ekwu okwu mmeghe ndị dị ka nkà okwu, ihe omume nke mbụ, ma ọ bụ nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl erie oge, e kwesịrị inye ha ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha. Onye ọ bụla kwesịrị ilezi anya iji hụ na o righị oge. Ihe omume ahụ niile ga-ewe nkeji iri anọ na ise, n’agụnyeghị abụ na ekpere.
FỌM NDỤMỌDỤ OKWU: Ọ dị n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi.
ONYE NDỤMỌDỤ INYEAKA: Òtù ndị okenye nwere ike ịhọpụta onye okenye ruru eru, ma ọ bụrụ na e nwere, tụkwasị n’onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ka ọ na-arụ ọrụ dị ka onye ndụmọdụ inyeaka. Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị okenye n’ọgbakọ, e nwere ike ikenye ndị okenye dịgasị iche iche, bụ́ ndị ruru eru, ọrụ a n’afọ nke ọ bụla. Ọrụ onye ndụmọdụ inyeaka ga-abụ inye ụmụnna mere ihe omume nke mbụ na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl ndụmọdụ nke na-agaghị abụ n’ihu ọha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-enye ndụmọdụ mgbe ọ bụla ndị okenye ibe ya ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi mesịrị ihe omume.
NTỤLEGHACHI A GA-EME N’ỤLỌ AKWỤKWỌ IJE OZI ỌCHỊCHỊ CHINEKE: Nkeji 30. N’ọnwa abụọ ọ bụla, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi. Tupu e mewe ya, a ga-ebu ụzọ tụlee otu nkà okwu na isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl. A ga-eme ha otú ahụ e si kọwaa ya n’elu. Ntụleghachi ahụ ga-adabere n’ihe a tụlere n’ụlọ akwụkwọ n’ime ọnwa abụọ bu ya ụzọ, gụnyere izu ahụ a nọ na ya. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu ga-aga mgbakọ sekit n’izu a ga-eme ntụleghachi n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, e kwesịrị ime ntụleghachi ahụ (na ihe omume ndị ọzọ e kwesịrị ime n’izu ahụ) n’izu na-esote ya ma mee ihe omume nke izu na-esote ya n’izu ahụ. Ọ bụrụ na onye nlekọta sekit ga-eleta ọgbakọ unu n’izu a ga-eme ntụleghachi, ọ bụ abụ e kwesịrị ịbụ n’izu ahụ ka a ga-abụ. Ọ bụkwa nkà okwu na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl nke izu ahụ ka e kwesịrị ime. Ihe omume nke mbụ (bụ́ nke a na-eme ma nkà okwu gasịa) kwesịrị isi n’usoro ihe omume nke izu na-eso ya. N’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke izu na-eso ya, ọ bụ nkà okwu na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl nke izu ahụ ka a ga-eme, e mechaa ha, e mewezie ntụleghachi ahụ.
USORO IHE OMUME
Jan. 7 Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 1-6 Abụ nke 62
Nkà Okwu: Nye Nkọwa Dị Mkpa (be-IB p. 228 para. 2-3)
Nọ. 1: Akụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Matiu—Nkebi nke Mbụ (w89 7/15 p. 24 para. 1-p. 25 para. 1)
Nọ. 2: Matiu 5:1-20
Nọ. 3: #td 21B Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Kwere na Jizọs Kraịst
Nọ. 4: Otú Mmụọ Nsọ Chineke Si Enyere Anyị Aka
Jan. 14 Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 7-11 Abụ nke 224
Nkà Okwu: Otú O Si Agụnye Obi (be-IB p. 228 para. 4–6)
Nọ. 1: Na-enweta Obi Ụtọ n’Okwu Chineke (be-IB p. 9 para. 1-5)
Nọ. 2: Matiu 10:1-23
Nọ. 3: Ihe Mere Ime Ihe n’Eziokwu Ji Aba Nnọọ Uru
Nọ. 4: td 21CH Onye Kweere na Kraịst Kwesịrị Ịrụ Ọrụ Gosiri na O Kweere na Ya
Jan. 21 Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 12-15 Abụ nke 133
Nkà Okwu: Ndị Na-ege Gị Ntị Mụtara Ihe na Ya (be-IB p. 230 para. 1-6)
Nọ. 1: Na-agụ Baịbụl Kwa Ụbọchị (be-IB p. 10 para. 1–p. 12 para. 3)
Nọ. 2: Matiu 14:1-22
Nọ. 3: td 2A Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Ụmụ Mmadụ
Nọ. 4: Gịnị, Ma Ọ Bụ Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst?
Jan. 28 Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 16-21 Abụ nke 176
Nkà Okwu: Ime Nnyocha Ka E Wee Mụta Ihe n’Okwu Gị (be-IB p. 231 para. 1-3)
Nọ. 1: “Lezienụ Anya Otú Unu Si Aṅa Ntị” (be-IB p. 13 para. 1–p. 14 para. 4)
Nọ. 2: Matiu 17:1-20
Nọ. 3: td 2B Alaeze Chineke Ga-amalite Ịchị Mgbe Ndị Iro Kraịst Ka Na-akpa Ike
Nọ. 4: Ihe Ndị Kraịst Weere na Ha Dị Nsọ
Feb. 4 Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 22-25 Abụ nke 151
Nkà Okwu: Ịkọwa Akụkụ Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 231 para. 4-5)
Nọ. 1: Ịṅa Ntị n’Ọmụmụ Ihe na ná Mgbakọ (be-IB p. 15 para. 1–p. 16 para. 5)
Nọ. 2: Matiu 23:1-24
Nọ. 3: Ndụ Ebighị Ebi Agaghị Na-agwụ Ike
Nọ. 4: td 2CH Alaeze Chineke Amaliteghị Ịchị Site ná Mgbalị Mmadụ
Feb. 11 Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 26-28 Abụ nke 110
Nkà Okwu: Ịkọwa Okwu Dị Iche Iche (be-IB p. 232 para. 1)
Nọ. 1: Akụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Matiu—Nkebi nke Abụọ (w89 7/15 p. 25 para. 2-6)
Nọ. 2: Matiu 27:1-22
Nọ. 3: Ihe Mere Inwe Okwukwe Ji Karịa Naanị Ikwere na Chineke Dị
Nọ. 4: td 23A Ihe “Ọgwụgwụ Ụwa” Pụtara
Feb. 18 Ọgụgụ Baịbụl: Mak 1-4 Abụ nke 167
Nkà Okwu: Ịtụgharị Uche n’Akụkụ Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 232 para. 2-4)
Nọ. 1: Akụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Mak—Nkebi nke Mbụ (w89 10/15 p. 30 para. 1-8)
Nọ. 2: Mak 2:1-17
Nọ. 3: td 23B Mụrụ Anya Iji Mata Ihe Ịrịba Ama nke Oge Ikpeazụ
Nọ. 4: Otú Ịhụnanya Si Eme Ka Mmadụ Nwekwuo Obi Ike
Feb. 25 Ọgụgụ Baịbụl: Mak 5-8 Abụ nke 72
Nkà Okwu: Ikwu Ihe Ndị Na-ege Gị Ntị Ga-erite Uru na Ya (be-IB p. 233 para. 1-5)
Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Mar. 3 Ọgụgụ Baịbụl: Mak 9-12 Abụ nke 195
Nkà Okwu: Iji Ebe Ihe Omume E Kenyere Sitere Mee Ihe (be-IB p. 234 para. 1–p. 235 para. 3)
Nọ. 1: Ị Pụrụ Imeziwanye Ikike Icheta Ihe Gị (be-IB p. 17 para. 1–p. 19 para. 1)
Nọ. 2: Mak 11:1-18
Nọ. 3: Ihe Mere na Chineke Apụghị Ịgha Ụgha
Nọ. 4: td 30A Chineke Kwere Nkwa Inye Ụmụ Mmadụ Na-erube Isi Ndụ Ebighị Ebi
Mar. 10 Ọgụgụ Baịbụl: Mak 13-16 Abụ nke 87
Nkà Okwu: Iji Ajụjụ Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè (be-IB p. 236 para. 1-5)
Nọ. 1: Akụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Mak—Nkebi nke Abụọ (w89 10/15 p. 31 para. 1-5)
Nọ. 2: Mak 14:1-21
Nọ. 3: td 30B Ọ Bụghị Mmadụ Niile Ga-aga Eluigwe
Nọ. 4: Ihe Mere na “Iwe Mmadụ Adịghị Arụpụta Ezi Omume Chineke” (Jems 1:20)
Mar. 17 Ọgụgụ Baịbụl: Luk 1-3 Abụ nke 13
Nkà Okwu: Iji Ajụjụ Ewebata Echiche Ndị Dị Mkpa (be-IB p. 237 para. 1-2)
Nọ. 1: Akụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Luk—Nkebi nke Mbụ (w89 11/15 p. 24 para. 1-8)
Nọ. 2: Luk 1:1-23
Nọ. 3: Ihe Mere na “Okwukwe nke Na-enweghị Ọrụ Adịghị Arụpụta Ihe Ọ Bụla” (Jems 2:20)
Nọ. 4: td 30CH E Kwere Ọnụ Ọgụgụ A Na-akparaghị Ókè nke “Atụrụ Ọzọ” Nkwa Ndụ Ebighị Ebi
Mar. 24 Ọgụgụ Baịbụl: Luk 4-6 Abụ nke 156
Nkà Okwu: Iji Ajụjụ Tụgharịa Uche n’Otu Isiokwu (be-IB p. 237 para. 3–p. 238 para. 1)
Nọ. 1: Otú Mmụọ Chineke Si Enyere Anyị Aka Icheta Ihe (be-IB p. 19 para. 2–p. 20 para. 3)
Nọ. 2: Luk 4:1-21
Nọ. 3: td 3A Njikọ Alụmdi na Nwunye Aghaghị Ịbụ Ihe Kwesịrị Nsọpụrụ
Nọ. 4: Ịtụ Egwu Chineke Nwere Ike Ime Ka Anyị Ghara Ime Ihe Ọjọọ
Mar. 31 Ọgụgụ Baịbụl: Luk 7-9 Abụ nke 122
Nkà Okwu: Iji Ajụjụ Dọpụta Ihe Dị Mmadụ n’Obi (be-IB p. 238 para. 2-4)
Nọ. 1: Gịnị Mere I Kwesịrị Iji Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe? (be-IB p. 21 para. 1–p. 23 para. 3)
Nọ. 2: Luk 7:1-17
Nọ. 3: Ihe Na-egosi na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya ma Chọọ Ka Anyị Nwee Obi Ụtọ
Nọ. 4: td-IB 3B Ndị Kraịst Aghaghị Ịsọpụrụ Ụkpụrụ Ịbụisi
Apr. 7 Ọgụgụ Baịbụl: Luk 10-12 Abụ nke 68
Nkà Okwu: Iji Ajụjụ Mesikwuo Ihe Ike (be-IB p. 238 para. 5-p. 239 para. 1)
Nọ. 1: Otú Ị Ga-esi Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe (be-IB p. 23 para. 4–p. 26 para. 4)
Nọ. 2: Luk 11:37-54
Nọ. 3: td 3CH Ọrụ Dịịrị Nne na Nna Bụ́ Ndị Kraịst n’Ebe Ụmụ Ha Nọ
Nọ. 4: Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Ghọta Mkpughe 17:17?
Apr. 14 Ọgụgụ Baịbụl: Luk 13-17 Abụ nke 86
Nkà Okwu: Iji Ajụjụ Kpughee Echiche Na-ezighị Ezi (be-IB p. 239 para. 2-4)
Nọ. 1: Ụzọ Isi Mụọ Ihe (be-IB p. 27 para. 1–p. 31 para. 2)
Nọ. 2: Luk 16:1-15
Nọ. 3: Ihe Iwu Chineke Banyere Ịtụtụkọta Ihe Ndị A Hapụrụ n’Ubi Na-akụziri Anyị (Lev. 19:9, 10)
Nọ. 4: td 3D Ndị Kraịst Kwesịrị Ịlụ Naanị Ndị Kraịst
Apr. 21 Ọgụgụ Baịbụl: Luk 18-21 Abụ nke 182
Nkà Okwu: Atụmatụ Okwu Ndị Na-ezi Ihe (be-IB p. 240 para. 1–p. 241 para. 2)
Nọ. 1: Akụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Luk—Nkebi nke Abụọ (w89 11/15 p. 24 para. 9–p. 25 para. 5)
Nọ. 2: Luk 18:1-17
Nọ. 3: td 3E Ezi Ndị Kraịst Anaghị Alụ Karịa Otu Nwaanyị
Nọ. 4: Ihe ‘Ime ihe Niile n’Atamughị Ntamu’ Pụtara (Fil. 2:14)
Apr. 28 Ọgụgụ Baịbụl: Luk 22-24 Abụ nke 218
Nkà Okwu: Jiri Ihe Atụ Na-eme Ihe (be-IB p. 241 para. 3-p. 242 para. 1)
Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
May 5 Ọgụgụ Baịbụl: Jọn 1-4 Abụ nke 31
Nkà Okwu: Ihe Atụ Ndị Dị n’Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 242 para. 1-2)
Nọ. 1: Akụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Jọn—Nkebi nke Mbụ (w90 3/15 p. 24)
Nọ. 2: Jọn 3:1-21
Nọ. 3: Ihe Anyị Mụtara Site n’Ọjụjụ Devid Jụrụ Ka E Gbuo Eze Sọl
Nọ. 4: td 14A Meri Abụghị “Nne nke Chukwu”
May 12 Ọgụgụ Baịbụl: Jọn 5-7 Abụ nke 150
Nkà Okwu: À Ga-aghọta Ya? (be-IB p. 242 para. 4–p. 243 para. 1)
Nọ. 1: Ịmụ Ihe Na-enye Ụgwọ Ọrụ (be-IB p. 31 para. 3–p. 32 para. 4)
Nọ. 2: Jọn 6:1-21
Nọ. 3: Ihe Akụkọ Banyere Ananayas na Safaịra Na-akụziri Anyị
Nọ. 4: td 14B Baịbụl Gosiri na Meri Abụghị ‘Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Ruo Mgbe Ebighị Ebi’
May 19 Ọgụgụ Baịbụl: Jọn 8-11 Abụ nke 102
Nkà Okwu: Ihe Atụ Ndị Sitere n’Ọnọdụ A Maara nke Ọma (be-IB p. 244 para. 1-2)
Nọ. 1: Otú E Si Eji Baịbụl Eme Nnyocha (be-IB p. 33 para. 1–p. 35 para. 2)
Nọ. 2: Jọn 11:38-57
Nọ. 3: td 12A Ihe Akwụkwọ Nsọ Kwuru Banyere Ememme Ncheta
Nọ. 4: Ebe Ọ Bụ na Ọ Dịghị Otú E Nwere Ike Isi Mata Onye Dara Iwu nke Iri Iji Taa Ya Ahụhụ, Gịnị Mere E Ji Nye Iwu Ahụ?
May 26 Ọgụgụ Baịbụl: Jọn 12-16 Abụ nke 3
Nkà Okwu: Ihe Atụ Kwesịrị Ekwesị Maka Ndị Ị Na-agwa Okwu (be-IB p. 244 para. 3–p. 245 para. 4)
Nọ. 1: Ịmụta Iji Ihe Ndị Ọzọ E Ji Eme Nnyocha Eme Ihe (be-IB p. 35 para. 3–p. 38 para. 4)
Nọ. 2: Jọn 12:1-19
Nọ. 3: td 12B Mas Esighị n’Akwụkwọ Nsọ
Nọ. 4: Otú Anyị Si Atụkwasị Jehova Ibu Arọ Anyị (Ọma 55:22)
June 2 Ọgụgụ Baịbụl: Jọn 17-21 Abụ nke 198
Nkà Okwu: Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè (be-IB p. 247 para. 1-2)
Nọ. 1: Akụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Ndị Sitere n’Oziọma Jọn—Nkebi nke Abụọ (w90-IB 3/15 p. 25)
Nọ. 2: Jọn 21:1-14
Nọ. 3: Gịnị Mere Anyị Ga-eji Kwere na Chineke, Bụ́ Onye Anyị Na-enweghị Ike Ịhụ Anya?
Nọ. 4: td 37A Ndị Kraịst Niile Aghaghị Ịbụ Ndị Ozi
June 9 Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ 1-4 Abụ nke 92
Nkà Okwu: Otú Jizọs Si Jiri Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Mee Ihe (be-IB p. 247 para. 3)
Nọ. 1: Ndịàmà Na-anụ Ọkụ n’Obi nke Jehova Na-azọ Ije!—Nkebi nke Mbụ (w90-IB 5/15 p. 24-25, igbe esoghị ya)
Nọ. 2: Ọrụ 1:1-14
Nọ. 3: td 37B Ihe Ga-eme Ka Mmadụ Ruo Eruo Ịbụ Onyeozi
Nọ. 4: Gịnị Ka Mmadụ Inwe “Nkwuwa Okwu” Pụtara? (Hib. 3:6)
June 16 Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ 5-7 Abụ nke 2
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Jiri Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Mee Ihe (be-IB p. 248 para. 1-3)
Nọ. 1: Ịkwadebe Ihe Ndepụta (be-IB p. 39-42)
Nọ. 2: Ọrụ 5:1-16
Nọ. 3: td 25A Ihe Mere E Ji Emegide Ezi Ndị Kraịst
Nọ. 4: Gịnị Mere Ịtụ Egwu Jehova Ji Bụrụ Mmalite Amamihe? (Ọma 111:10)
June 23 Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ 8-10 Abụ nke 116
Nkà Okwu: Jiri Map, Usoro Ihe Omume Mgbakọ E Biri Ebi, na Vidio Mee Ihe (be-IB p. 248 para. 4–p. 249 para. 2)
Nọ. 1: Ịkwadebe Okwu Onye Mmụta Maka Ụlọ Akwụkwọ (be-IB p. 43 para. 1–p. 44 para. 3)
Nọ. 2: Ọrụ 8:1-17
Nọ. 3: Otú Jizọs Ga-esi ‘Napụta Ogbenye’ (Ọma 72:12)
Nọ. 4: td 25B Nwunye Ekwesịghị Ikwe Ka Di Ya Kewapụ Ya n’Ebe Chineke Nọ
June 30 Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ 11-14 Abụ nke 79
Nkà Okwu: Iji Ihe Ndị A Na-ahụ Anya Eme Ihe Maka Ìgwè Ndị Buru Ibu Karị (be-IB p. 249 para. 3–p. 250 para. 1)
Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
July 7 Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ 15-17 Abụ nke 203
Nkà Okwu: Ihe Mere Ikwu Okwu n’Ụdị Ntụgharị Uche Ji Dị Mkpa (be-IB p. 251 para. 1-3)
Nọ. 1: Iji Isiokwu na Ọnọdụ Okwu Na-eme Ihe (be-IB p. 44 para. 4–p. 46 para. 1)
Nọ. 2: Ọrụ 16:1-15
Nọ. 3: Ihe Ndị Mere Anyị Ji Ejere Jehova Ozi n’Atụghị Egwu
Nọ. 4: td 25CH Di Ekwesịghị Ikwe Ka Nwunye Ya Gbochie Ya Ijere Chineke Ozi
July 14 Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ 18-21 Abụ nke 32
Nkà Okwu: Ebe A Ga-amalite (be-IB p. 251 para. 4–p. 252 para. 3)
Nọ. 1: Ịkwadebe Okwu A Ga-agwa Ọgbakọ (be-IB p. 47 para. 1–p. 49 para. 1)
Nọ. 2: Ọrụ 20:1-16
Nọ. 3: td 9A Ekpere Ndị Chineke Na-anụ
Nọ. 4: Gịnị Ka Anyị Nwere Ike Ịmụta Site n’Ihe ahụ A Machibidoro Iwu Ime n’Ọpụpụ 23:19b?
July 21 Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ 22-25 Abụ nke 200
Nkà Okwu: Mgbe A Ga-ekwenye n’Ihe (be-IB p. 252 para. 4–p. 253 para. 2)
Nọ. 1: Ịkwadebe Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi na Ihe Omume Ndị Ọzọ (be-IB p. 49 para. 2–p. 51 para. 1)
Nọ. 2: Ọrụ 22:1-16
Nọ. 3: Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Eme Ihe E Dere na Jọn 13:34, 35?
Nọ. 4: td 9B Ihe Mere na Ekpere Ụfọdụ Ekwesịghị Ekwesị
July 28 Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ 26-28 Abụ nke 29
Nkà Okwu: Ịjụ Ajụjụ na Ikwu Ihe Ndị Kpatara Ihe (be-IB p. 253 para. 3–p. 254 para. 2)
Nọ. 1: Ndịàmà Na-anụ Ọkụ n’Obi nke Jehova Na-azọ Ije!—Nkebi nke Abụọ (w90 5/15 p. 26, na igbe ndị dị na p. 25, 26)
Nọ. 2: Ọrụ 26:1-18
Nọ. 3: td 39A A Kaghị Ọdịnihu Mmadụ Aka
Nọ. 4: Ihe Mere Jehova Ji Enwe Ndidi
Aug. 4 Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Rom 1-4 Abụ nke 170
Nkà Okwu: Jiri Ihe Ndị Daberesiiri Ike n’Okwu Chineke Kwadoo Ihe Ị Na-ekwu (be-IB p. 255 para. 1–p. 256 para. 3)
Nọ. 1: Ndị Rom Enweta Ozi Kachasị Ozi Niile Mma—Nkebi nke Mbụ (w90 8/1 p. 23 para. 1-p. 24 para. 3)
Nọ. 2: Ndị Rom 3:1-20
Nọ. 3: Otú Ndị Mmụọ Ozi Si Agba Ndị Chineke Ume ma Na-echebe Ha
Nọ. 4: td-IB 16A Ndụ Jizọs Dịrị Dị Ka Mmadụ Bụ ‘Ihe Mgbapụta Maka Mmadụ Niile’
Aug. 11 Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Rom 5-8 Abụ nke 207
Nkà Okwu: Jiri Ihe Àmà Ndị Ọzọ Na-akwado Okwu Gị (be-IB p. 256 para. 4-6)
Nọ. 1: Ịkwadebe Okwu A Ga-ekwu n’Ihu Ọha (be-IB p. 52 para. 1–p. 54 para. 1)
Nọ. 2: Ndị Rom 6:1-20
Nọ. 3: td 16B Ihe Mere Jizọs Ji Nwee Ike Ịkwụ Ụgwọ Ihe Mgbapụta Ahụ
Nọ. 4: Otú Ezi Omume Nwere Ike Isi Chebe Anyị
Aug. 18 Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Rom 9-12 Abụ nke 152
Nkà Okwu: Nye Ihe Àmà Zuru Ezu (be-IB p. 257 para. 1-4)
Nọ. 1: Ndị Rom Enweta Ozi Kachasị Ozi Niile Mma—Nkebi nke Abụọ (w90 8/1 p. 24 para. 4–p. 25 para. 4)
Nọ. 2: Ndị Rom 9:1-18
Nọ. 3: Olee Ihe Ize Ndụ Ndị Dị n’Ịgba Asịrị na Ịkọsa Kepu Kepu A Nụrụ?
Nọ. 4: td 36A Otú E Si Amata Otu Ezi Okpukpe E Nwere
Aug. 25 Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Rom 13-16 Abụ nke 16
Nkà Okwu: Mgbalị Iji Ruo n’Obi (be-IB p. 258 para. 1-p. 259 para. 1)
Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Sept. 1 Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Kọrịnt 1-9 Abụ nke 199
Nkà Okwu: Ịjụpụta Ndị Mmadụ Ihe Dị Ha n’Obi (be-IB p. 259 para. 2-4)
Nọ. 1: “Na-emenụ Ihe Niile Iji Nye Chineke otuto”—Nkebi nke Mbụ (w90 9/15 p. 24 para. 1-p. 25 para. 1, igbe esoghị ya)
Nọ. 2: 1 Ndị Kọrịnt 4:1-17
Nọ. 3: td 36B Ọ̀ Dị Njọ Ịkatọ Ozizi Ụgha?
Nọ. 4: Na Mmadụ Nwere Akụnụba Ọ̀ Pụtara na Chineke Agọziela Ya?
Sept. 8 Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Kọrịnt 10-16 Abụ nke 35
Nkà Okwu: Ịkpali Mmetụta Ndị Bara Uru (be-IB p. 259 para. 5–p. 260 para. 1)
Nọ. 1: “Na-emenụ Ihe Niile Iji Nye Chineke Otuto”—Nkebi nke Abụọ (w90 9/15 p. 25 para. 2-6, na igbe ndị dị na p. 24, 25)
Nọ. 2: 1 Ndị Kọrịnt 13:1-14:6
Nọ. 3: Ihe Mere Ndị Na-eme Okwu Chineke Ji Enwe Obi Ụtọ
Nọ. 4: td 36CH Mgbe O Ziri Ezi n’Anya Chineke Ka Mmadụ Gbanwee Okpukpe Ya
Sept. 15 Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Kọrịnt 1-7 Abụ nke 58
Nkà Okwu: Inyere Ndị Ọzọ Aka Ịzụlite Egwu Chineke (be-IB p. 260 para. 2-3)
Nọ. 1: “Na-anwalenụ Ma Ùnu Nọ n’Okwukwe Ahụ”—Nkebi nke Mbụ (w90 9/15 p. 26 para. 1-6, na igbe)
Nọ. 2: 2 Ndị Kọrịnt 1:1-14
Nọ. 3: td 36D Okpukpe Niile Hà Na-amasị Chineke?
Nọ. 4: Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Ji Aṅụrị Ọṅụ Mgbe A Na-akpagbu Ha
Sept. 22 Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Kọrịnt 8-13 Abụ nke 12
Nkà Okwu: Àgwà Anyị Dị Chineke Mkpa (be-IB p. 260 para. 4–p. 261 para. 1)
Nọ. 1: “Na-anwalenụ Ma Ùnu Nọ n’Okwukwe Ahụ”—Nkebi nke Abụọ (w90 9/15 p. 27 para. 1-4, na igbe)
Nọ. 2: 2 Ndị Kọrịnt 9:1-15
Nọ. 3: Ihe Mere na Ezi Ndị Kraịst Abụghị Akụkụ nke Ụwa
Nọ. 4: td 22A Ole Ndị Ka A Ga-akpọlite n’Ọnwụ?
Sept. 29 Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Galeshia 1-6 Abụ nke 163
Nkà Okwu: Inyere Ndị Ọzọ Aka Ime Nnyocha (be-IB p. 261 para. 2-4)
Nọ. 1: Guzosie Ike n’Inwe Onwe Ndị Kraịst! (w90 11/15 p. 23)
Nọ. 2: Ndị Galeshia 1:1-17
Nọ. 3: td 22B Olee Ebe Ndị Nwụrụ Anwụ Ga-anọ Ma Akpọlite Ha?
Nọ. 4: Otú Ịhụnanya Nwere Ike Isi Merie Egwu Mmadụ
Oct. 6 Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Efesọs 1-6 Abụ nke 99
Nkà Okwu: Inyere Ndị Na-ege Ntị Aka Iji Obi Ha Niile Na-erubere Chineke Isi (be-IB p. 262 para. 1-4)
Nọ. 1: Ịdị n’Otu Bụ Ihe E Ji n’Aka Site na Kraịst (w90 11/15 p. 24)
Nọ. 2: Ndị Efesọs 3:1-19
Nọ. 3: Mmadụ Ịrịọ Mgbaghara Apụtaghị na Ọ Dịghị Ike
Nọ. 4: td 32A Ụmụ Mmadụ Agaghị Eji Anya Nkịtị Hụ Nlọghachi Kraịst
Oct. 13 Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Filipaị 1–Ndị Kọlọsi 4 Abụ nke 123
Nkà Okwu: Iso Jehova Na-arụkọ Ọrụ nke Ime Ka Ndị Mmadụ Ghọta Eziokwu Ahụ (be-IB p. 262 para. 5)
Nọ. 1: Gaa n’Ihu Irute Ihe Mgbaru Ọsọ Ahụ! (w90 11/15 p. 25)
Nọ. 2: Ndị Filipaị 3:1-16
Nọ. 3: td 32B A Ga-eji Ihe Ndị Anya Na-ahụ Aghọta na Oge Nlọghachi Kraịst Eruola
Nọ. 4: b Jigide Okwukwe n’Ebe Chineke na Kraịst Nọ (w90 11/15 p. 26)
Oct. 20 Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Tesalonaịka 1–2 Ndị Tesalonaịka 3 Abụ nke 161
Nkà Okwu: Ụzọ Isi Na-edebe Oge (be-IB p. 263 para. 1–p. 264 para. 4)
Nọ. 1: Dịrị Njikere Maka Ụbọchị Jehova! Adala Mbà n’Ime Ihe Ziri Ezi (w91 1/15 p. 22-23)
Nọ. 2: 1 Ndị Tesalonaịka 1:1-2:8
Nọ. 3: td 42A Iwu Ejighị Ndị Kraịst Idebe Ụbọchị Izu Ike
Nọ. 4: c Jigide Okwukwe na Ezi Akọ na Uche Ma Dabere n’Ike nke Chineke Nyeworo (w91 1/15 p.30-31)
Oct. 27 Ọgụgụ Baịbụl: 1 Timoti 1–2 Timoti 4 Abụ nke 69
Nkà Okwu: Ndụmọdụ Dị Irè (be-IB p. 265 para. 1-3)
Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Nov. 3 Ọgụgụ Baịbụl: Taịtọs 1–Faịlimọn Abụ nke 149
Nkà Okwu: Iji Ịhụnanya enye Ndụmọdụ (be-IB p. 266 para. 1-4)
Nọ. 1: Nọgidesie Ike n’Okwukwe! (w91 2/15 p. 22)
Nọ. 2: Taịtọs 1:1-16
Nọ. 3: td 42B Ọ Bụghị Ndị Kraịst Ka E Nyere Iwu Idebe Ụbọchị Izu Ike
Nọ. 4: d Ịhụnanya Ụmụnna Dị Irè (w91 2/15 p. 23)
Nov. 10 Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Hibru 1-8 Abụ nke 144
Nkà Okwu: Ndụmọdụ nke Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ (be-IB p. 267 para. 1-2)
Nọ. 1: Ihe Mere Ofufe Ndị Kraịst Ji Dị Elu Karị—Nkebi nke Mbụ (w91 2/15 p. 24 para. 1-6, igbe dị na p. 24 esoghị ya)
Nọ. 2: Ndị Hibru 3:1-19
Nọ. 3: td 42CH Mgbe Ụbọchị Izu Ike nke Chineke Malitere na Mgbe Ọ Kwụsịrị
Nọ. 4: Ọdịiche Dị n’Ezigbo Umeala n’Obi na nke Adịgboroja Ya
Nov. 17 Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Hibru 9-13 Abụ nke 28
Nkà Okwu: Inwe Nkwuwa Okwu (be-IB p. 267 para. 3-4)
Nọ. 1: Ihe Mere Ofufe Ndị Kraịst Ji Dị Elu Karị—Nkebi nke Abụọ (w91 2/15 p. 24 para. 7–p. 25 para. 3, na igbe dị na p. 24)
Nọ. 2: Ndị Hibru 10:1-17
Nọ. 3: td 33A Ọ Bụ Naanị Site n’Aka Kraịst Ka Chineke Si Azọpụta Mmadụ?
Nọ. 4: Otú Mgbaghara Si Eme Ka A Dị n’Otu
Nov. 24 Ọgụgụ Baịbụl: Jems 1-5 Abụ nke 88
Nkà Okwu: Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-agba Ndị Mmadụ Ume (be-IB p. 268 para. 1-3)
Nọ. 1: Ihe Mere Okwukwe na Amamihe Ji Dị Anyị Mkpa (w91 3/15 p. 23)
Nọ. 2: Jems 1:1-21
Nọ. 3: td 33B Ozizi Bụ́ na “Onye A Zọpụtara, A Zọpụtachaala Ya” Esighị n’Akwụkwọ Nsọ
Nọ. 4: Otú ‘Ebere Si Emeri Ikpe’ (Jems 2:13)
Dec. 1 Ọgụgụ Baịbụl: 1 Pita 1–2 Pita 3 Abụ nke 18
Nkà Okwu: Chetaghachiri Ha Ihe Jehova Meworo (be-IB p. 268 para. 4–p. 269 para. 2)
Nọ. 1: Nọgidesie Ike n’Okwukwe! (w91 3/15 p. 30)
Nọ. 2: 1 Pita 2:1-17
Nọ. 3: td 33CH Ozizi Bụ́ na ‘A Ga-azọpụta Mmadụ Niile’ Esighị n’Akwụkwọ Nsọ
Nọ. 4: e Gee Ntị n’Okwu Amụma nke Chineke! (w91 3/15 p. 31)
Dec. 8 Ọgụgụ Baịbụl: 1 Jọn 1–Jud Abụ nke 50
Nkà Okwu: Igosi Otú Jehova Sirila Nyere Ndị Ya Aka (be-IB p. 269 para. 3-5)
Nọ. 1: Nọgidenụ Na-ejegharị n’Ìhè na n’Ịhụnanya, Na-ejekwanụ Ije Dị ka Ndị Na-arụkọ Ọrụ n’Eziokwu Ahụ (w91 4/15 p. 29-30)
Nọ. 2: 1 Jọn 4:1-16
Nọ. 3: td 26A Ihe Mmehie Bụ
Nọ. 4: f Kpachara Anya Banyere Ndị Si n’Ezi Ofufe Dapụ! (w91 4/15 p. 31)
Dec. 15 Ọgụgụ Baịbụl: Mkpughe 1-6 Abụ nke 219
Nkà Okwu: Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ n’Ihe Chineke Na-eme Ugbu A (be-IB p. 270 para. 1–p. 271 para. 1)
Nọ. 1: Ọhụụ Na-akpali Akpali Ndị Na-ewusi Okwukwe Ike—Nkebi nke Mbụ (w91 5/1 p. 21 para. 1-p. 22 para. 4, na igbe dị na p. 21)
Nọ. 2: Mkpughe 3:1-13
Nọ. 3: td 26B Ihe Mere Mmadụ Niile Ji Na-ata Ahụhụ n’Ihi Mmehie Adam
Nọ. 4: Ihe Mere Ndidi na Ebere Jehova Ji Enwe Njedebe
Dec. 22 Ọgụgụ Baịbụl: Mkpughe 7-14 Abụ nke 21
Nkà Okwu: Rite Uru Zuru Ezu Site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (be-IB p. 5 para. 1–p. 8 para. 1)
Nọ. 1: Ọhụụ Na-akpali Akpali Ndị Na-ewusi Okwukwe Ike—Nkebi nke Abụọ (w91 5/1 p. 22 para. 5–p. 23 para. 8)
Nọ. 2: Mkpughe 8:1-13
Nọ. 3: td 26CH Gịnị Bụ Mkpụrụ Osisi ahụ A Machibidoro Iwu?
Nọ. 4: Gịnị Ka Okwu Bụ́ “Chineke Karịrị Obi Anyị” Pụtara? (1 Jọn 3:20)
Dec. 29 Ọgụgụ Baịbụl: Mkpughe 15-22 Abụ nke 60
Nkà Okwu: Ịgụzi Ihe Agụzi (be-IB p. 83 para. 1-5)
Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a td - “Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu” nke dị na Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
b Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya. Ọ kacha mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
c Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya. Ọ kacha mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
d Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya. Ọ kacha mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
e Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya. Ọ kacha mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.
f Ọ bụ naanị nwanna nwoke ka a ga-ekenye ya. Ọ kacha mma ikenye ya okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.