Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/07 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite n’October 8
  • Izu Na-amalite n’October 15
  • Izu Na-amalite n’October 22
  • Izu Na-amalite n’October 29
  • Izu Na-amalite na November 5
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 10/07 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite n’October 8

Abụ nke 56

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke asatọ, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche October 15 na Teta! October-December. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro mbụ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi. Ma ọ̀ bụ Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! ka a na-enyefe, a ga-enyefekọta ha abụọ ọnụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu magazin ka a ga-ekwu okwu maka ya.

Nkeji 20: Nọgide Na-eso Nzukọ Jehova Na-akpachi Anya. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-adabere n’isi nke iri na asaa nke akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova.

Nkeji 15: “Ịgba Àmà n’Ekwughị Okwu Ọ Bụla.”a Gwa ndị nkwusa ole na ole ị họọrọ ka ha kwuo otú omume ọma ha hụrụ nke ndị na-efe Chineke na-eme si nyere ha aka ịghọ ndị ohu Jehova.

Abụ nke 10

Izu Na-amalite n’October 15

Abụ nke 67

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa October. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

Nkeji 20: Eziokwu ahụ Ọ̀ Na-amịpụta Mkpụrụ n’Ime Ndị Ị Na-ezi Ihe? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-adabere n’Ụlọ Nche February 1, 2005, peeji nke iri abụọ na asatọ ruo nke iri atọ. Kwuo otú o si bụrụ na a kwadebere ajụjụ ndị dị n’akwụkwọ Bible Na-akụzi iji nyere anyị aka ịghọta ihe dị ndị anyị na-amụrụ Bible n’obi. Tụlee ihe atụ ole na ole, dị ka isi nke mbụ, paragraf nke iri na itoolu; isi nke abụọ, paragraf nke anọ; isi nke atọ, paragraf nke iri abụọ na anọ; na isi nke anọ, paragraf nke iri na asatọ. Gbaa ndị nkwusa ume ka ha jiri akụkụ dị iche iche nke akwụkwọ ahụ na-akụziri ndị mmadụ ihe.

Nkeji 15: Ì Chetara? Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle nke ga-adabere n’Ụlọ Nche August 15, 2007, peeji nke iri na itoolu.

Abụ nke 151

Izu Na-amalite n’October 22

Abụ nke 175

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro a tụrụ na peeji nke asatọ, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche November 1 na Teta! October-December. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro nke abụọ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi.

Nkeji 15: Mkpa ọgbakọ.

Nkeji 20: Nọgidenụ Na-eje Ije Dị Ka Ụmụ nke Ìhè. A ga-agba ndị mmadụ ajụjụ ọnụ n’okwu a. Anyị ahapụla ọchịchịrị nke ụwa a, kpebiekwa ka ìhè Jehova na-eduzi anyị. (Efe. 5:8, 9) Nke a emeela ka ndụ anyị ka mma, nweekwa nzube. (1 Tim. 4:8) Ìhè a na-emekwa ka anyị nwee olileanya. (Rom 15:4) Gbaa ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị ihe mgbochi siri ike bịaarala, ha emeriekwa ya, ka ha na Jehova wee dị ná mma, dịrịkwa ná mma na-aga. Olee ihe ịma aka ndị bịaara ha mgbe ha na-abata n’eziokwu? Olee otú ha si merie ha? Olee otú ndụ ha si ka mma ugbu a? Olee ihe na-enyere ha aka ịnọgidesi ike n’eziokwu? Pịachie okwu gị site n’ịgba mmadụ nile ume ka ha nọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ, na-egosikwa na ha nwere obi ekele nke ukwuu maka eziokwu Jehova na-ekpughe.—2 Pita 1:5-8.

Abụ nke 23

Izu Na-amalite n’October 29

Abụ nke 124

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa October. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na November. Meekwa otu ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee ya.

Nkeji 15: Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Iji Wetara Onye Kere Gị Otuto. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-adabere n’Ụlọ Nche July 15, 2004, peeji nke iri abụọ na otu ruo nke iri abụọ na atọ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo banyere ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị ha setịpụrụ na ihe ha na-eme iji ruo ha. E nwere ike ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’ime ha n’oge ka ha kwadebe ihe ha ga-ekwu.

Nkeji 20: “Mee Ka Ndị Ogbenye Nwee Olileanya.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke abụọ, kwuo ihe e kwuru na Teta! September 8, 2003, peeji nke iri abụọ na isii ruo nke iri abụọ na asaa.

Abụ nke 7

Izu Na-amalite na November 5

Abụ nke 156

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.

Nkeji 15: Ụzọ Isi Jiri Amamihe Chineke Chebe Ụmụ Gị. Okwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche January 1, 2005, peeji nke iri abụọ na atọ ruo nke iri abụọ na asaa.

Nkeji 20: “Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume.”c Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo kpọmkwem otú onye nlekọta na-ejegharị ejegharị si gbaa ha ume n’oge o letara ọgbakọ unu. E nwere ike ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’ime ha n’oge ka ha kwadebe ihe ha ga-ekwu.

Abụ nke 192

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya