Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/07 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na November 12
  • Izu Na-amalite na November 19
  • Izu Na-amalite na November 26
  • Izu Na-amalite na December 3
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 11/07 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na November 12

Abụ nke 59

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa November. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche November 15 na Teta! October-December. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro mbụ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta Ụlọ Nche na Teta! ọnụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu magazin ka a ga-ekwu okwu na ya.

Nkeji 15: “Mụ Nwe Ọlaọcha Nile, Ọ Bụkwa Mụ Nwe Ọlaedo Nile.” Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche November 1, 2007, peeji nke 17-21.

Nkeji 20: “Na-ejenụ Ije Dị Ka Ndị Maara Ihe.”a Dabere n’otú oge e nwere hà, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

Abụ nke 192

Izu Na-amalite na November 19

Abụ nke 109

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa December, meekwa ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee ya.

Nkeji 15: Mkpa ọgbakọ.

Nkeji 20: “Alala Azụ!”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 5, kwuo ihe ụfọdụ ndị mụụrụ mmadụ ihe ha abata n’eziokwu kwuru. Olee otú o si bụrụ na iduzi ọmụmụ Bible na-aga nke ọma na-enye ọṅụ? E nwere ike ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’oge ka ha kwadebe ihe ha ga-ekwu.

Abụ nke 96

Izu Na-amalite na November 26

Abụ nke 172

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa November. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche December 1 na Teta! October-December.

Nkeji 15: Ị̀ Pụrụ Ịgbasapụ Ịhụnanya Gị? Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche January 1, 2007, peeji nke 9-11.

Nkeji 20: Ndị Na-eto Eto—Olee Otú Unu Nwere Ike Isi Too Jehova? Ihe omume ajụjụ na azịza nke a ga-eji ajụjụ ndị dị n’Ụlọ Nche June 15, 2005, peeji nke 26-28, paragraf nke 15-19, mee. Mgbe a na-atụle paragraf nke 18, kpọọ ndị na-eto eto nọ ebe ahụ ka ha kọọ otú ha sirila gbaara ụmụ akwụkwọ ma ọ bụ ndị nkụzi àmà n’ụlọ akwụkwọ.

Abụ nke 5

Izu Na-amalite na December 3

Abụ nke 77

Nkeji 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Tụlee Igbe Ajụjụ.

Nkeji 15: Ụlọ Akwụkwọ nke Ndị Si na Ya Pụta Na-enyere Ndị Mmadụ Aka Gburugburu Ụwa. Okwu ga-adabere n’Ụlọ Nche November 15, 2006, peeji nke 10-13. Jiri nkeji ole na ole gbaa ndị okenye ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi ọ bụla unu nwere n’ọgbakọ unu bụ́ ndị gara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ajụjụ ọnụ. Olee otú ụlọ akwụkwọ ahụ si nyere ha aka inwe ọganihu dị ka ndị na-ekwusa ozi ọma, ndị ọzụzụ atụrụ, na ndị nkụzi? Gbaa ụmụnna nwoke ndị ruru eru ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi ume ka ha lee ma hà ga-eme ya ihe mgbaru ọsọ ha.

Nkeji 15: “Anyị Na-agwa Ndị Ọzọ Banyere Olileanya Anyị Nwere n’Alaeze Chineke.”c Dabere n’otú oge e nwere hà, gwa ụmụnna ka ha kwuo okwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha.

Abụ nke 173

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya