Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na February 25, 2008. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri atọ, ọ ga-adaberekwa n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu January 7 ruo February 25, 2008.
NKÀ OKWU
1. Olee ihe ọ dị mkpa ka anyị mee iji nyere ndị na-ege anyị ntị aka ịghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ anyị gụrụ, oleekwa ihe mere anyị kwesịrị iji mee ya? [be p. 228 para. 2-3]
2. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee ka ndị na-ege ntị mụta ihe n’okwu anyị, oleekwa otú anyị nwere ike isi mee nke a? [be p. 230 para. 3-5, igbe]
3. Olee otú ime nnyocha nwere ike isi mee ka ndị mmadụ mụtakwuo ihe n’okwu anyị? [be p. 231 para. 1-3]
4. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji kọwakwuo amaokwu Baịbụl ndị a maara nke ọma otú a ga-amụta ihe na ha? [be-IB p. 231 para. 4-5]
5. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị tụgharịa uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ anyị gụrụ? [be p. 232 para. 3-4]
IHE OMUME NKE 1
6. Mgbe Jizọs na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya, olee ihe okwu ahụ o kwuru nke dị na Matiu 5:22 pụtara? [w89-IB 7/15 p. 25 para. 1]
7. Olee otú anyị nwere ike isi dozie obi anyị ịnabata ihe ndị Chineke na-akụziri anyị site n’elu ikpo okwu? (2 Ihe 20:33) [be p. 13 para. 4–p. 14 para. 4]
8. Olee ihe ndị mụrụ ụmụ nwere ike ime iji zụọ ụmụ ha ka ha “mara ihe iji nweta nzọpụta”? (2 Tim. 3:15) [be p. 16 para. 3-4]
9. Olee otú anyị nwere ike isi kọwaa ihe Jizọs kwuru na Matiu 9:16, 17? [w89 7/15 p. 25 para. 3]
10. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka ndị ahụ butere nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ kpupụ elu ụlọ? (Mak 2:4) [w89 10/15 p. 30 para. 5]
ỌGỤGỤ BAỊBỤL KWA IZU
11. Mmadụ igosi iwe ya ọ̀ dị njọ karịa onye ahụ ibu ya n’obi? (Mat. 5:21, 22) [w08 1/15 “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Matiu”]
12. Olee otú Ndị Kraịst si enwe anya “na-elegide otu ebe”? (Mat. 6:22, 23) [w06 10/1 p. 29]
13. Olee ihe Jizọs bu n’obi mgbe ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ùnu ghọtara ihe ihe ndị a niile pụtara?” (Mat. 13:51, 52) [w08 1/15 “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Matiu”]
14. Olee ihe mere Jizọs ji enyekarị ndị ọ gwọrọ ọrịa iwu ka ha “ghara ime ka a mata onye ọ bụ”? (Mat. 12:16) [w87-E 5/15 p. 9; cl p. 93-94]
15. Olee ihe Jizọs bu n’obi mgbe o kwuru banyere ‘ihe mmadụ ji atụ ihe’? (Mak 4:24, 25) [w80 12/15 p. 16; gt isi 43]