Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/08 p. 8
  • Ihe Na-egosi na Anyị Nwere Okwukwe!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Na-egosi na Anyị Nwere Okwukwe!
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Mgbe Mbibi Ụwa E Buru Amụma Ya Ga-abịa?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • “Àmà Nye Mba Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 2/08 p. 8

Ihe Na-egosi na Anyị Nwere Okwukwe!

1. Olee ihe ndị na-enye nsogbu n’obi Jizọs kwuru na ha ga-eme?

1 Ndịozi Jizọs gere ya ntị nke ọma mgbe ọ na-akọrọ ha banyere ọnụnọ ya na ọgwụgwụ nke usoro ihe a. Ihe ndị na-enye nsogbu n’obi ga-eme ụmụ mmadụ—agha, ụkọ nri, ala ọma jijiji, na ọrịa na-efe efe. Jizọs kwuziri na a ga-akpọ ndị na-eso ụzọ ya asị, kpagbuo ha, ma gbuo ha. Ndị amụma ụgha ga-ebili ma duhie ọtụtụ ndị. Ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụ oyi.

2. Olee ihe mere o ji bụrụ ihe ijuanya na a na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile?

2 N’ihi ihe ndị a Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ga-emenụ, ọ ghaghị ijuwo ha anya mgbe ọ gwara ha na a ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Mat. 24:3-14) Taa, anyị na-ahụ ka amụma ahụ pụrụ iche na-emezu. Ọ bụ ezie na anyị bi n’oge ọjọọ, Ndịàmà Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ka ịhụnanya nke ndị ụwa na-ajụ oyi, ịhụnanya anyị na-esikwu ike. N’agbanyeghị na “mba niile” kpọrọ anyị asị, anyị na-ekwusa ozi ọma n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná mba niile.

3. Olee ọnụ ọgụgụ ndị na-agba ume ị hụrụ n’akụkọ ozi ụwa niile?

3 Ọ bụ nnọọ ihe na-agba ume ịtụle ozi Ndịàmà Jehova n’afọ ije ozi gara aga, bụ́ nke dị na peeji nke 3 ruo nke 6! Nke a mere ya afọ iri na isii n’akwụsịghị akwụsị anyị ji ihe karịrị otu ijeri awa kwa afọ kwusaa ozi ọma ma mee ndị na-eso ụzọ. Nke a gosiri nnọọ na anyị nwere okwukwe! E nwere mmụba fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent isii n’ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ, ihe ji obere ihe karịa pasent atọ n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa, na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent anọ na ọkara n’ọnụ ọgụgụ ọmụmụ Baịbụl e duziri. Ọnụ ọgụgụ ndị e mere baptizim ji ihe karịtụrụ pasent iri abụọ rịa elu n’afọ ije ozi gara aga. Ọ bụ nnọọ ihe obi ụtọ ịhụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ asaa ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova—nke bụ́ ọnụ ọgụgụ a na-enwetụbeghị mbụ n’ụwa! Ka ị na-atụle chaatị ahụ, olee ihe ị hụrụ nke kasị gbaa gị ume?

4. Olee nsogbu ndị otu nwoke meriri ka ọ na-agbalị iru eru maka baptizim?

4 Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ndị ahụ e depụtara buru ibu, e kwesịtụghị ichefu na ha na-anọchi anya ndị mmadụ, bụ́ ndị gosipụtara okwukwe ha. Tụlee otu ihe atụ. Guillermo toro na Bolivia. A mụrụ ya n’afọ 1935, ọ malitekwara mgbe ọ dị afọ itoolu rụwa ọrụ n’ebe a na-akọ ọgwụ ike bụ́ koken. Ọ malitere mgbe ọ ka bụ nwata tawa akwụkwọ koken iji nyere onwe ya aka idi ọrụ ike ọ na-arụ. O mechara ṅụbigawa mmanya ókè ma na-ese sịga. Ka Guillermo malitere ịmụ ihe ndị Jehova chọrọ ya n’aka, ọ kwụsịrị ise sịga, kwụsịkwa ịṅụbiga mmanya ókè. Nke kasị siere ya ike bụ ịkwụsị ịta akwụkwọ koken. O kpesiri ekpere ike banyere ya ma mechaa kwụsị ịta ya. Mgbe ọ kwụsịrị àgwà ọjọọ ndị ahụ, e mere ya baptizim. O kwuru, sị: “Ugbu a, adị m ọcha, obi dịkwa m nnọọ ụtọ.”

5. Gịnị bụ ọchịchọ gị?

5 Jehova nwere nnọọ mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ. Ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa. (2 Pita 3:9) Nke ahụ bụkwa ihe anyị chọrọ. Ka obi anyị kwalie anyị ime ihe niile anyị nwere ike ime iji na-enyere ndị obi ha ziri ezi aka ịmata Jehova na ịhụ ya n’anya dị ka anyị onwe anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya