Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na January 1-18: E nwere ike inyefe akwụkwọ ọ bụla metụrụla ochie nke ka fọrọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, nyefee akwụkwọ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. January 19–February 15: Nkesa Pụrụ Iche A Ga-ekesa Traktị. February 16-28: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, e nyefee Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. March: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. April na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, nke gụnyere ndị bịara Ncheta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike inyefe ha akwụkwọ Bible Na-akụzi. Nzube anyị ji enyefe ha ya kwesịrị ịbụ iji ya duziwere ha ọmụmụ Baịbụl.
◼ Malite n’izu nke February 23, 2009, anyị ga-amụ akwụkwọ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. Ọgbakọ niile kwesịrị ịhụ na ha nwere ole ga-ezuru ha tupu oge a ga-amalite ịmụ akwụkwọ ahụ.
◼ Ọgbakọ niile kwesịrị ime ndokwa ndị kwesịrị ekwesị iji mee Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a na Thursday, April 9, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọgbakọ nke ọ bụla kwesịrị ime Ncheta Ọnwụ Jizọs nke ha iche. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-anọ n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze amụ ihe, otu ọgbakọ ma ọ bụ karịa nwere ike ịchọta ebe ọzọ ha ga-anọ mee nke ha. N’ebe o kwere mee, anyị na-atụ aro ka a nọọ, ọ dịkarịa ala, nkeji iri anọ e mesịrị otu tupu a na-amalite ọzọ ka mmadụ niile nwee ike ikele onwe ha mgbe Ncheta Ọnwụ Jizọs gasịrị.
◼ Ná mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ndị a ga-enwe n’afọ 2009, sekit ndị na-esonụ ga-enwe ebe e debeere ndị ntị chiri oche, a ga-eji asụsụ ndị ogbi (ASL) tapịaara ha ihe omume ahụ:
Akabo (EE-08) Jan. 3-4 na Apr. 19
Akabo (EE-24) Feb. 7-8 na May 16
Akure (WE-12) Feb. 7-8 na Aug. 9
Awi (EE-21) Feb. 7 na May 2-3
Badagry (WE-02) Apr. 4-5 na July 19
Benin City (ME-01) Mar. 7-8 na June 6
Daluwon (WE-29) Mar. 14-15 na June 14
Enugu (EE-17) Jan. 3-4 na Apr. 4
Ibadan (WE-10) Jan. 24-25 na Apr. 4
Igwuruta Ali (EE-22) Feb. 22 na July 4-5
Ilesa (WE-15) Apr. 11-12 na July 4
Ilorin (WE-17) Apr. 11 na Aug. 1-2
Kaduna (NE-1b) Mar. 7-8 na Aug. 8
Ota (WE-25) Apr. 12
Ubogo (ME-07) Feb. 14 na June 6-7
Uyo (EE-20) Apr. 5 na July 18-19