Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na February 1-15: Nkesa Pụrụ Iche A Ga-ekesa Traktị. February 16-28: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, e nyefee Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. March: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. April na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, nke gụnyere ndị bịara Ncheta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike inyefe ha akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Nzube anyị ji enyefe ha ya kwesịrị ịbụ iji ya duziwere ha ọmụmụ Baịbụl.
◼ Malite n’izu mbụ nke ọnwa March, isiokwu okwu ihu ọha ọhụrụ ndị nlekọta sekit ga na-ekwuzi bụ “Jụ Ihe Ndị Na-emegharị Anya nke Ụwa, Na-achọ Ihe Ndị Gbasara Alaeze Chineke.”
◼ Isiokwu nke okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ 2009 ga-abụ “Ò Nwere Okpukpe Chineke Weere Ka Ezi Okpukpe?” Lee ịma ọkwa yiri ya nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2008.
◼ A chọrọ ndị nsụgharị n’asụsụ Isoko n’alaka ụlọ ọrụ anyị. Ndị chọrọ ka a kpọọ ha kwesịrị ịma ka e si asụ, ka e si agụ, na ka e si ede Bekee nakwa Isoko nke ọma. Onye ọ bụla nke chere na ya ga-emeli ya ma chọọkwa ije ozi na Betel kwesịrị idetara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi. Onye ahụ kwesịrị ịbụ onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nakwa onye na-enweghị ihe nwere ike igbochi ya ije ozi na Betel.