Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na March 2
IZU NA-AMALITE NA MARCH 2
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isi nke 1 ¶10-18, igbe dị na peeji nke 13
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 36-39
Nke 1: Jenesis 39:1-16
Nke 2: Ndị Ọzọ Dị Elu Karịa Anyị (lr isi nke 8)
Nke 3: Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ? (td 27A)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa February.
Nkeji 10: Ime Ka A Mara Aha Chineke. Okwu a ga-eji ịnụ ọkụ n’obi kwuo nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 273-274.
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Zaa Ajụjụ Ndị Metụtara Mmịnye Ọbara. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-esi na broshuọ Na-achọ, Ihe Ọmụmụ nke 12, paragraf nke 1, 5, na nke 6. Gwa otu onye ọsụ ụzọ ka o mee ihe ngosi otú ọ ga-esi jiri ihe ndị dị na paragraf nke 5 na nke 6 zaa ajụjụ bụ́ “Gịnị mere na unu anaghị ekwe ka a mịnye unu ọbara?”
Nkeji 10: Akwụkwọ A Ga-enyefe na March. Jiri nkeji ole na ole tụlee ihe ndị dị n’akwụkwọ a ga-enyefe. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ na amaokwu Baịbụl ndị ha ga-agụrụ ndị mmadụ tupu ha enyefee ya. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke otú e nwere ike isi nyefee ya.