Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na March 9
IZU NA-AMALITE NA MARCH 9
Abụ nke 202
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 40-42
Nke 1: Jenesis 40:1-15
Nke 2: Ọ Dị Anyị Mkpa Iguzogide Ọnwụnwa (lr Isi nke 9)
No. 3: Nke 3: Kpachara Anya Ka Ị Ghara Ịbụ Onye Na-eme Ihe Otú Masịrị Ya!
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ná mkpirikpi otu ahụmahụ ma ọ bụ abụọ nke otú ha si nyefee magazin nakwa otú ndị nwe ụlọ si nabata ya.
Nkeji 15: Mgbe Ndị Ọzọ Chọrọ Ka A Kọwaara Ha Ihe. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-esi n’isiokwu nta malitere na peeji nke 177 n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. Mee ihe ngosi nke otú onye nkwusa nwere ike isi zaa onye ọrụ ibe ya ma ọ bụ nwa akwụkwọ ibe ya nke jụrụ ya ajụjụ banyere ihe ndị anyị kweere. Onye nkwusa ahụ ejiri “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu” zaa ajụjụ ahụ.—1 Pita 3:15.
Nkeji 15: “Kwadebe nke Ọma Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Kwuo nhazi ọgbakọ unu na-eme maka Ncheta Ọnwụ Jizọs.
Abụ nke 192