Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’April 27, 2009. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri abụọ, ọ ga-adaberekwa n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu nke March 2 ruo April 27, 2009.
1. Olee otú Josef si merie ọnwụnwa na-abịara ya kwa ụbọchị? (Jen. 39:7-12) [lv p. 105 para. 18–p. 106 para. 20]
2. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ememme ncheta ụbọchị ọmụmụ? (Jen. 40:20-22) [lv p. 150 para. 9–p. 151 para. 11]
3. Olee otú Josef si gosi anyị ihe nlereanya magburu onwe ya nke otú anyị ga-esi na-agbaghara ndị mejọrọ anyị? (Jen. 45:4, 5) [w99 1/1 p. 31 para. 2-3]
4. Gịnị mere Josef ji kwuo, sị: “Unu ga-achịrị ọkpụkpụ m pụọ n’ebe a”? (Jen. 50:25) [w07 6/1 p. 28 para. 10]
5. Olee ihe nwere ike ime ka obi sie anyị ike ma anyị nweta ọrụ siri ike? (Ọpụ. 4:10, 13) [w04 3/15 p. 25 para. 4]
6. Olee ihe si n’otú Jehova si mesoo Fero ihe pụta, oleekwa otú ihe omume ndị ahụ kwesịrị isi metụta anyị? (Ọpụ. 9:13-16) [w05 5/15 p. 21 para. 8]
7. Gịnị ka ihe a kọrọ n’Ọpụpụ 14:30, 31 na-akụziri anyị taa? [w04 3/15 p. 26 para. 5]
8. Dị ka Ọpụpụ 16:1-3 na-egosi, gịnị mere ime mkpesa ji jọgbuo onwe ya? [w93 3/15 p. 20 para. 2–p. 21 para. 2]
9. Dị ka e kwuru n’ọgbụgba ndụ iwu ahụ e dekọrọ n’Ọpụpụ 19:5, 6, ruo ókè ha aṅaa ka Izrel bụ “alaeze nke ndị nchụàjà na mba dị nsọ”? [w95 7/1 p. 16 para. 8]
10. Olee otú iwu nke iri banyere anyaukwu si karịa iwu ndị mmadụ nyere? (Ọpụ. 20:17) [w06 6/15 p. 23-24 para. 16]