Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/09 p. 8
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2009
Ozi Alaeze Anyi—2009
km 4/09 p. 8

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’April na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, nke gụnyere ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike inyefe ha akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Nzube anyị ji enyefe ha ya kwesịrị ịbụ iji ya duziwere ha ọmụmụ Baịbụl. June: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ ahụ, ndị nkwusa nwere ike inye ha akwụkwọ ochie ọ bụla e nwere n’ọgbakọ ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu afọ 1992.

◼ Obi dị anyị ụtọ ime ka unu mara na na July 4-5 nakwa na September 6 nke afọ a bụ́ 2009, a ga-enwe mgbakọ sekit na mgbakọ ụbọchị pụrụ iche n’asụsụ French n’obodo Badagry. A ga-enwekwa mgbakọ sekit na mgbakọ ụbọchị pụrụ iche n’asụsụ ndị ogbi na Benin City na May 2-3 nakwa n’August 23. Ihe omume niile a ga-eme ná mgbakọ Badagry ahụ ga-abụ naanị n’asụsụ French, ebe nke Benin City ahụ ga-abụkwa naanị n’asụsụ ndị ogbi. Ndị niile na-aghọta asụsụ ndị a nwere ike ịbịa.

◼ Mgbe ọ bụla ị chọrọ ịga mba ọzọ ma na-atụ anya iso ndị ebe ahụ gaa ọmụmụ ihe, mgbakọ sekit, mgbakọ pụrụ iche, ma ọ bụ mgbakọ distrikti, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ nke na-elekọta ọrụ ná mba ahụ ka ị ga-ajụ ajụjụ iji mata ụbọchị, oge, na ebe ndị a na-enwe nzukọ ma ọ bụ mgbakọ nke ọ bụla. E depụtara adres alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na peeji ikpeazụ nke Yearbook kacha ọhụrụ.

◼ Biko tinyekwuonụ nọmba a 07080662020 na nọmba telefon ndị unu na-eji akpọ alaka ụlọ ọrụ. Unu nwekwara ike iji nọmba ndị a kpọọ anyị: 07089999300; 08055502368; 08055502369; 08055502370; 08055502371. Anyị chọrọ ime ka unu mara na ka ọ dị ugbu a, nọmba ọ ga-abụ unu kpọọ unu enweta anyị ozugbo bụ 07080662020. Oge anyị ji arụ ọrụ na Betel malite na Monday ruo na Friday bụ 7:30 nke ụtụtụ ruo 11:50 nke ụtụtụ malitekwa na 1:00 nke ehihie ruo 5:00 nke mgbede; n’ụbọchị Saturday anyị na-amalite na 7:30 nke ụtụtụ ruo 11:30 nke ụtụtụ. Oge ndị a gafee, nwanna ga-aza gị ma ị kpọọ nwere ike ọ gaghị azacha gị ihe niile ị jụrụ.

◼ Na May 29 na 30, 2009, a gaghị anabata ndị ọbịa n’alaka ụlọ ọrụ Betel dị n’Igieduma. N’ihi ya, biko, abịakwala nleta ma ọ bụ iburu akwụkwọ n’ụbọchị ndị ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya