Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na May 11
IZU NA-AMALITE NA MAY 11
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 27-29
Nke 1: Ọpụpụ 29:1-18
Nke 2: Ụzọ Isi Nwee Obi Ụtọ (lr isi nke 17)
Nke 3: Iguzosi Ike n’Ihe nke Hiere Ụzọ na Ihe Ize Ndụ Dị na Ya
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma Ọkwa.
Nkeji 10: Ì Nwere Ike Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka n’Oge Ezumike? Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke si na peeji nke 112-113 n’akwụkwọ Ndị A Haziri. Kọwaa ihe ndị a chọrọ n’aka onye chọrọ iwere ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, gwakwa ndị rụtụrụla ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ka ha kọọ ngọzi ndị ha nwetara.
Nkeji 10: Gị na Ndị Ezinụlọ Gị Kwadebe Ozi Ọma! Jiri nkeji ole na ole gbaa ndị isi ezinụlọ abụọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị na-ewepụtatụ oge n’oge ha ji enwe Ofufe Ezinụlọ ma jiri ya na-akwadebe ozi ọma. Olee otú ha si akwadebe, oleekwa uru ndị ọ baarala ha? Gwa otu ezinụlọ ka ha mee ihe ngosi ebe onyeisi ezinụlọ ahụ na-akụziri ụmụ ya otú ha ga-esi nyefee magazin n’oge a nọ ọrụ magazin.
Nkeji 10: “Na-akụzi Ihe Otú Ọ Ga-adị Mfe Nghọta.” Ajụjụ na Azịza.
Abụ nke 158