Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’August 3
IZU NA-AMALITE NA AUGUST 3
Abụ nke 198
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 4-6
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 4:1-16
Nke 2: Ụzọ Isi Mata Onye A Ga-erubere Isi (lr isi nke 28)
Nke 3: Alaeze Chineke Agwụla Ihe Ga-agwọta Nsogbu Ụwa (td 1D)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 166
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Gbaa ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị garala ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu ma ọ bụ n’ókèala a na-adịghị ezikarị ozi ọma na ya. Olee ihe nọ na-echegbu ha mgbe ha chọrọ ịga, oleekwa otú ha si merie ya? Olee otú Jehova si gọzie mgbalị ha? Ha jiri nkeji ole na ole kọọ otu ahụmahụ ma ọ bụ abụọ ha nwetara mgbe ha na-eje ozi n’ebe ahụ, ma ọ bụkwanụ ha emee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke ahụmahụ ha nwetara n’ebe ahụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Dabere n’Ebe Jehova Nọ Mgbe Ị Na-azụlite Ikike Gị Dị Ka Onye Ozizi. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 56, paragraf nke 1 ruo peeji nke 57, paragraf nke 2.
Abụ nke 171