Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’October 19
IZU NA-AMALITE N’OCTOBER 19
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isi nke 11 ¶20-22, igbe dị na peeji nke 131
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 7-10
Nke 1: Diuterọnọmi 9:1-14
Nke 2: Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Hụ Jizọs n’Anya (lr isi nke 38)
Nke 3: E Nwere Ike Ịsọpụrụ Mmadụ, Ma Naanị Chineke Ka A Ga-efe Ofufe (td 15B)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Ime Nnyocha Na-eme Ka Mmadụ Ghọtakwuo Ihe. Okwu si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 33 ruo n’isiokwu nta dị na peeji nke 34. Kwuo ya ka ebe ndị nkwusa na-akọwara ndị ha na-amụrụ ihe otú ha ga-esi na-eme nnyocha iji mee ka okwukwe ha sikwuo ike nakwa ka ha nwee ike ruo eruo ịmalite izi ozi ọma. Gwa otu onye nkwusa ka o mee ihe ngosi ebe onye nkwusa na-enyere onye ọ na-amụrụ ihe aka ka ọ ghọta uru ime nnyocha bara.
Nkeji 15: “Iji Telefon Agba Àmà Na-aba Uru.” Ajụjụ na azịza. Gwa ndị nkwusa abụọ ka ha jiri akwụkwọ a na-enyefe n’ọnwa ahụ mee ihe ngosi abụọ. Ọ bụrụ na iji telefon agba àmà agaghị adaba n’ókèala unu, gị na ndị na-ege ntị tụlee ihe dị n’Ụlọ Nche July 1, 2004, peeji nke 12 na nke 13, paragraf nke 14-19.