‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
1. Olee ihe anyị na-aga ịmụ n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ n’ọnwa ndị na-abịa abịa?
1 N’Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn, bụ́ ebe e dere banyere otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa, a kọrọ ọtụtụ ihe ga-eme ka anyị mara onye Ọkpara Chineke bụ nke ọma. Ebe ọ bụ na Ndị Kraịst ‘ga-esochi nzọụkwụ ya anya,’ anyị kwesịrị ịkwadebe nke ọma ma gee nnọọ ntị mgbe a na-amụ akwụkwọ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’ n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ malite n’izu Mach 1. (1 Pita 2:21; Mak 10:21) Ebe dị ezigbo mkpa ilebara anya bụ otú ozi Jizọs ga-esi enyere anyị aka imekwu nke ọma n’ozi anyị.
2. Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Jizọs si die ule na ọnwụnwa ndị bịaara ya?
2 Ihe Nlereanya Jizọs Setịpụrụ: Ò nwetụla mgbe ị hụrụ onye n’enweghị mmasị mgbe ị nọ ozi ụlọ n’ụlọ? Anyị hụ ụdị onye ahụ, anyị na-echeta ihe Jizọs kwuru, nke bụ́: “Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:20) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị ndị niile n’enweghị mmasị n’ozi anyị na-akpagbu anyị. Ma, ọ bụ ọṅụ e debere n’ihu Jizọs nyeere ya aka idi ụdị ule na ọnwụnwa ọ bụla bịaara ya. Anyịnwa kwesịkwara ilekwasị anya n’otú Jehova ga-esi gụọ anyị ná ndị ezi omume nakwa n’ihe ọ ga-emere anyị ma anyị rubere ya isi. Nke a ga-enyere anyị aka ịghara ‘ịda mbà ná mkpụrụ obi anyị.’ (Hib. 12:2, 3; Ilu 27:11) Ọ bụrụ na anyị ana-agbasi mbọ ike n’ozi anyị, obi kwesịrị isi anyị ike na Kraịst Jizọs ga na-akwado anyị.—Mat. 28:20.
3. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs n’otú o si were ozi ọma ahụ?
3 “Ọ Bụ Nke A Mere E Ji Zite M”: Ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụ ọrụ bụ́ isi Jizọs rụrụ n’ụwa. (Luk 4:43) O wepụtara nnọọ oge ya maka ozi ọma. O weere ya ka ọrụ dị ezigbo mkpa, ọ na-ejikwa ohere ọ bụla dapụtaranụ akọrọ ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, olee otú anyị ga-esi eso nzọụkwụ ya? Ka anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị, è nwere ndị anyị nwere ike ikwusara ozi ọma? Ka ịhụnanya nke Kraịst nwere kpalie anyị ikwusa ozi ọma n’ebe niile o kwere anyị mee!—2 Kọr. 5:14.
4. Olee ụzọ anyị ga-esi mee ka otú anyị si ekwusa ozi ọma kakwuo mma?
4 “Ọ Dịtụbeghị Onye Ọzọ Si Otú A Kwuo Okwu”: Otú Jizọs si kụzie ihe tụrụ ndị na-ege ya ntị n’anya. (Jọn 7:46; Mat. 7:28, 29) Gịnị mere o ji pụọ iche ná ndị nkụzi ndị ọzọ? Ọ hụrụ eziokwu ọ kụziri n’anya, ọ hụrụ ndị ọ kụziiri ihe n’anya, ọ makwaara ụzọ dị iche iche e si akụzi ihe. Ọ bụrụ na anyị eṅomie Onye Ozizi Ukwu ahụ, otú anyị si ekwusa ozi ọma ga-akakwu mma.—Luk 6:40.
5. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime ka anyị na-amụ akwụkwọ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’?
5 Ndị a bụ ụfọdụ ihe ndị magburu onwe ha e kwuru banyere ndụ Jizọs. Olee ihe ndị ọzọ dị oké mkpa anyị nwere ike ịmụta banyere Jizọs? Ka ị na-amụ banyere ndụ Jizọs n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, kpebisie ike “ịmara ịhụnanya nke Kraịst” site n’iṅomi ya ma n’okwu ọnụ ma n’omume.—Efe. 3:19.