Ọrụ Kacha Mkpa Anyị Kwesịrị Ịrụ
1. Olee mgbalị ndị anyị ga-eme iji gosi na anyị nwere ezigbo mmasị n’ozi anyị?
1 Gịnị mere e ji agbakarị anyị ume ka anyị jiri oge anyị, ume anyị, na ihe ndị anyị nwere na-akwado ọrụ ikwusa ozi ọma? Ọ bụ n’ihi na o nweghị ọrụ ọzọ ka mkpa karịa ọrụ ikwusa ozi ọma! Ịtụgharị uche n’ihe ndị mara mma a na-arụpụta n’ozi anyị ga-enyere anyị aka ime ike anyị niile n’ọrụ a a na-agaghị arụ ọzọ.—Ọrụ 20:24.
2. Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si eme ka e doo aha ukwuu Jehova nsọ?
2 Ọ Na-edo Aha Jehova Nsọ: Anyị ji ozi ọma anyị na-ekwusa na-eme ka ụmụ mmadụ mara na Kraịst Jizọs ga-eji Alaeze Jehova dochie ọchịchị ụmụ mmadụ ma mee ka nsogbu ha niile bie. (Mat. 6:9, 10) Anyị na-eto Jehova mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ na ọ bụ naanị ya ga-ewepụrụ ụmụ mmadụ ọrịa na ọnwụ. (Aịza. 25:8; 33:24) Ebe anyị na-aza aha ya, àgwà ọma anyị na ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere ike ime ka ndị na-ahụ anyị too Jehova. (1 Pita 2:12) Ime ka ụmụ mmadụ mara aha Ọkaakaa Onyenwe Anyị Jehova n’ụwa niile na-enye anyị ezigbo ọṅụ!—Ọma 83:18.
3. Olee ngozi ndị na-ege anyị ntị n’ozi Alaeze ahụ na-enweta?
3 Ọ Na-azọpụta Ndụ: Jehova ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.’ (2 Pita 3:9) Ma, olee otú ndị mmadụ ga-esi mara ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi n’anya Jehova ma ọ bụrụ na e nweghị onye ziri ha ihe? (Jona 4:11; Rom 10:13-15) Ọ bụrụ na ndị mmadụ egee ntị n’ozi ọma, ọ na-eme ka ha kwụsị ibi ndụ ọjọọ, ndụ ha akakwuo mma. (Maị. 4:1-4) E wezụga nke ahụ, ha na-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ ihe, anyị ga-azọpụta onwe anyị, zọpụtakwa ndị na-ege anyị ntị. (1 Tim. 4:16) Anyị nwere nnọọ ihe ùgwù iso na-arụ ọrụ a kacha mkpa!
4. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-eme ndị na-eso ụzọ?
4 N’oge na-adịghị anya, a ga-enwe oké mkpagbu nke ga-eme ka e bibie ụwa ọjọọ a mgbe a na-atụghị anya ya. A ga-azọpụta ndị fere Jehova ofufe. N’ihi ya, taa, ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ bụ ọrụ kacha mkpa, nke bara uru ma kwesị ka a rụọ ya ngwa ngwa. Ka anyị were ọrụ a ka ọrụ kacha mkpa ná ndụ anyị!—Mat. 6:33.