Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Ozi Kwesịrị Ịna-ekpe Ekpere
1. Gịnị dị anyị mkpa iji jezuo ozi anyị?
1 Anyị agaghị arụli ọrụ ikwusa ozi ọma n’ike aka anyị. Jehova na-enye anyị ike anyị ji arụ ya. (Fil. 4:13) Ọ na-eji ndị mmụọ ozi ya enyere anyị aka ịchọta ndị yiri atụrụ. (Mkpu. 14:6, 7) Ọ bụ Jehova na-eme ka mkpụrụ nke eziokwu anyị kụrụ ma gbaa mmiri na-eto. (1 Kọr. 3:6, 9) Ọ dị ezigbo mkpa ka Ndị Kraịst bụ́ ndị ozi na-ekpegara Nna anyị nke eluigwe ekpere!
2. Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ikpe n’ekpere?
2 Maka Onwe Anyị: Anyị kwesịrị ikpe ekpere mgbe ọ bụla anyị chọrọ ịga ozi ọma. (Efe. 6:18) Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ikpe n’ekpere? Anyị nwere ike ịrịọ Chineke ka o nyere anyị aka ka anyị ghara ichewe na e nweghị ndị ga-ege anyị ntị nakwa ka o nye anyị ike ikwu okwu n’atụghị egwu. (Ọrụ 4:29) Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o mee ka anyị hụ ndị obi ha ziri ezi anyị ga-amụwara Baịbụl. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ajụọ anyị ajụjụ, anyị nwere ike ikpe ekpere n’obi anyị ka Jehova nyere anyị aka ịza ajụjụ ahụ nke ọma. (Nehe. 2:4) Anyị nwekwara ike ịrịọ ya ka o nye anyị amamihe nke ga-eme ka anyị jiri ozi anyị kpọrọ mkpa. (Jems 1:5) Ihe ọzọkwa bụ na obi na-adị Jehova ụtọ ma anyị kelee ya maka ihe ùgwù o nyere anyị ịbụ ndị ozi ya.—Kọl. 3:15.
3. Olee otú ikpe ekpere maka ndị ọzọ si eme ka ozi anyị na-aga n’ihu?
3 Maka Ndị Ọzọ: Anyị kwesịkwara ‘ikpere ibe anyị ekpere.’ N’oge ọ dabara adaba, anyị nwedịrị ike ịkpọ aha ndị nkwusa ibe anyị n’ekpere. (Jems 5:16; Ọrụ 12:5) Ọrịa ọ̀ na-eme ka ị ghara ịga ozi ọma otú ị gaara achọ ịga? Ya bụrụ otú ahụ, rịọ Chineke ka o nyere ndị nkwusa ibe gị ahụ́ gbasiri ike aka. Echela na o nweghị uru ikpe ekpere maka ha ga-abara ha! Ọ dịkwa mma ikpe ekpere ka ndị ọchịchị kwe ka anyị na-ekwusa ozi ọma, ka ụmụnna anyị “wee na-ebi ndụ dị nwayọọ na nke dị jụụ.”—1 Tim. 2:1, 2.
4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nọgidesie ike n’ekpere?
4 Ikwusa ozi ọma n’elu ụwa dum mmadụ bi abụghị obere ọrụ. Ọ bụrụ na anyị ‘anọgidesie ike n’ekpere,’ Jehova ga-enyere anyị aka ijezu ozi anyị.—Rom 12:12.