Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 17
IZU NA-AMALITE NA MEE 17
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cf isi nke 4 ¶19-24, igbe dị na peeji nke 45
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:2 Samuel 9-12
Nke 1: 2 Samuel 10:1-12
Nke 2: Gịnị Mere Jizọs Ji Hiwe Ozizi Ya Isi n’Akwụkwọ Nsọ? (Jọn 7:16-18)
Nke 3: Ekwensu Ọ̀ Bụ Onye Dị Adị? (td 10A)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Ì Nwere Ike Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka n’Ọnwa Ndị Na-abịa Abịa? Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Jiri nkeji ole na ole tụlee ihe dị n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 112-113. Kọwaa ihe a chọrọ n’aka mmadụ tupu ya eruo eruo ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Gwa ndị rụrụla ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’oge ezumike ụmụ akwụkwọ, ma ọ bụ nke ndị ọrụ Bekee, ka ha kọọ ngọzi ndị ha nwetara.
Nkeji 10: Ụzọ Ndị E Si Ekwusa Ozi Ọma—Ịgba Àmà n’Oge A Na-anọghị n’Ozi. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 101, paragraf nke 2, ruo peeji nke 102, paragraf nke 2. Gwa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ka ha kọọ ahụmahụ mara mma gbasara otú ha si gbaa àmà n’oge ha na-anọghị n’ozi, ma ọ bụkwanụ ha emee ihe ngosi otú o si mee.
Nkeji 10: “Ndị Kraịst Bụ́ Ndị Ozi Kwesịrị Ịna-ekpe Ekpere.” Ajụjụ na azịza.