Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Jun 28, 2010. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a, bụ́ nke ga-ewe nkeji iri abụọ. Ihe ndị a ga-atụle ga-abụ ihe ndị a mụrụ n’izu Mee 3 ruo izu Jun 28, 2010.
1. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’uju ahụ Devid ruuru Abna? (2 Sam. 3:31-34) [w05 5/15 p. 17 para. 6; w06 7/15 p. 21 para. 9-10]
2. Gịnị ka anyị na-amụta na 2 Samuel 5:12? [w05 5/15 p. 17 para. 7]
3. Ọ bụrụ na mmadụ bu ezi ihe n’obi mebie iwu Chineke, nke ahụ ọ̀ ga-eme ka ihe o mere bụrụ ezi ihe? (2 Sam. 6:1-7) [w07 7/15 p. 19 para. 13]
4. Olee otú omume Devid mesoro Mefiboshet si bụrụ obiọma, oleekwa otú o si gbasa anyị? (2 Sam. 9:7) [w02 5/15 p. 19 para. 5]
5. Gịnị ka anyị na-amụta n’adịm ná mma Ịtaị onye Gat na Eze Devid? (2 Sam. 15:19-22) [w09 5/15 p. 27-28]
6. Olee otú anyị ga-esi jiri Baịbụl gosi na ebubo ahụ Zaịba boro Mefiboshet bụ ebubo ụgha? (2 Sam. 16:1-4) [w02 2/15 p. 14-15 para. 11, ihe e dere n’ala ala peeji.]
7. Mgbe Devid gwara Bazilaị, bụ́ nwoke dị afọ iri asatọ, ka o soro ya biri n’obí eze ya, gịnị mere Bazilaị ji kwuo ka Devid kpọrọ Kimham? (2 Sam. 19:33-37) [w07 6/1 p. 24 para. 13]
8. Olee otú ịdị umeala n’obi Jehova si mee ka Devid dịrị ukwuu? (2 Sam. 22:36) [w07 11/1 p. 5 para. 2; w04 11/1 p. 29]
9. Gịnị mere Adọnaịja ji nwaa iweghara ọchịchị mgbe Devid ka dị ndụ? (1 Eze 1:5) [w05 7/1 p. 28 para. 5]
10. Gịnị mere Jehova ji zaa Sọlọmọn ekpere o kpere ka o nye ya amamihe na nghọta? (1 Eze 3:9) [w05 7/1 p. 30 para. 2]