Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 19
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 19
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cf isi nke 7 ¶17-21, igbe dị na peeji nke 75
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Eze 12-14
Nke 1: 1 Ndị Eze 12:12-20
Nke 2: Gịnị Ga-enyere Anyị Aka Ile Ụmụnna Anyị Anya Otú Jehova Si Ele Ha?
Nke 3: Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa n’Oge A Esighị n’Aka Chineke (td 19CH)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Ụzọ Ndị Ị Pụrụ Isi Mụbaa Ozi Gị—Nkebi nke Abụọ. Okwu si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 112, paragraf nke 3, ruo peeji nke 114, paragraf nke 1. Gbaa otu onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ abụọ ajụjụ ọnụ ka ha kwuo otú ha si hazigharịa ihe ndị ha na-eme iji nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile.
Nkeji 10: Otú E Si Ejikere Ịmaliteghachi Ịga Ụlọ Akwụkwọ. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Jụọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo nsogbu ụfọdụ ndị na-eto eto, bụ́ Ndị Kraịst, na-enwe n’ụlọ akwụkwọ. Kọwaa otú ndị nne na nna nwere ike isi jiri oge Ofufe Ezinụlọ kọwaara ụmụ ha otú ha ga-esi merie ọnwụnwa ma ọ bụ kọwaara mmadụ ihe ha kweere. Jiri akwụkwọ Index, akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị, na akwụkwọ anyị ndị ọzọ gosi otú ndị nne na nna nwere ike isi mee ya. (1 Pita 3:15) Họrọ otu isiokwu ma ọ bụ isiokwu abụọ ma kwuo ihe ụfọdụ akwụkwọ anyị kwuru, bụ́ ndị ga-enyere ụmụ akwụkwọ aka. Jụọ ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha sirila gbaa àmà n’ụlọ akwụkwọ.
Nkeji 10: “Àna M Eme Ike M Niile?” Ajụjụ na azịza.