Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 20
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 20
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cf isi nke 10 ¶18-23, igbe dị na p. 107
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Eze 19-22
Nke 1: 2 Ndị Eze 20:1-11
Nke 2: Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Dịrị Nwayọọ n’Obi? (Mat. 5:5)
Nke 3: Ihe Ife Ihe Oyiyi Ofufe Na-akpata (td 17B)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee n’Afọ Ije Ozi Gara Aga? Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Kwuo ihe ọgbakọ unu rụzuru n’afọ ije ozi gara aga, lekwasị anya n’ihe dị mma unu rụzuru ma jaa ọgbakọ mma. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ nwere ahụmahụ ndị tọrọ ụtọ ajụjụ ọnụ. Kwuo otu ebe ma ọ bụ ebe abụọ ọgbakọ unu ga-agbalị imekwu nke ọma n’afọ ije ozi ọhụrụ a anyị banyere, tụọkwa aro ga-enyere ha aka imekwu nke ọma n’ebe ndị ahụ.
Nkeji 10: “Ntụziaka Maka Ndị Na-eme Ihe Omume ná Nzukọ Ije Ozi.” Okwu okenye ga-ekwu.
Nkeji 10: Nyere Nwa Gị Aka Ịghọ Onye Nkwusa. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ndị A Haziri peeji nke 82. Gbaa otu nne ma ọ bụ nna na-eme nke ọma n’ọgbakọ ajụjụ ọnụ. Ọ ga-abụ onye nwa ya na-eto eto bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Olee otú o si nyere nwa ya ahụ aka iru eru ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim?