Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 28
IZU NA-AMALITE NA MACH 28
Abụ nke 45 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 1 ¶16-21 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Job 11-15 (Nkeji 10)
Nke 1: Job 13:1-28 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ “Onyenwe Ụbọchị Izu Ike”—Mat. 12:8 (Nkeji 5)
No. 3: A Pụrụ Ịsọpụrụ Mmadụ, ma Naanị Chineke ka A Ga-efe Ofufe—td 15B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’Eprel, meekwa ihe ngosi otú e nwere ike isi bido ọmụmụ Baịbụl mgbe a gara nletaghachi na nke onye naara magazin.
Nkeji 10: Ịkwado Ọrụ Alaeze n’Ógbè Anyị na n’Ụwa Niile. Okwu si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 127 ruo peeji nke 129, paragraf nke 2.
Nkeji 10: Jikere Inyefe Magazin n’Ọnwa Eprel. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo ihe ndị dị na magazin ndị ahụ. Họrọzie isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ n’ime ha ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ ma ha chọọ iji otu n’ime isiokwu ahụ nyefee magazin ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ onye ahụ. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla.
Nkeji 10: “Ị̀ Bụbu Onye Ọsụ Ụzọ Oge Niile?” Ajụjụ na azịza. Ọ bụrụ na unu nwere onye kwụsịburu ọrụ ịsụ ụzọ oge niile ma mechaa bido ya mgbe ihe kaara ya mma, jiri nkeji ole na ole gbaa ya ajụjụ ọnụ. Gịnị nyeere ya aka ịmaliteghachi ọrụ ịsụ ụzọ oge niile? Olee ngọzi ndị o nwetarala?
Abụ nke 6 na Ekpere