Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 11
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 11
Abụ nke 34 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 6 ¶9-16 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Abụ Ọma 69-73 (Nkeji 10)
Nke 1: Abụ Ọma 72:1-20 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Sayensị nke Ziri Ezi Kwekọrọ n’Otú Baịbụl Kọrọ E Si Kee Ihe—td 35A (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Ndị Na-eto Eto Nwere Ike Ịmụta n’Aka Eze Hezekaya na Josaya (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Jiri Ajụjụ Na-akụzi Ihe nke Ọma—Nkebi nke 3. Okwu si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 238, paragraf nke 5 ruo peeji nke 239, paragraf nke 4. Jiri nkeji ole na ole mee ihe ngosi otú e nwere ike isi mee otu ihe ma ọ bụ ihe abụọ e kwuru na ya.
Nkeji 10: “Nwee ‘Obi Ọmịiko.’” Ajụjụ na azịza.
Nkeji 10: Chọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa. (Fil. 1:10) Gbaa otu nna ma ọ bụ nna abụọ nwere ezinụlọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị nwere ọrụ ha na-arụ ma ọ bụkwanụ ndị nwere ibu ezinụlọ ha bu. N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-agachi ozi ọma anya ma na-anụ ọkụ n’obi. Olee otú ha si ewepụta oge na-agachi ozi ọma anya n’agbanyeghị na ha nwere ọtụtụ ihe ha na-eme? Olee uru ịgachi ozi ọma anya baarala ha na ezinụlọ ha?
Abụ nke 73 na Ekpere