Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye n’ọnwa Septemba: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ha achọghị ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl, e nwere ike nye ha magazin ọ bụla merela ochie ma ọ bụkwanụ broshuọ ọ bụla ga-amasị ha. Ọktoba: Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ nwere mmasị, nye ya traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? Gbalịakwa malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Nọvemba: Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? Ọ bụrụ na unu enweghị broshuọ a, unu nwere ike inye ndị mmadụ broshuọ ndị ahụ e kwuru ka e nye n’ọnwa Ọgọst. Ọ bụrụkwa na unu nwere ya, unu nwekwara ike nyekọta ya na ndị nke ọnwa Ọgọst. Disemba: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere ụmụaka, nye ha akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ma ọ bụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge ncheta ọnwụ Jizọs nke afọ 2012 n’izu na-amalite n’Eprel 2, 2012. A ga-agwa unu isiokwu ya ka oge na-aga. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu ya tupu Ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs.
◼ Ndị nkwusa ndị ga-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach afọ 2012 ga-eji aka ha kpebie ma hà ga-enye awa iri atọ n’ọnwa ahụ ma ọ̀ bụkwanụ awa iri ise. Ọ bụrụkwa na onye nlekọta sekit ga-eleta ọgbakọ unu n’ọnwa Mach 2012, ndị niile na-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ ga-eso ndị ọsụ ụzọ oge niile gaa nzukọ ha na onye nlekọta sekit ga-enwe. Ndị ọsụ ụzọ inyeaka, ma ndị nke ga-enye awa iri ise ma ndị nke ga-enye awa iri atọ, ga-anọ ná nzukọ ahụ ruo n’isi.
◼ Malite n’ọnwa Septemba a, isiokwu okwu ihu ọha ọhụrụ ndị nlekọta sekit ga na-ekwu bụ, “Soro Ndị Chineke, Ndị Nwere Obi Ụtọ.”
◼ Anyị chọrọ ichetara unu na ọ bụrụ na onye nkwusa ọ bụla ji akwụkwọ ozi agbara mmadụ àmà, ma ọ bụkwanụ na-eziga ụdị ozi ọ bụla, o kwesịghị ide adres alaka ụlọ ọrụ n’ebe ahụ a na-ede adres onye zitere ozi, ọ sọkwa ya ya bụrụ akwụkwọ ozi e dere iji gbaara onye na-anọghị n’ụlọ àmà ma ọ bụ nke e ji agbara ndị bi ebe siri ike ọgịga àmà. Onye nkwusa ahụ nwere ike dee adres ụlọ ya n’ihi na iji akwụkwọ ozi agba àmà so n’ozi ọ na-ejere Chineke. (Mat. 28:19, 20; Rom 10:14, 15) Ma, ọ bụrụ na ọ dị ya ka ọ gaghị adịcha mma ide adres ụlọ ya n’akwụkwọ ozi ahụ, o nwere ike dee aha ya nakwa adres Ụlọ Nzukọ Alaeze ha.—Gụọ ihe e dere n’Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa May 2002.