Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 3
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 3
Abụ nke 133 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 10 ¶10-21 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ilu 1-6 (Nkeji 10)
Nke 1: Ilu 6:1-19 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Ndị Rom 8:26, 27 Si Emesi Anyị Obi Ike na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya? (Nkeji 5)
Nke 3: Ọ Dịghị Mgbe A Ga-akwụsị Ịdị Ndụ n’Ụwa—td 44B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Unu gụọ Luk 5:12, 13 na Luk 8:43-48. Kwurịtanụ otú akụkọ a kọrọ n’amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi abara anyị uru n’ozi anyị.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Na-akpa Ezigbo Àgwà Mgbe Ị Nọ n’Ozi Ọma. (2 Kọr. 6:3) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Tụleenụ ajụjụ ndị a: (1) Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-akpa ezigbo àgwà mgbe anyị nọ n’ozi ọma? (2) Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-akpa ezigbo àgwà mgbe (a) ìgwè ozi ubi anyị bịarutere ókèala ebe anyị chọrọ ikwusa ozi ọma? (b) anyị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ? (ch) anyị rutere n’ụlọ mmadụ? (d) onye anyị na ya so ziwere mmadụ ozi ọma? (e) onye nwe ụlọ kpụ okwu n’ọnụ? (f) onye nwe ụlọ ji ọrụ n’aka ma ọ bụkwanụ mgbe ihu ígwé na-adịghị mma? (g) onye nwe ụlọ gwara anyị okwu ọjọọ?
Abụ nke 16 na Ekpere