Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọktoba 31, 2011.
1. Gịnị mere anyị ji kwesị ịrapara n’ihe ncheta Jehova? (Ọma 119:60, 61) [w00 12/1 p. 14 para. 3]
2. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’Abụ Ọma 133:1-3? [w06 9/1 p. 16 para. 3]
3. Olee otú o si bụrụ na Jehova ‘nyochara’ Devid ma ‘tụọ mgbe ọ na-eme njem na mgbe ọ na-edina ala atụ̀’? (Ọma 139:1, 3) [w06 9/1 p. 16 para. 6; w93 10/1 p. 11 para. 6]
4. Olee ụdị nsogbu ọ ga-abụ ndị ohu Jehova nwee, ya ‘akwado’ ha ma ọ bụkwanụ ‘kulite’ ha? (Ọma 145:14) [w04 1/15 p. 17 para. 11]
5. Olee ihe nwoke ahụ e kwuru okwu ya n’Ilu 6:12-14 mere, bụ́ nke mere e ji sị na ọ bụ onye na-abaghị n’ihe? [w00 9/15 p. 26 para. 5-6]
6. Gịnị mere onye nwere amamihe ga-eji ‘nabata ihe e nyere n’iwu’? (Ilu 10:8) [w01 7/15 p. 26 para. 1]
7. Olee otú onye maara ihe si dị iche n’onye nzuzu ma a bịa n’otú ha abụọ si eme omume ma a kparịa ha ma ọ bụ gwa ha okwu ọjọọ n’enweghị ihe ha mere? (Ilu 12:16) [w03 3/15 p. 27 para. 3-4]
8. Olee otú inwe olileanya na ihe ga-emecha dị mma ga-esi eme ka anyị “na-eri oriri mgbe niile”? (Ilu 15:15) [w06 7/1 p. 16 para. 6]
9. Olee otú e si ‘enweta ezi uche,’ oleekwa otú o si bụrụ na onye nwetara ya “hụrụ mkpụrụ obi nke ya n’anya”? (Ilu 19:8) [w99 7/1 p. 18 para. 4]
10. Olee otú nghọta ga-esi abara ezinụlọ uru? (Ilu 24:3) [w06 9/15 p. 27 para. 11; be p. 32 para. 1]