Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 7
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 7
Abụ nke 131 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 12 ¶9-13, igbe dị na p. 97 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ilu 27-31 (Nkeji 10)
Nke 1: Ilu 28:19–29:10 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Ichebara Ihe E Kwuru ná Ndị Rom 8:32 Echiche Si Emesi Anyị Obi Ike na Chineke Ga-emezu Nkwa Ya Niile? (Nkeji 5)
Nke 3: Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa n’Oge A Esighị n’Aka Chineke—td 19CH (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Zaa Ajụjụ Ndị Gbasara Mmịnye Ọbara. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’Ụlọ Nche June 15, 2004, peeji nke 29-31. Kwuo ihe ndị ga-enyere ụmụnna aka ịma ihe ha ga-aza n’ajụjụ ndị a: (1) N’Ọrụ 15:28, 29, a gwara Ndị Kraịst ka ha zere ọbara. Gịnị ka ọ pụtara? (2) A bịa n’otú e si agwọ ọrịa ugbu a, olee otú Onye Kraịst ga-esi ezere ọbara? (3) Ndị Kraịst hà kwesịrị ikwe ka e jiri ụmụ irighiri ihe ndị e si n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara nweta gwọọ ha?
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Jehova Agaghị Ahapụ Ndị Ya. (Ọma 94:14) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’Ụlọ Nche July 1, 1997, peeji nke 11, para. nke 12-19. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Abụ nke 110 na Ekpere