Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Ọktoba: Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ nwere mmasị, nye ya traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? Gbalịakwa malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Nọvemba: Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? Ọ bụrụ na unu enweghị broshuọ a, unu nwere ike inye ndị mmadụ broshuọ ndị ahụ e kwuru ka e nye n’ọnwa Ọgọst. Ọ bụrụkwa na unu nwere ya, unu nwere ike nyekọta ya na ndị nke ahụ. Disemba: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere ụmụaka, nye ha akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ma ọ bụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible. Jenụwarị: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ha achọghị ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl, e nwere ike nye ha magazin ọ bụla merela ochie ma ọ bụkwanụ broshuọ ọ bụla ga-amasị ha. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu enweghị magazin merela ochie ma ọ bụ broshuọ ga-amasị ha, e nwere ike nye ndị mmadụ akwụkwọ ọ bụla merela ochie ọgbakọ unu nwejuru enweju.