Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 14
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 14
Abụ nke 49 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 12 ¶14-20 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ekliziastis 1-6 (Nkeji 10)
Nke 1: Ekliziastis 6:1-12 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche Ọ̀ Bụ Ihe Na-egosi na Mmadụ Nwere Ihu Ọma Chineke?—td 19D (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Ji Eme Ihe E Kwuru ná Ndị Rom 12:19 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Obi Ọ̀ Dị Gị Ụtọ na I Nwere “Ihe Ùgwù nke Iji Obiọma Na-enye Ihe”? Okwu okenye ga-ekwu, nke si n’Ụlọ Nche Nọvemba 15, 2011, peeji nke 22-23.
Nkeji 10: “Ị Chọọ Ka Mkpụrụ Ị Kụrụ Too, Na-agba Ya Mmiri.” Ajụjụ na azịza. Unu tụlechaa paragraf nke 3, mee ihe ngosi ebe onye nkwusa na-akwadebe ịga nletaghachi. Ọ ga na-ekwupụta ihe ọ na-atụgharị n’uche ya. Onye nkwusa ahụ ga-eleba anya n’ihe ndị o dere gbasara onye ahụ ọ chọrọ ịga nletaghachi na nke ya. Ya ekwuo otú ọ ga-esi zaa ajụjụ yanwa jụrụ onye nwe ụlọ n’ụbọchị mbụ ahụ ọ gara na nke ya nakwa otú ọ ga-esi jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ya mechaa ihe ngosi ahụ, jiri nkeji ole na ole kwuo ihe e kwuru n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 85, paragraf nke 3 gbasara ihe bụ́ nletaghachi.
Nkeji 10: “Ka E Doo Aha Chineke Nsọ.” Ajụjụ na azịza. Kwuo mgbe ọgbakọ unu ga-aga mgbakọ sekit ma ọ bụrụ na a gwala ya unu.
Abụ nke 98 na Ekpere