Zie Ndị Mmadụ Ozi Ọma Otú Ọ Ga-eru Ha n’Obi
1. Gịnị ka anyị mụtara n’otú Ndị Kraịst si kwusaa ozi ọma n’oge ochie?
1 Ndị Kraịst oge ochie ziri ndị mmadụ ozi ọma n’agbanyeghị obodo ha si ma ọ bụ okpukpe ha na-ekpe. (Kọl. 1:23) N’agbanyeghị na ọ bụ Alaeze Chineke ka ha niile kwusara, ọ na-abụ ha hụ mmadụ ha amara otú ha ga-esi zie ya ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe Pita na-agwa ndị Juu okwu, o ji ihe Joel onye amụma kwuru malite n’ihi na ọ ma na ndị Juu anaghị eji ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru egwu egwu. (Ọrụ 2:14-17) Nke a dị iche n’otú Pọl si gwa ndị Grik okwu n’Ọrụ Ndịozi 17:22-31. Ọtụtụ ndị taa anaghị eji ihe Baịbụl kwuru egwu egwu. N’ihi ya, mgbe anyị na-ezi ha ozi ọma, anyị kwesịrị igosi ha ihe Baịbụl kwuru. Ma, anyị kwesịrị ijikwu akọ na-ekwu okwu ma ọ bụrụ na ndị anyị na-agwa okwu bụ ndị na-ekwetaghị na Baịbụl bụ Okwu Chineke, ndị na-anaghị aga chọọchị ma ọ bụkwanụ ndị na-ekpe okpukpe ọzọ.
2. Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ anyị nyere ndị mmadụ aka?
2 Jiri Akwụkwọ Anyị Nyere Ndị Mmadụ Aka: N’afọ ije ozi a, ọ ga-abụ ọnwa abụọ ọ bụla gaa, anyị agbanwee akwụkwọ anyị na-enye ndị mmadụ n’ozi ọma. Ọ bụ Ụlọ Nche na Teta!, traktị, na broshọ ka anyị ga-eji jee ozi. Ọ bụrụgodị na ndị nọ n’ókèala anyị enweghị mmasị na Baịbụl, anyị ka nwere ike isi n’akwụkwọ ndị a họrọ isiokwu anyị ma na ọ ga-amasị ha ma jiri ya zie ha ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị gara izi onye na-enweghị mmasị na Baịbụl ozi ọma, ya abụrụ na anyị agụghị Baịbụl, anyị ka nwere ike ịgaghachi na nke ya ma ọ bụrụ na o nwere mmasị n’ozi anyị. Ihe mere anyị ga-eji gaghachi bụ inyere ya aka ịmara Onye kere ihe niile na ịkụziri ya Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ndị anyị na-ezi ozi ọma nwere mmasị ịnụ ihe dị na Baịbụl, anyị nwere ike iji Baịbụl malite okwu anyị, nyekwa ha akwụkwọ anyị kwuru gbasara Chineke. Anyị nwere ike inye ndị mmadụ akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ọ bụ broshọ bụ́, Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi, ọ bụrụgodị na ọ bụghị ha ka anyị na-enye ndị mmadụ n’ọnwa ahụ. Mkpa anyị kwesịrị ịbụ izi ndị mmadụ ozi ọma otú ọ ga-eru ha n’obi.
3. Olee otú anyị ga-esi mee ka Okwu Chineke ruo n’obi ndị nọ n’ókèala anyị?
3 Kwadebe Ala nke Ọma: Obi mmadụ dị ka ala. (Luk 8:15) E nwere otú ala ga-adị, onye ọrụ ugbo chọọ ịkụ mkpụrụ na ya, ya eburu ụzọ rụọ ya ọrụ hiri nne. Ọ bụ otú ahụ ka anyị kwesịrị ime ndị anyị na-akụziri Baịbụl. Anyị kwesịrị ibu ụzọ kụziere ha Okwu Chineke nke ọma tupu ha enwee ike ịghọta ya ma mee ya emee. Ndị kwusara ozi ọma n’oge ochie ziri ụdị mmadụ dị iche iche ozi ọma. Nke a mere ka ọtụtụ ndị bata n’ọgbakọ, ndị ziri ha ozi ọma aṅụrịakwa ọṅụ. (Ọrụ 13:48, 52) Ndị anyị ziri ozi ọma nwekwara ike ịbata n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na anyị ezie ha ozi ọma otú ọ ga-eru ha n’obi.