Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 7
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 7, 2013
Abụ nke 104 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 3 ¶13-19 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 1-6 (Nkeji 10)
Nke 1: Matiu 5:21-32 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ụbọchị Izu Ike Adịrịghị Ndị Kraịst—td 42A (Nkeji 5)
Nke 3: Otú Ị Ga-esi Gosi na Jehova Bụ “Òkè Gị”—Ọnụ Ọgụ. 18:20 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Jenụwarị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụ otu nkeji kwuo ihe mere magazin ndị ahụ ga-eji amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 4-8 n’Ụlọ Nche Jenụwarị 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọ ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Jụọkwa ha ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 8-11 na Teta! Jenụwarị– Febụwarị nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọkwa ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ha otu ihe ahụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Ụlọ Nzukọ Alaeze Dị Ọcha Na-ewetara Aha Jehova Otuto. Okwu okenye ga-ekwu. Jehova dị nsọ. N’ihi ya, ndị na-efe ya kwesịrị ịdị ọcha. (Ọpụ. 30:17-21; 40:30-32) Anyị ga na-ewetara aha Jehova otuto ma ọ bụrụ na anyị ana-edewe ebe anyị na-anọ efe ya ọcha ma na-arụzi ihe ndị mebiri na ya. (1 Pita 2:12) Kọọ otú Ụlọ Nzukọ Alaeze si mee ka e too aha Jehova. I nwere ike ịkọ nke mere n’obodo unu ma ọ bụkwanụ nke ị gụtara n’akwụkwọ anyị. Gbazie onye na-ahụ maka ịrụzi ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ajụjụ ọnụ ka o kwuo otú ọgbakọ ga-esi na-edowe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma na-arụzi ihe ndị mebiri na ya. Gwa mmadụ niile ka ha gbaa mbọ soro na-edowe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma na-arụzi ihe ndị mebiri na ya.
Abụ nke 127 na Ekpere