Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 4
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 4
Abụ nke 70 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 5 ¶1-6, igbe dị na peeji nke 55 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 22-25 (Nkeji 10)
Nke 1: Matiu 23:25-39 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: “Ịzọpụta Mmadụ Niile” Esighị n’Akwụkwọ Nsọ—td 33CH (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl nke Gosiri na Anyị Kwesịrị Ime Ihe E Kwuru n’Ilu 3:5? (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Febụwarị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụ otu nkeji kwuo ihe mere magazin ndị ahụ ga-eji amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-6 n’Ụlọ Nche Febụwarị 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọ ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Jụọkwa ha ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 8-11 na Teta! Jenụwarị–Febụwarị nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọkwa ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ha otu ihe ahụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Nkeji 10: Ọ bụrụ na Mmadụ Asị, ‘Enweghị M Mmasị ná Ndịàmà Jehova.’ Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’akwụkwọ bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible peeji nke 9 na 10. Mee otu ihe ngosi na-agaghị egbu oge.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Abụ nke 95 na Ekpere