Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 1
IZU NA-AMALITE N’EPREL 1
Abụ nke 38 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 7 ¶7-13 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Luk 7-9 (Nkeji 10)
Nke 1: Luk 7:18-35 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Mba Ọhụrụ Jehova Họọrọ na Pentikọst? Oleekwa Ihe Mere O Ji Họrọ Ya?—Gal. 6:16; 1 Pita 2:9 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Anyị Ji Akpọ Jehova Nna Anyị—Mat. 6:9 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Eprel. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụ otu nkeji kwuo ihe mere magazin ndị ahụ ga-eji amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-7 n’Ụlọ Nche Eprel 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọ ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Jụọkwa ha ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 6-9 na Teta! Mach–Eprel nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọkwa ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ, jụọkwa ha ajụjụ ndị ahụ ị jụrụ ha mbụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Ị̀ Meela Ya? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Onye ga-eme ya ga-eji nkeji ole na ole kwuo isi ihe ndị dị n’isiokwu ndị a e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị na nso nso a. Ha bụ: “Jiri Obi Ike Na-agbara Ndị Mmadụ Àmà n’Ebe Ha Na-anọ Akpa Afọ Ha” (km 3/12), “Nyere Ndị Mmadụ Aka Ka Ha Gee Chineke Ntị” (km 7/12), na “Ì Nwere Ike Ịna-aga Ozi Ọma ná Mgbede?” (km 10/12). Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha sirila mee ihe ndị e kwuru n’isiokwu ndị ahụ.
Abụ nke 75 na Ekpere