Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 27
IZU NA-AMALITE NA MEE 27
Abụ nke 6 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 10 ¶1-7 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọn 12-16 (Nkeji 10)
Nke 1: Jọn 12:20-36 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Otú Chineke Si Gosi na Ya Nwere Obi Ebere—td 1CH (Nkeji 5)
Nke 3: Ná Ndị Rom 15:33, E Kwuru na Jehova Bụ “Chineke Onye Na-enye Udo.” Gịnị Mere Ihe A A Kpọrọ Ya Ji Kwesị Ekwesị? (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa. Okwu. I kwuchaa, gị agwa otu onye nkwusa ka o jiri peeji nke iri na isii n’Ụlọ Nche Jun 1 gosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Jun. Gbaa mmadụ niile ume ka ha bịa ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Nkeji 15: Otú Anyị Nwere Ike Isi Gbaa Mkpụrụ Anyị Kụrụ Mmiri. (1 Kọr. 3:6-9) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: (1) Gịnị mere i ji aga nletaghachi? (2) Gịnị mere ịga nletaghachi ji ara ụfọdụ ndị ahụ́? (3) Olee ihe ga-eme ka ọ malite ịdịrị ha mfe? (4) Olee ihe ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na ịga nletaghachi na-ara anyị ahụ́? (5) Ị hụ onye nwere mmasị, gịnị ka ị na-eme ka ị ghara ichefu ịga nletaghachị na nke ya? Gịnịkwa ka ị na-eme ka ị ghara ichefu ihe gị na ya kwurịtara, akwụkwọ i nyere ya, na ihe ndị ọzọ dị mkpa? (6) Olee otú i si akwadebe nletaghachi tupu ị gawa? (7) Gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-aga nletaghachi kwa izu?
Nkeji 10: “Jiri Vidio Anyị Na-akụziri Ndị Mmadụ Baịbụl.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ndị na-ege ntị otú vidio anyị ha lere mgbe ha na-aghọbeghị Ndịàmà Jehova si nyere ha aka.
Abụ nke 101 na Ekpere