Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 7
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 7
Abụ nke 92 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 15 ¶1-6, igbe dị na peeji nke 184 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Efesọs 1-6 (Nkeji 10)
Nke 1: Ndị Efesọs 4:1-16 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Ibu Ụzọ Na-achọ Ezi Omume Chineke Pụtara—Mat. 6:33 (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Bụ Chọọchị Ndị Kraịst?—td 8A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Ọktoba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụ otu nkeji kwuo ihe mere magazin ndị ahụ ga-eji amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-7 n’Ụlọ Nche Ọktoba 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọ ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Jụọkwa ha ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu dị na peeji nke 14 na Teta! Septemba–Ọktoba nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọkwa ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ, jụọkwa ha ajụjụ ndị ahụ ị jụrụ ha mbụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Ndị Na-arụsi Ọrụ Ike. (1 Tesa. 5:12, 13) Gbaa okenye abụọ ajụjụ ọnụ. Gịnị ka ha na-arụ n’ọgbakọ? È nwere ọrụ ọzọ ha na-arụ ná nzukọ Jehova? Olee otú ha si enwe ike arụ ọrụ ndị a n’agbanyeghị na ha na-akpa afọ ezinụlọ ha? Olee otú ha si hazie ihe ndị a ka ha nwee ike ịna-agachi ozi ọma anya? Olee otú ndị ezinụlọ ha si akwado ha?
Abụ nke 123 na Ekpere