Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 14
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 14
Abụ nke 32 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 15 ¶7-12 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ndị Filipaị 1-4–Ndị Kọlọsi 1-4 (Nkeji 10)
Nke 1: Ndị Filipaị 3:17–4:9 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ọ̀ Bụ Pita bụ “Oké Nkume” Ahụ?—td 8B (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Ekpere Ga-esi Enyere Anyị Aka Mgbe A Na-anwa Anyị Ọnwụnwa?—Luk 11:9-13; Jems 1:5 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Otú Anyị Si Dị n’Otu Na-eme Ka E Nye Jehova Otutu. Okwu. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 165, paragraf nke 3, ruo na peeji nke 168, paragraf nke 1. Gwa ụfọdụ ụmụnna ka ha kọọ ihe mere eme ha gụtara n’akwụkwọ anyị. Ihe ha ga-akọ ga-abụ otú ịdị n’otu na ịhụnanya anyị nwere si mee ka e zie mmadụ ozi ọma.
Nkeji 15: “Okwu Chineke Bara Uru Iji Zie Ihe.” Ajụjụ na azịza. Gwa ọgbakọ mgbe unu ga-aga mgbakọ sekit ma ọ bụrụ na a gwala unu.
Abụ nke 53 na Ekpere